BBC Igbo agbaala afọ abụo... Ụnụ aṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa

Onye nwere opi, ya gbuo, onye nwere mkpọnala, ya gbaa, BBC Igbo agbaala afọ abụọ.
Taa bụ abalị iri na itoolu nke ọnwa Febrụwarị ka o mere afọ abụọ anyị malitere mgbasa ozi. N'ime afọ abụọ a, BBC Igbo egosila na anyị bụ ekwuchaa ọgwụ n'ezie.
Ọ bụ akụkọ ndọrọndọrọ ọchịchị, ka ọ bụ akụkọ ọdịnala Igbo, ka ọ bụ egwuregwu, ka ọ bụ akụkọ ịkpa obi ọma, BBC Igbo zuru ka e mee.

Lee ọtụtụ akụkọ dara ụda anyị tipụtara n'ime otu afọ gara aga.
Ndọrọndọrọ ọchịchị

BBC Igbo kwụ chịm oge e mere ntuliaka iji họpụta ndị gọvanọ ọhụrụ nke afọ 2019.
Anyị haziri nrụrịtaụka (debate) na steeti Abia, Ebonyi na Imo, nke bụ nke mbụ a na-eme n'asụsụ Igbo na Naịjiria niile. Ngwa kụpụrụ anyị aka ozugbo.
Anyị gakwara n'elu, n'ala na ụwa niile ịhụ na anyị wetere ntuliaka ka o si gaa na steeti niile dị n'ala Igbo.
Anyị nọ mgbe a gụpụtara mpụtara ntuliaka n'Imo steeti, n'Abịa steeti, Enugwu steeti nakwa n'Ebọnyị.
Oge ụlọikpe kachasị kụchapụrụ gọvanọ Emeka Ihedioha nke Imo steeti ma tinye Hope Uzodinma, BBC wetara ya n'uju.
Anyị gakwara kpọtụrụ Emeka Ihedioha ka ọ gwa anyị ka obi dị ya n'ihi ikpe ahụ.
Ihe gbasara Biafra
Anyị gakwuru Nnamdi Kanu na Lọndọn mgbe ọ pụtara na nzuzo, ebe o kwuru ihe ndị gụnyere etu Nnamdi Azikiwe si tinye ndị Igbo na nsogbu.
Marakwa na anyị gbara ọkụ na steeti niile dị n'ọwụwa-anyanwụ ụbọchị e mere emume ncheta mbido agha Biafra nke a na-emekarị n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee.
Na Jenụwarị nke afọ 2020, BBC Igbo so mee ncheta afọ 50 nke ụbọchị agha Biafra biri.
Anyị si n'ọnụ ụmụnwaanyị hụrụ agha, ụmụaka hụrụ agha nakwa ndị ọzọ lụrụ agha nụ akụkọ etu agha Biafra a si gaa.
Ndị Igbo na-agba mbọ!
A chọwa ndị na-akwalite ndị Igbo na-agba mbọ, ndị mbụ a ga-akpọ bụ BBC Igbo.
Anyị wetaara gị akụkọ onye isi na-arụ Njinia, onyeisi na-eme achịcha bekee, na nwaanyị na-arụ mesịn.
Ndị ọzọ gụnyere ụmụnwaanyị na-akpụ ụzụ, ọkaiwu na-eme ọkpa, ọkaiwu na-akwa akwa, nwata nwaanyị na-eko bọọlụ o ji azụ onwe ya n'akwụkwọ, dịrị gawazie.
Ọtụtụ n'ime ndị a enwetala enyemaka n'ụzọ dị icheiche n'ihi akụkọ BBC Igbo mere maka ha.
Anyị gakwara ụlọọrụ ụgbọala Innoson, nakwa ụlọọrụ 'Erisco Foods'.
Akụkọ egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
I chetara mgbe C. Ronaldo dọriri ndị Atletico Madrid n'asọmpi 'Champions League', ka ọ bụ mgbe a gwọrọ Chelsea ka abacha.
Kedụ maka mgbe a bọkasịrị Manchester United ka ọkụkọ 'Easter', ka ọ bụ mgbe a ṅụrụ Arsenal ka 'akpụrụ achịa'.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
BBC Igbo aghọọla ọkaibe n'akụkọ egwuregwu na Naịjirịa.
Oge ọbụla e nwere egwuregwu gbara ọkpụrụkpụ, ndị mmadụ na-eche ka BBC Igbo tipụta isi akụkọ ya bụ egwuregwu.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
BBC Igbo kwụ chịm ị na-ewetara gị akụkọ egwuregwu n'ụzọ pụrụ iche na-atọkwa ọchị.
Akụkọ ọdịnala

Akụkọ asụsụ na ọdịnala Igbo anaghị akọ akọ na BBC Igbo.
N'ime otu afọ gara aga, anyị kọwara etu e si nweta aha ahịa anọ ndị Igbo na-azụ, usoro edemede mgbe ochie bụ nsibidi, nakwa egwu dị icheiche e ji mara ndị Igbo.
Kedụ maka akụkọ gbasara etu e si aghọta ihe ọja na-ekwu, ka ọ bụ akụkọ gbasara isi dada, ebee a ka anyị ga-ebido?
BBC Igbo nọ ya mgbe Obi Ọnịcha nakwa Igwe Nnewi gbara ọfala, anyị gara Ikeji ndị Arọndịzuogụ, Imo Ọka ndị Ọka, ịta ụkazị ndị Emii, nakwa ịwa akwa ndị Ihitte Uboma.
Ndị a ma ama bịara be anyị

Ọtụtụ ndị a ma ama bịara kpọtụrụ anyị n'ụlọọrụ anyị.
Ma Uche Jumbo, Victoria Anunobi, Okey Ogunjiofor, Teco Benson, Isaac na Nneka Moses, Chizzy Alichi, Onny Michael, nakwa Anita Joseph.

Ndị ọzọ Victor Osuagwu, Frodd nke Big Brother, Ugoezu j. Ugoezu, Uche Ogbodo, Daniel K Daniel, Destiny Etiko, Chidi Diribe (Titus), na Ruff Coin Nwa Aba.
Mkparịtaụka ndị a dị n'ọgbakọ anyị na Facebook.
Maka Ahụike:
Anyị mere nnyocha, nchọpụta ma kọwaakwa ọtụtụ ihe gbasara ahụike n'ụzọ dị iche iche.
Anyị kọwara ihe nwaanyị kwesịrị ịma maka ọtụ ya, ihe nwoke kwesịrị ịma maka amụ ya, ihe nwereike igbu nwoke n'elu nwaanyị, Ihe na-enye ụmụnwoke afọ beer nakwa ndị ọzọ.
Anyị akọwakwuola etu ị ga-esi chebiri ma gbochie ịba Lassa nakwa ọrịa Coronavirus Covid-19 nakwa nri onye nwere ọrịa HIV kwesịrị ị na-eri.
Dịka afọ ọhụrụ a na-amalitere anyị, nkwa anyị na-ekwe gị bụ na nke dị n'ihu ga-aka nke ị hụrụ anya ugbua.
Gwazịkwa ndị enyi gị maka anyị.

Akụkọ ndị ọzọ ga amazị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:














