Ọgba mbọ: Ukamaka Okoye bụ nwaanyị na-arụpụta ụzụ igwe
Ụkamaka Okoye kọwara etu o si mụta aka ọrụ ya makwa etu o si wee rụpụta ụzụ igwe nke ọgbatumtum ji arụ ọrụ, wee bido na-arụpụta ya.
Ọdọ ahịa uya dị na Nnewi, ebe ya na di ya na-arụpụta igwe ndị a ha ji ere na mba ndị ọzọ dịka Gana, Kameroon na Benin.
Ọ gwara BBC na o na-eji igwe si na generatọ na ọgbatumtum mebiri emebi arụ ya.
Ukamaka Okoye kọwarala BBC Igbo ihe mere o ji azụkarị ụmụ nwaanyị n'ọrụ ya, ma gosi usoro o ji arụpụta aka ọrụ ya.
N'ihe onyoonyo a, Ukamaka kwukwara ka ndị nne dịka ya nwereike iji lekọta ezinụlọ ya ma nweekwa aka ọrụ nke aka ya tumadị maka nkwado di ya na-enye ya.
Adline Okere na Vining Ogu mere akụkọ a.
Akụkọ kachasị:


