Blind Mechanic: Ekpuru m isi mana onweghị onye ka m arụ ọrụ inginia

Aha onyonyo, Blind Mechanic: Lee nwoke kpuru isi na-arụ 'Mechanic'

Ihe dị egwu bụ ihe BBC Igbo chọpụtara n'ebe inginia Emeka Abugu kpuru isi nọọ.

Ọ gaara anyị na ọrịa akpata a na-agwọchaghị ọfụma mgbe ọ dị afọ ise bụ ihe mere o ji kpuo isi.

Mana agbanyeghị nke a nwoke a alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ asaa.

Kirie ka o si arụziri ndị mmadụ ụgbọala, ọgba tụmtum, igwe na-enye ọkụ latrik nakwa taya mebiri emebi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo mere akụkọ a.