Blind Mechanic: Ekpuru m isi mana onweghị onye ka m arụ ọrụ inginia
Ihe dị egwu bụ ihe BBC Igbo chọpụtara n'ebe inginia Emeka Abugu kpuru isi nọọ.
Ọ gaara anyị na ọrịa akpata a na-agwọchaghị ọfụma mgbe ọ dị afọ ise bụ ihe mere o ji kpuo isi.
Mana agbanyeghị nke a nwoke a alụọla nwaanyị ma mụta ụmụ asaa.
Kirie ka o si arụziri ndị mmadụ ụgbọala, ọgba tụmtum, igwe na-enye ọkụ latrik nakwa taya mebiri emebi.