Covid-19 in Nigeria: Lee ihe ndị mere ụmụ Naịjirịa ekwenyeghị na ọ dị na mba a

Ebe foto si, EPA
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ruo ugbua ọtụtụ ụmụ Najiria ekwetebeghị na ọrịa covid 19 di ire.
Ọtụtụ n'ime ha ekwuputela ihe mere ha ji atụgharị uche ma ọrịa a abụ eziokwu ka ọ bụghị.
Mana dibia Bekee bụ Chinelo Eluba azakọrọla ekweghi ekwe ndị a.
1.Nke mbụ bụ na ha anaghị ahụ ime ebe a na-edopu maọbụ agwọ ndị bu ọrịa a anya
I chetara ihe nkiri gosiri ebe ndị ahụike na-arụ ọrụ na "isolation center" na-agba egwu?
Nke a socha mee ka ndị mmadụ chee na akụkọ covid-19 bụ akụkọ ifo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Dọkịta Eluba kwuru na gọọmenti enweghị ikike igosi ndị nọ na "isolation center" makana ndị ahụ ga-agbarụ ihu ebe ndị mmadụ nwereike ịsọ ha asọ ma ha gbakee.
Maka egwu a na-agba ebe ahụ, o kwuru na e nwere ogo atọ n'ụlọ ndopu nke gụnyere ndị covid-19 na-ejisighị ike, ndị ọrịa a jituru, nakwa ndị e ji akụrụngwa na-enye ikuku azọ ndụ.
O kwuru na ọ dịghị njọ ma ndị ọ na-ejisighị ike na-egwu egwu maọbụ jiri ekwentị ha na kọmpụta ha na-arụ ọrụ ebe ahụ.


2. 'Ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a erubeghị ogo nke gọọmenti na-akpọpụta'
UC Uzo bụ otu onye na-eso BBC Igbo kwuru na ọ dị mana o hibeghị nne etu e si egosipụta ya.
Dọkịta Eluba kwuru na ọ ga-adị mma ka gọọmentị pụta kuziere ndị mmadụ etu ha si enweta ọnụọgụgụ ha na-akpọpụta kwa ụbọchị.
3.Ụfọdụ kwuru na 'enweghị ihe dị iche n'ọrịa a na ịba'
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Okwu a na-eche kpalitere nkwenye a bụ mgbe onyeisi ụlọọrụ mgbasa ozi a ma ama bụ Raymond Dokpesi, rịachara covid-19 ma pụta kwuo na ọgwụ e ji gwọọ ya na ezinụlọ ya butekwara ọrịa ahụ, enweghị ihe dị iche na ya na ọgwụ ịba.
Mana dọkịta Eluba kwuru na ọ na-abụ e bute onye a chọpụtara ọrịa covid-19 n'ahụ, e mee ya ezigbo nnyocha ma gwọọ ọrịa ọbụla a chọpụtakọrọ ya na covid-19 n'ahụ ha.
Ọrịa ọzọ a nwereike ịbụ ịba.
O kwuru na ọ bụ ọgwụ ndị a ka ndị mmadụ ji emegherị onwe ha anya.
4.Ha kwuru na ha 'ahụbeghị onye o gburu'
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Dọkịta Eluba kwuru na ya bụ ọrịa na-egbukwa egbu ma ọ bụrụ na ndị o ji agaghị ka e nnyochaa ma gwọọ ha n'ụlọ ndopu.
N'okwu ya, ọtụtụ mmadụ na-ekweghị aga ụlọ ndopu na-agwọ onwe ha n'ụlọ ha, nke na-ebute ọnwụ ha, ma sị onye ọbụla kpachapụ anya.
5.Ọ bụ ụzọ gọọmenti si eri ego n'efu
Ụkọchukwu Salvation Ministries bụ David Ibiyeomie, kwuru n'ihe nkiri na-efegharị na soshal midia n'ọnwa Mee, na covid-19 anọghị na Naịjirịa kama na ọ bụ ụzọ gọọmentị na ụfọdụ ụlọọrụ si eri ego n'efu.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Dọkịta Eluba kwuru na ọ bụ gọọmentị ka ọ dị n'aka, ikuziri ụmụ Naịjirịa ihe niile ha na-eme iji buso ya bụ ọrịa nakwa etu ha si eme ya agha, ka ndị mmadụ ghara ị na-efesa akụkọ ụgha ga-etinye ndị ọzọ na nsogbu.












