Coronavirus in Nigeria: Ihe gọoment kwuru maka ọrịa Coronavirus

Ebe foto si, Lagos state ministry of health
Osagie Ehanire bụ minista na-ahụ maka ahụike na Naịjiria agwala ọha okwu, ebe ọ na-asị ndị mmadụ dere jụụ n'ihe gbasara mbata ọrịa coronavirus na Naịjirịa.
Ọ gara n'ihu sị na ha ekeela nkwụcha n'ihe gbasara ibuso ọrịa a agha, mana gwa ndị mmadụ ka ha na-edebe onwe ha na gburugburu ha ọcha.
Ministri ọrụ ahụike dị n'aka na Naịjirịa ekwuola na ọrịa coronavirus akpọrọ COVID-19 abatala na Naịjirịa.
Nke a bụ nke mbụ a hụru ya bụ ọrịa na Naịjirịa kemgbe ọ pụtara na mba Chaịna n'ọnwa Jenụwarị 2020.
N'okwu ya, onye bu ya bụ ọrịa bụ nwaamadi onye Itali bịara Naịjirịa ụbọchị Monde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị.
A chọpụtara ya n'ụlọọgwụ mahadum nkuzi nke dị na Yaba, Legọs.
A maara na ya bụ nwoke na arụ ọrụ n'ụlọọrụ Agip.
Ha kọwatara na ndị ụlọọrụ ahụike pụrụiche a kwadoro maka ya bụ ọrịa a kpọrọ Multi-sectorial Coronavirus Preparedness Group, abanyelarị ọrụ ozugbo maka igbochi ya bụ ọrịa.
N'ọba nzikọrịta ozi Twitter ha, ụlọọrụ Nigeria Centre for Desease Control (NCDC) kwuru na ya bụ onye ọrịa nọ n'ụlọọgwụ na Yaba, Legọs ebe a na-enebara ya anya.
Ha gwara ọha na eze sị na obi amapụla ha maka na uche ha dị ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Cheta na ndị ọrụ na-enyocha nje na Naịjriịa akpọrọ Nigeria Centre for Desease Control (NCDC) ekwubuola na o nweghi ọrịa Coronavirus a kpọrọ COVID-19 batara Naịjirịa.
Kemgbe Wenezde ka kepukepu batara na ya bụ ọrịa esorola onye Chaịna bịara Naịjirịa were bata.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ya bụ onye Chaịna nwere ahụọkụ gara ụlọogwụ Reddington dị na Ikeja mgbe ebidoro nyowe ya enyo.
Ndị ụlọọgwụ ahụ sị na ya bụ onye Chaịna batara Naịjirịa izuụka asaa gara aga enwebeghị onye o zutere si mba ha bịa kemgbe ahụ.
Ha kwuru na o nweghị ọrịa ahụ a hụrụ n'ahụ ya.
Ihe NCDC kwuru
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
N'otu aka ahụ, mịnịstrị na-ahụ maka ahụike na Legọs depụtakwara uche ha gbasara ma ọrịa ahụ ọ batara ma ọ bụ ọ bataghị
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4

Gịnị bụ coronavirus?
Ọrịa coronavirus na-efe efe site na mmadụ fere na mmadụ.
A chọpụtara nke a ka ndị ahụike na-elekọta ndị bu ya butekwara ya.
Coronavirus bụ ezinaụlọ nnukwu nje na-ebute ọrịa gụnyere oyi nkịti nakwa ọrịa ndị ọzọ na-akpa arụ.
Ọrịa ndị ọzọ si n'ezinaụlọ coronavirus a bụ Sars (si na buusu malite) nakwa Mers (si na Kamel), mana amabeghi ebe nke ọhụrụ a si malite.

O nwere ọgwụgwọ?
Ndị na-ahụ maka ahụike na-ekwu ka ndị mmadụ mee ihe ndị a iji gbochie ya bụ ọrịa ruo mgbe a chọtara ọgwụgwọ ya.
- Kpuchie imi na ọnụ mgbe ị na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere.
- Gbado anya, mara etu gị na onye na-akwa ụkwara maọbụ na-ama uzere si emekọrịta
- Jiri mmiri na ncha na-akwọ aka gị kwa mgbe kwa mgbe.
- Gbaa mbọ hụ na e siri akwa na anụ ị na-eri ọfụma tupu i rie ya.

Lee ebe ana-eme nyocha Coronavirus na Naịjirịa

Ka ọ dị ugbua, Naịjirịa esonyela n'ihe ruru mba 50 bu ọrịa a ugbua.
Na mbaụwa, ihe karịrị mmadụ puku iri asatọ bu ọrịa a n'akụkụ ụwa dị iche iche, ebe ihe ruru mmadụ puku abụọ na narị asatọ anwụọla.
Ka ọ dị ugbua, ihe ruru mmadụ puku iri atọ na isii bubu ọrịa a agbakeela.
Gere olu nwata Naịjiria na-aga akwụkwọ na mba Chaịna ịnụ maka ihe ha na-agabiga n'ihi ọrịa coronavirus:
Akụkọ ga-amasị gị:












