Coronavirus and Lassa Fever: Ihe ị ga-eme ma etinye gị na 'quarantine' n'ihi ọrịa ndị a

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe ọrịa coronavirus tịpụtara isi, o dosala ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnọdụ nyocha ebe ha na ndị ọzọ anaghị enwe mmekọ.
Ụfọdụ n'ime ndị a bụ ndị buterela ọrịa a ebe ndị ọzọ ka na-enyocha ma ọrịa a onwereike igosipụta n'ahụ ha.
Ọ na-adịkarị ndị nọ n'ọnọdụa ka ụwa ọgwụla dịka nwata akwụkwọ Naịjirịa bi na Wuhan Chaịna ebe coronavirus malitere si kọọrọ BBC Igbo.
Nwa akwụkwọ a bụ onye hụtara onwe ya n'ọnọdụ a kpọrọ 'House quarrantine' sị na ọ na-emetuta ya n'ụbụrụisi.
Kedụ ihe bụ ụzọ mgbapụta n'ọnọdụ a?
Otu onye dọkịta bụ Mcginger Ibeneme gwara BBC Igbo ụfọdụ ihe ndị hụrụ onwe ha n'ọnọdụ a ga-eme.
Ihe ha ga-eme gụnyere:
Dọkịta Ibeneme sị na onye dị etu a kwesịrị i na-emega ahụ kwa ụbọchị o tetere n'ụra ka ahụ ya na-esi ike.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye ahụ ga-agba mbọ na-ezu ike nkeọma.
Onye ahụ ga na-eme ihe dịka ikiri TV, ịgụ akwụkwọ, ị pịị ekwentị ya bụ ihe ndị ga-akpọpụ uche ya n'ọrịa a.
Nke kachasị nke bụ na onye ahụ ga-enwe echichie ọma mara na ọnọdụ ọ nọ n'ime ya bụ nwa mgbe nta ka ọ ga-ebi.
Onye a gaa na-ege ntị n'akụkọ ka ọ mara etu ihe si a aga, ọ ga na-ekpe ekpere nakwa ime onwe ya obiụtọ.
Dọkịta Ibenema gara n'ihu kwuo ka onye dị etu a ghara ịhụta onwe ya dịka onye agbahapụrụ.
Kama ka ọ mara na ọ bụ maka ọ dị mma nke ya nakwa nke mba niile butere e ji tinye ya n'ọnọdụ ahụ.










