Ụlọikpe enyela Abubakar Malami ntọhapụ beelu

Ọkaikpe Emeka Nwite nke Ụlọikpe Ukwu Etiti dị n'Abuja enyela Abubakar Malami bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ikpe ntọhapụ beelu ma gwa ya kwụọ nde narị ise ₦500m ma weta ndị akaebe abụọ.
Ọkaikpe Nwite kwuru na ndị akaebe abụọ ahụ ga-enwe ụlọ na mpaghara Asokoro, Maitama nakwa Gwarimpa ma kwuo na ha ga-enyefe ụlọikpe ahụ akwụkwọ njem paspọt ha ma weta foto paspọt abụọ ha sere ọhụrụ.
Ụlọikpe ahụ kwuru na ha ga-eme nnyocha zuruoke maka ndị akaebe abụọ ahụ iji hụ na ọ bụ nwee ụlọ ndị ahụ.
N'aka nke ọzọ, ụlọikpe gwara Malami ka o nye ụlọikpe ahụ akwụkwọ njem paspọt ya ma gwa ka ọ ghara ime njem mba ofesi ma ọ bụrụ na ụlọikpe ahụ enyeghị ikike ime njem dị etu a.
Ka ọ dị ugbua, Ọkaikpe Nwite nyere iwu ka a kpọchie Malami n'ụlọmkpọrọ Kuje ruo oge o mezuru iwu niile dị na ntọhapụ beelu e nyere ya.
Ụlọikpe gara n'ihu yigharịa ikpe ya n'ụbọchị Tuzde 17 Jenụwarị, 2026 bụ ụbọchị a ga-amalite ikpe ya ikpe maka ebubo mpụ na nrụrụaka e boro ya.
Ụlọikpe ahụ nyekwara nwa nwoke Abubakar Malami bụ Abdulaziz Malami na otu onye ọrụ Rahamaniyya Prperties Limited bụ Hajia Asabe Bashir ntọhapụ beelu.
Cheta na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) boro Malami, nwa nwoke na nwunye ya ebubo iri na isii nke gụnyere nrụrụaka nakwa mpụ dị iche iche.

Ụlọikpe ehigharịala ikpe Malami ọzọ

Ebe foto si, Abubakar Malami/X
Ụlọikpe Etiti dị n'Abuja ehigharịala ikpe onye bụbu Ọkaikpe Ukwu Naijiria na Minista na-ahụ maka ikpe bụ Abubakar Malami gaa abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026 bu ụbọchị ụlọikpe ga-ekwu ma a ga-enye ya ohere isi n'ụlọ abịa ikpe ya.
ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka 'Economic and Financial Crimes Commission' (EFCC) kpụpụrụ Malami, nwa ya nwoke bụ Abdulaziz, na otu n'ime ndị nwunye ya bụ Bashir Asabe, ụlọikpe n'abalị 29 nke ọnwa Disemba afọ 2025 maka ebubo ebubo nrụrụaka na mbupụ akatamkpo ego .
A na-ebo ha ebubo ibupụ ego dị ijeri naira asatọ na ụba asaa(₦8.7 bn.)
Ọkaikpe nyeburu iwu ka a tụnye mmadụ atọ a n'ụlọikpe dịka ikpe ahụ na-aga.
Mana Malami tinyere akwụkwọ ịrịọ ka Ụlọikpe ahụ nye ya ohere isi n'ụlo abịa ụlọikpe. na mkpọrọ maka akwụkwọ bụ gbara ya maka

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọkaikpe Emeka Nwite nke Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja atụkpuola onye bụbu Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami, nwa ya nwoke bụ Abdulaziz Malami nakwa onye ọzọ aha ya bụ Hajia Asabe Bashir n'ụlọmkpọrọ Kuje.
Ọkaikpe Nwite mere nke a n'ụbọchị Tuzde, Desemba 30 2025 n'oge ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ ha n'ụlọikpe maka ebubo ruru iri na isii.
E zigara Abubakar na mmadụ abụọ ahụ n'ụlọmkpọrọ, bụ ebe ha ga-anọ ruo oge ikpe ha ga-amalite.
Hajia Asabe Bashir bụ onye ọrụ n'ụlọọrụ Rahamaniyya Properties Limited.
N'akwụkwọ Nnukwu Ọkaiwu Jibrin Okutepa gbara ndị a ka o boro ha ebubo iji ego e nwetara n'ụzọ nrụrụaka zụta ala na ụlọ mara mma n'Abuja, Kebbi, Kano, nakwa ebe ndị ọzọ.
Mana Abubakar na ndị ọzọ e boro ebubo a kwuru na aka ha dị ọcha.
Ụlọikpe anabataghị ka a tọhapụ ha ma gbado ụkwụ na ọ bụ taa ka ha nọrọ n'ụlọikpe tinye akwụkwọ maka ntọhapụ ha, nke mere na Ọkaiwu gbara ha akwụkwọ enweghị ohere tinye anya n'akwụkwọ ahụ.
Ụlọikpe kwuru na ọ ga-ebute ọnọdụ egeghị onye ọbụla ntị nke ọma.
Ọ sị na iwu kwadoro na Ọkaiwu kpụpụrụ ha n'ụlọikpe ga-enwe ezigbo ohere ịzaghachi ihe niile ha dere n'akwụkwọ ha tinyere maka ntọhapụ ha.
Ọ sị na ya agaghị eji aka ya wepụ akwụkwọ ahụ e tinyere maka ntọhapụ, maka na Ọkaiwu na-anọchịtaanya anya Malami ji ọnụ ya na-arịọ maka ntọhapụ ha, ma kọwaa na ya mee ya na ọ ga-abụ imebi usoro e ji ekpe ikpe.
Ụlọikpe zigara ha n'ụlọmkpọrọ Kuje maka i chere ụbọchị ikpe ha, ma yigharịa ikpe ha ka ọ bụrụ n'ụbọchị 2 Jenuwarị, 2026.
Lee ụfọdụ ebubo e boro Malami na ndị ọzọ

Ebubo e boro Abubakar Malami, nwa ya nwoke bụ Abdulaziz Malami, na onye ọrụ Rahamaniyya Properties Limited bụ Hajia Asabe Bashir bụ na ha jikọrọ aka mee mpụ na nrụrụaka ndị a site n'ọnwa Novemba 2015 ruo na Juun 2025:
- Malami na nwa ya zịtere ụlọọrụ a na-akpọ METROPOLITAN AUTO TECH LIMITED ka ha kpuchie ego ruru N1,014,848,500.00 dị n'ụlọakụ Sterling Bank Plc n'ọba ego nwere akara 0079182387, n'ihe dịka ọnwa Julaị 2022 na Juun 2025, bụ nke megidere iwu mbupụ ego.
- N'ọnwa Nọvemba 2022 ka ha ji ụlọọrụ Rahamaniyya Properties Limited kpuchie ego ruru N500m ha jiri zụpụta ụlọ mara mma n'ogbe Amazon, dị na Maitama, Abuja.
- Ọzọkwa bụ na Malami, nwa ya nwoke na Hajia Bashir kpuchiri ego ruru N700m ha ji kwụọ ụgwọ ụlọ No. 3 Onitsha Crescent, Garki, Abuja, nakwa ego ọzọ ruru N850m ha jiri zụta ala nwere akara "Plot 683" dị na mpaghara Jabi n'Abuja.
EFCC akpụpụla Abubakar Malami na nwa ya nwoke n'ụlọikpe
Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), akpụpụla onye bụbu Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami na nwa ya nwoke n'ụlọikpe.
EFCC na-ebo ha ebubo ruru iri na isii nke gụnyere mbupụ ego na nrụrụaka ndị ọzọ.
Ebe a na-ekpe ikpe ha bụ n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja nke Ọkaikpe Emeka Nwite nọ n'isi ya.
Dịka akụkọ a ka na-apụta, nọnyere anyị dịka anyị ga-ewetere gị ihe ndị ọzọ na-eme n'ụlọikpe.











