Anthony Joshua ezutela ezinaụlọ Latif Ayodele na Sina Ghami

Ebe foto si, Anthony Joshua/Instagram
Otiọkpọ a ma ama Anthony Joshua ezutela ezinaụlọ ndị enyi abụọ ahụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ mere n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025.
Foto Anthony Joshua wepụtara n'akara Instagram ya n'ụbọchị Sọnde 4 Jenụwarị, 2026, gosiri ebe ya na ndị ezinaụlọ Latif Ayodele na ezinaụlọ Sina Ghami nọ dịka ọ gara zute ha ma tie ha aka n'obi maka oke ọdachi ahụ dakwasịrị ezinaụlọ.
Cheta na Latif Ayodele na Sina Ghami bụ ndị enyi Anthony Joshua nwụrụ oge ụgbọala ha na Joshua ji eme njem nwere ihe mberede n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025 n'ụlọikpe.
A kpụpụla ọkwọụgbọala bu Anthony Joshua na ndị enyi ya n'ụlọikpe

Ebe foto si, Social media
Ndị uweojii Ogun Steeti ekwuola na a kpụpụla ọkwọụgbọala ahụ bu Anthony Joshua na ndị enyi ya oge ha nwere ihe mberede n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025 n'ụlọikpe.
Ndị uweojii kwuru na a kpụpụrụ Adeniyi Mobolaji Kayode gbara afọ 46 n'ụlọikpe Majie dị na Sagamu n'ụbọchị Fraịde 2 Jenụwarị, 2026 maka ebubo ibute ọnwụ site n'ịkwọ ụgbọala n'ụzọ na-ezighị ezi.
Ụlọikpe ahụ nyere ọkwọụgbọala ahụ ntọhapụ beelu ma kwuo na ọ ga-akwụ ego dị puku dọla atọ na narị dọla anọ $3,400 ma weta mmadụ abụọ ga-anara ya n'aka ebe tupu o nweta beelu ahụ.
Ka ọ dị ugbua, a kpọrọchiri nwaamdị na nga ruo oge o mezuru ihe niile dị n'iwu ntọhapụ beelu ya ebe ụlọikpe yigharịrị ikpe ahụ n'ụbọchị Tuzde 20 Jenụwarị, 2026 ma
Ndị enyi Joshua bụ Latif Ayodele na Sina Ghami nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ.
Anthony Joshua apụtala n'ụlọọgwụ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọgwụ atọhapụla Otiọkpọ a ma ama bụ Anthony Joshua, ma kwupụta na o nwereike ịnọrọ n'ụlọ nwetechaa onwe ya.
Nke a dị n'ozi Kọmịshọna Mgbasaozi na Legọs Steeti bụ Gbenga Omotosho na Onye Ndụmọdụ Pụrụiche maka Mgbasaozi n'Ogun Steeti bụ Kayode Akinmade jikọtara aka wepụta.
N'ozi ahụ, Omotosho na Akinmade kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 31 Disemba, 2025 ka ụlọọgwụ tọhapụrụ Joshua.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, Otiọkpọ Joshua "nọ n'oke ihe mwute na iru uju" maka ọnwụ ndị enyi ọma ya abụọ.
Gọọmenti Legọs Steeti na Ogun Steti jikwa ozi ahụ kasie ezinaụlọ ụmụokoroọbịa abụọ ahụ nwụrụ anwụ bụ Lateef Ayodele na Cina Gami obi ọzọ, ma rịọ ka mkpụrụobi ha zuru ike n'udo.
Ha kelekwara onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu maka nkwado niile o nyere Joshua oge ọ nọ n'ụlọọgwụ.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025 ka Anthony Joshua zutere nnukwu ihe ọdachi n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan, oge ọ na-aga ịhụ ezinaụlọ ya na Sagamu dị n'Ogun Steeti.
Anthony Joshua: Kedụ ndị bụ mmadụ abụọ ahụ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ?

Ebe foto si, Instagram
Dịka akụkọ ihe mberede okporoụzọ metụtara ụgbọala Otiọkpọ a ma ama bụ Anthony Joshua fesara ebe niile, ọtụtụ mmadụ malitere ịjụ ajụjụ banyere mmadụ abụọ ahụ e kwuru na ha nwụrụ na nnukwu ọdachi ahụ.
Matchroom Boxing bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara Anthony Joshua, kwuru na aha mmadụ abụọ ndị ahụ bụ Sina Ghami na Latif Ayodele.
Ha bụ ndị nkụzi nakwa ezigbo enyi Anthony Joshua ma bụrụkwa ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ.
Sina Ghami

Ebe foto si, sina_evolve/Instagram
Sina Ghami bụ onye nkụzi Anthony Joshua kemgbe afọ iri gara aga. Ọ bụ ọkachamara n'ihe gbasara ịzụ na iwulite akwara 'muscle'.
Sina bụ onye nwere ikike ma bụrụ onye a ma ama dịka onye idozi ahụ nakwa iwulite ọnọdụ akwara doro anya.
Ọ na-enyere ndị nwere nsogbu akwara, Bekee kpọrọ 'musculosketal injury' aka inweta ọgwụgwọ.
Ọ so na ndị hiwere ụlọọrụ Evolve Gym dị na Lọndọn. Ya na ọtụtụ ụlọọrụ egwuregwu gụnyere National Football League (NFL), National Basketball Association (NBA) nakwa otu egwu bọọlụ Michigan State University arụkọọla ọrụ.
Latif "Latz" Ayodele

Ebe foto si, healthy_mindset/Instagram
Latif "Latz" Ayodele bụ onye nkụzi Joshua. Ọ bụ onye ihe gbasara idozi akwara doro anya nke ukwuu. Ọ bụ onye okpukperechi Alakụba kemgbe afọ 2021.

Ebe foto si, healthy_mindset/Instagram
Mụ na Anthony Joshua ekwuola n'ekwentị - Onyeisiala Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/X
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu akasiela Anthony Joshua obi maka ọnwụ ndị otu ya abụọ, bụ ndị ha na ya nwere ihe mberede okporoụzọ na Legọs steeti.
Nke a dị n'ozi Tinubu wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025.
Onyeisiala Tinubu kwuru na ya kpọrọ Anthony Joshua n'ekwentị iji kasie ya obi maka ọnwụ ndị otu ya abụọ bụ Kevin Latif Ayodele na Sina Ghami.
Tinubu kwuru na ya kpeere Joshua ekpere ma gọọrọ ya ọfọ ka ọ gbakee ngwangwa, dịka Joshua gwara ya na a na-elekọta ya anya nke ọma.
"Mụ na nne ya kwuru, m kpeere ya ekpere. Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu maka oku ahụ," ka Onyeisiala Tinubu kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na aka na-achị Ogun Steeti bụ Gọvanọ Dapo Abiodun, onye ya na Joshua nọ n'ụlọọgwụ, kwere nkwa na ya ga-eme ihe niile iji hụ na e letara nwaokoroọbịa ahụ anya nke ọma.
N'ikpeazụ Onyeisiala Tinubu kpere ekpere ka Chukwu kasie ezinaụlọ mmadụ ndị nwụrụ anwụ obi, ma mee ka mkpụrụobi ha zuru ike na ndokwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Anyị na-atụ anya Anthony Joshua tupu anyị enweta ozi na o nwere ihe mberede - Ndị ezinaụlọ Joshua

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ezinaụlọ Anthony Joshua na Naịjirịa na-achọghị ka a kpọọ aha ha gwara BBC na ozi ọdachi ahụ metụtara nwanne ha mapụrụ ha obi, tinyekwara ndị obodo na ndị na-akwado Joshua.
Ha kwuru na olileanya ha bụ ka "ọ gbakee ngwangwa", dịka ha kpekwara ekpere ka mkpụrụobi ndị nwụrụ n'ihe ọdachi ahụ zuru ike na ndokwa.
Otu n'ime ndị ezinaụlọ ya kwuru na Joshua si Legọs na-alọta Ogun Steeti n'ụbọchị Mọnde tupu ihe ọdachi ahụ emee.
O kwuru na ndị ezinaụlọ ha na-atụ anya ka Joshua soro ụmụnne ya nọ na Sagamu mee emume afọ ọhụrụ.
Ndị ezinaụlọ ahụ kwuru na ha na-eche inwetakwu ozi n'aka ndị uweojii na-eme nnyocha gbasara ihe ọdachi ahụ.
Anthony Joshua ezutela ihe mberede okporoụzọ na Legọs

Ebe foto si, Getty Images, Gbenga Omotosho
Otiọkpọ a ma ama bụ Anthony Joshua adanyela n'ihe mberede okporoụzọ ọjọọ na Legọs Steeti.
Nke a dị n'ozi kọmịshọna mgbasaozi na Legọs Steeti bụ Gbenga Omotosho wepụtara n'akara X ya n'ụbọchị Mọnde 29 Disemba 2025.
Dịka Omotosho siri kwuo, Joshua zutere ọdachi ahụ na mpaghara Sagamu dị n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan.
"Anthony Joshua ezutela nnukwu ihe mberede okporoụzọ, tupu e ruo n'ọgbanelu Sagamu dị n'okporoụzọ si Legọs gawa Ibadan. Legọs Steeti ezigaala ụgbọala gbatagbata," ka ozi ahụ kwuru.
Ụfọdụ ụlọmgbasaozi si na Joshua nọ n'azụ ụgbọala ya oge ọ gara suo ụgbọala gwongworo nọọrọ onwe ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe ndị uweojii kwuru
Ndị uweojii gwara BBC na Anthony Joshua nwetara obere mmerụahụ mana "o nweghị ihe na-eme ya".
Ụlọọrụ ndị uweojii Ogun Steeti mekwara ka anyị mata na mmadụ abụọ nwụrụ n'ihe mberede ahụ.
Ka ọ dị, ha kwuru na e bugaala Joshua na ndị ọzọ merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ a na-akpọghị aha.
Foto na onyonyoo fesara ebe niile gosiri ụgbọala lara n'iyi n'ihi ihe mberede ahụ.
Onye bụ Anthony Joshua?
- Anthony Joshua bụ otiọkpọ a ma ama na mba Briten.
- Ọ dị afọ iri atọ na isii.
- Joshua nwere mgbọrọgwụ n'obodo Sagamu dị n'Ogun Steeti









