Ọkwa maka ozi nzuzo ọbaozi Whatsapp BBC Chanelụ na Community

Whatsapp BBC Chanelu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ntụkwasaobi gị dị anyị ezigbo mkpa. Nke a pụtara na BBC dị njikere ichekwa ihe nzuzo na nchekwa ozi niile gbasara onwe gị. Ọkwa ozi nzuzo a na-akọwa etu anyị si ewere ma jirikwa ozi niile gbasara gị eme ihe mgbe i sonyeere anyị nakwa mgbe ị hapụrụ anyị, n'ịgbaso iwu jikọrọ nchekwa ozi.

Kedụ ozi gbasara gị BBC ga-ewere na etu anyị ga-esi jiri ya mee ihe

BBC ga-ewere ma hazie ozi nke onwe gị ị họọrọ ịrọpụta dịka otu akụkụ isonye na isoro ọgbakọ channel na community anyị. Ozi a nwereike gụnye ụfọdụ maọbụ ozi ndị a e depụtara n'okpuru.

Ozi nke onwe

Ozi nke onwe a pụrụ iwere ga-abụ:

  • Aha nkọwa dị n'akara Whatsapp gị
  • Akara ekwentị gị
  • Foto ngosi

Dabere n'ụdị foto ngosi gị na nhazi ozi nzuzo gị, o kwere omume na BBC ga-ewere ma hazie ozi ndị dị oke mkpa nke a maara dịka nkeji ozi pụrụ iche nke ị họọrọ ikpughe. Nke a nwereike ịgụnye iji maa atụ:

  • Agbụrụ gị
  • Ozi gbasara ọnọdụ ahụike gị
  • Nkwenye okpukperechi gị
  • Ụdị mmekọ na-amasị gị
  • Ucheobi ndọrọndọrọ ọchịchị

Ịhazi foto ngosi Whatsapp gị ka ọ bụrụ nke onwe

Biko mata na ọ bụrụ ma gị kwere ka onye niile na-ahụ foto ngosi dị n'akara Whatsapp gị, BBC nwereike ịhụkwa ozi a. A na-agba gị ume ka ị gbanwee nhazi nzuzo gị ka ọ bụrụ maka 'naanị ndị maara gị' iji belata ozi nke onwe ị na-ekesara anyị site na Whatsapp.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Onye na-achịkọta Ozi?

BBC bụ onye kwụụrụ na nke onwe ya na-achịkọta ozi nke onwe ọbụla ị rọpụtaara anyị bụ nke e chekwara n'akụrụngwa na igwe BBC dị iche iche.

Whatsapp bụ onye nchịkọta ozi "kwụụrụ na nke onwe ya" maka ozi ọbụla ekesara n'ọbaozi ahụ. Biko marakwa na ị ga-erube isi n'iwu na usoro maka atụmatụ ozi nzuzo Whatsapp. Whatsapp nwereike kesaa ozi gị n'etiti ụlọọrụ Meta.

Ụzọ iwu kwadoro maka ịhazi ozi nke onwe gị

Anyị dabeere n'ịnata ikike iji ozi nke onwe gị eme ihe. Nke a bụ n'ihi na i kpebiri isonye n'ọgbakọ mgbasaozi Whatsapp Channel anyị. Ọ bụrụ ma gị chọọ ịkwụsị ịnata mgbasaozi ndị a, i nwereike ịkagbu ikike i nyere anyị n'oge ọbụla site n'iwezuga onwe gị n'ọgbakọ a.

Ikesa ozi

BBC na onye ọzọ agaghị ekesa ozi nke onwe gị na-ebughị ụzọ nata nkwado gị.

Ijigide ozi gị

BBC ga-ahazi ozi nke onwe gị n'oge kwesịrị ekwesị iji mezuo ebumnobi e depụtara n'ọkwa maka ozi nzuzo a.

Ikike gị na ozi ndị ọzọ

I nwere ikike n'okpuru iwu mba UK na-ahụ maka nchekwa ozi. I nwereike kpọo oku maka epekele ozi BBC chekwara maka gị, nke gụnyere akara ozi gị na BBC nakwa ozi a kọwara n'elu ọ bụrụ na ọ bụ anyị ji ozi ndị ahụ.

I nwereike kpọtụrụ anyị site n'akara email anyị [email protected]. Ọ bụrụ na i nwere ajụjụ maọbụ na ị chọrọ inwetakwu ozi gbasara ikike gị, biko gaa na ozi nzuzo BBC na atụmatụ kuki na http://www.bbc.co.uk/privacy.

Ọ bụrụ na i nwere mmetụta gbasara etu BBC si were ozi onwe gị mee ihe, i nwereike kpọlite uche anyị site n'ụlọọrụ ndị nlekọta anyị dị na UK, Ụlọọrụ onye Kọmịshọna Mgbasaozi (ICO) https://ico.org.uk/.

Inwogharị ọkwa ozi nzuzo a

Anyị ga-enwogharị ọkwa ozi nzuzo a ọ bụrụ na e nwere mgbanwe gbara ọkpụrụkpụ n'ụzọ anyị si eji ozi nke onwe gị eme ihe.