Anglican Priest Balthazar Obeng Larbi: Ihe na-akpọtụ dịka ụkọchukwu Anglịkan susuru ụmụakwụkwọ nwaanyị atọ ọnụ n'egbirigbi ọnụ

Ebe foto si, Screengrab
Ụlọụka Anglịkan dị na mba Ghana achụọla ụkọchukwu na-esusu ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ọnụ n'onyonyo na-efegharị na soshal midia.
Ha chụrụ ụkọchukwu Balthazar Obeng Larbi n'ụbọchị Tusdei dịka ha mechara ọgbakọ ebe ha nọ nyochaa ihe ahụ merenụ.
Ha egbughị oge n'ikpebi na ya bụ ụkọchukwu ga-apụ na mahadum " St. Monica College of Education" dịka ụkọchukwu nakwa ọkaiwu ngalaba "Ghana Education Service" n'ogbe Ashanti.
Ha achụchara ya n'ọrụ ma gwa ọha na ha na-enye ụmụnwaanyị atọ ahụ ntuziaka ziri ezi.
Cheta n'ụlọụka Anglịkan dị na mba Ghana wepụtaburu akwụkwọ ozi iji wee kwete na ya bụ ụkọchukwu susuru ụmụakwụkwọ atọ ahụ ọnụ ,ma gosi nwute ha, kwukwa na ha na-eyocha onyonyo gosiri ebe ihe a mere.
Ihe na-akpọtụ dịka ụkọchukwu Anglịkan susuru ụmụakwụkwọ nwaanyị atọ ọnụ n'egbirigbi ọnụ
Ụka Anglịkan na mba Ghana kwuru na "obi dị ha mwute" dịka otu ụkọchukwu ha susuru ụmụakwụkwọ nwaanyị atọ ọnụ n'ụlọụka ha ụbọchịụka, abalị 15 nke ọnwa Ọgọst, afọ 2021.
Nke a mere dịka a na-enye ụmụakwụkwọ ahụ mere ọfụma ihe nkwanyere ugwu.
Ihe onyonyo na-ewu na soshal midia gosiri ebe Ụkọchukwu e nyere aha ya dịka "Ụkọchukwu Larbi" nyere ụmụakwụkwọ 'St. Monica College of Education, Ghana" atọ ihe ọ kpọrọ "nsusu ọnụ dị nsọ" n'otu n'otu, ebe ụmụakwụkwọ no ebe o mere na-amachagharị, na-achị eze.
Oge o ruru n'onye nke atọ, o mere ya aka na ya yi mkpuchi imi, mana ụkọchukwu ahụ gwara ya ka o yipu ya ma susukwaa nwata ahụ ọnụ.
N'ozi mgbasaozi si n'ụka Anglikan pụta, nek onyeisi na-achịkọta 'Metropolitan Archbishop of Ghana' bụ George Dawson-Ahmoah binyere aka, ha kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.
Ha kwukwara na ihe mere "dị ha obi mwute".
Ha kwukwara na ha na-eme nnyocha banyere ya ma gboso ihe iwu kwuru n'iso ya bụ ụkọchukwu.
"Akụkọ ihe onyonyo ebe ụkọchụkwụ na-esusu ụmụakwụkwọ erutela ndị isi ụka Anglikan na Ghana nke onye nọ n'isi ya bụ Most Revered Dr. Cyril Kobina ntị."
"Akụkọ a dị Ụka obi mwute. Anyị amalitela nnyocha ozigbo."
Ha kwukwara na ha ga-enye ụmụakwụkwọ ndị o metụtara nleta site ndụmọdụ
E nweburu ndị na-azọtara ya bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọakwụkwọ ahụ ndị sịrị na ihe mere bụ na "ụkọchụkwụ na-elekọta ụlọakwụkwọ anyị nyere ụmụakwụkwọ ndị mere ọfụma asambodo, ego na nsusu ọnụ."
Kemgbe ihe onyonyo ahụ gbara n'ịntanet, ọtụtụ ndị mmadụ etinyeela ya ọnụ.
Ọtụtụ na-akọta ihe mere mere, ebe ụfọdụ ahụghị ihe ọjọ dị na ya.
Ụlọakwụkwọ 'St. Monica's College of Education, Ghana' bụ kọleji e hiwere maka ụmụnwaanyị na Mampong, Ghana n'afọ 1936.
Koleji ahụ na-eny ọzụzụ afọ atọ nke a ga-enye asambodo "Diploma in Basic Education (DBE)".
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Kemgbe ya bụ ihe onyonyo wuwere na soshal midia, ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu gụnyere ndị isi ụka ndị ọkaiwu na ndị na-alụ ọgụmaka ikike dịị onye akatọọla ya.
Nnukwu Ụkọchukwu Anglikan mpaghara nke Lagos Mainland bụ Venerable Okey Ifionu gwara BBC Igbo na ihe ụkọchukwu ahụ mere adabeghị dịka nkwenye ụka Anglịkan nke Naijiria sịrị dị.
" ọ bụrụ na ọ chọọ ịmị ha ọnụ, ọ mịa ha na nti iji gosi na ihe ha mere masịrị ya.
"Ọtụtụ ọrịa nwere ike ikesa n'oge dị otu a site n'isusu ọnụ."
O kwuru na ihe ahụ ụkọchukwu meere abụghị "nsusu ọnụ nke dị nsọ nke Paul kwuru n'ozi o degara n'Akwụkwọ Nso."
Onye ọkaiwu mabụrụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye bụ Laurreta Ezugbo kwuru na ihe Ụkọchukwu ahụ mere megidere iwu ji mmetọ ụmụnwaanyị nke Bekee kpọrọ "sexual harrasment."
Ezugbo kwuru na ọ bụrụ na ụmụakwụkwọ ahụ erubeghị afọ 18, na ihe o mere kwesịrị ka akpụpụ ya ụlọikpe ka ọ taa ahụhụ dịrị iwu ọdara.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- 'Gọọmenti gbara ọsọ kpọọ Ipob otu iyiegwu ma hapụ Boko Haram, na-akpalite ihe mere n’Afghanistan'
- 'Ọ bụ ndị ntoroọbịa Atani na-awakpo ndị okenye ka ndị agha jidere, ọbụghị ndị Ipob' - Igwe Ngoddy
- Ipob Sit At Home Order: 'Ụjọ ji anyị ịpụta'
- Onitsha tanker fire: Etu ọkụ si gbaa ụgbọala 15 n'Ọnịcha ụnyahụ















