Gbalahụ idina onye nkuzi gị n'ụzọ ise a

Ebe foto si, AFP
Mahadum OAU na-ewu na sochal midịa maka akụkọ na otu onyenkuzi chọrọ idina nwakwụkwọ iji nye ya ngafe n'ule.
Ọtụtụ na-ekwu n'igwe okwu Twitter na ihe dị otu a bụ ihe na-eme n'ọtụtụ mahadum n'ala Naịjirịa ebe a na-ebo ebubo na ndị nkuzi na-amanye ụwụakwụkwọ ụmụnwanyị inye onwe ha, ego na ihe dị ọzọ iji nweta akara dị elu n'ule.
Tolu Ayeni kwuru: " Gịnị mere OAU ji ewu? Anyị na-eme mkpọtụ maka ndị ụlọakwụkwọ ebe anaghị ekwe ụmụakwụkwọ tinye uchu gụọ akwụkwọ iji nwe ezigbo akara."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana otu onye nkuzi mahadum, Enugwu State University (ESUT) na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC na ugbua, na ọ bụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị bụ ndị na-enye ndị nkụzị nsogbu ka ha dina ha iji nwe ngafe n'ule.
"Achọghị ikwu ihe ọbụla banyere okwu a n'ihi na ugbua ọ bụ ụmụakwụkwọ bụ ndị na-enyegharị ndị nkuzi nsogbu."
Lee ụzọ i nwere ike iji kwụsi mmekpaahụ inye onwe maka igafe ule:
1. Site na ị mata ihe mmekpaahụ inye onwe pụtara
Ọtụtụ ụmụakwụkwọ na ndị na-akụzịrị ha amaghị ihe mmekpaahụ nwoke na nwanyị pụtara maọbụ ihe onye ga-eme a kpọ ya mmekpa ahụ.
Mmekpaahụ mmekọrịta nke a kpọkọrọ sexual harassment na bekee bụ ịrịọ mmadụ mmekọrịta mana ọ bụrụ na onye ahụ jụ, o nwere ike inweta ntaramahụhụ. Maọbụ omume dịka imetụ aka, ịma njakịrị maọbụ omume akwụghị ọtọ nwere ike nye onye a na-emesa ya mgbaka ahụ.
Onye kachamara n'ihe gbasara ikike diri onye siri kọwara na ọ dị kpa ka mmadụ mara ihe ọ bụ, mara oge e mere ya maọbị mgbe ị na-eme ya mmadụ.
2. Ịgusi akwụkwọ gị ike
Ọ dị mkpa ka nwataakwụkwọ mahadum tinye uchu n'ịgụ akwụkwọ ya iji gafe n'ule ya ma gbalahụ ohere onye nkuzi obi ya adịghị ọcha inwale ya.
Onye ọkaiwu bụ Chukwuemeka Eze kọwara sị: "I gụsie akwụkwọ ike, ị gafe n'ule. Ị daa ule, ịchọwa ka e nyere gị aka, onye nkụzị achọkwa ka i nyere ya aka."

Ebe foto si, Chukwuemeka Eze Facebook Page
3. Itụ Egwu Chineke/Ji ezi ejiji
Eze onye bụ onyenkụzi na mahadum Nasarawa Steeti kwuru na ịtụ egwu Chineke ga-eme ka nwataakwụkwọ na-ejikere ụzọ dị mma ghara ighewe ahụ ya oghe ma na-akpa ezi agwa iji gbalahụ ịdabanye n'ọnya onye nkuzi.
"Ọ bụghị onye na-eghewe akwa ya ọnụ emecha ọ sị na onye nkuzi na-enye ya nsogbụ. ọ bụ ya na-ebute ụzọ aghụghọ
4. Ị na-egosi agwa dịka onye ndu
Eze kwuru na nwata akwụkwọ na-egosi agwa onye ndụ, ndị nkuzi ya ga na-enye ya ugwu ma na asopụrụ ya. " O nwere ka ọ na adị, okenye a na-asọpụrụ nwata."
5. Kwuputa ihe mere
Ihe kpatara na mmekpahụ ụmụnwaanyi na-aga n'ihu bụ n'ọtụtụ o metụtara anaghị ekwupụta ya nke mmere ka ndị nkuzi obi adịghị ọcha ji nwee ike ịga n'ihu na ihe ha na-eme.
Mana dịka ọkaiwu Eze nyere ndụmọdụ, ọ bụrụ na nwakwụkwọ na-agba mbọ nwe mmekpaahụ, onyenkuzi kwada ya, o nwere ohere iti mkpụ ka onye ọzọ tulee akwụkwọ ule ya.
Na mkparịtaụka BBC na ọnụ na-ekwuchitere mahadum OAU nke a kpọrọ aha n'ebubo ahụ na-ewu bụ Abidodun Olanrewaju nwere, o kwuru na ndị isi mahadum ahụ na-enyocha ebubo ahụ.
"Anyị egela mkparitaụka ahụ na-efegharị. Anyị na-enyocha ya iji ma na ndị anụrụ olu ha na mkpaịrtaụka ahụ bụ ndị sị ụlọakwụkwọ anyị.
"OAU anaghị eji nti anụ ihe gbasara mmekpaahụ metụtara mmekọrịta nwoke na nwanyị."

Akụkọ ga-amasị gị:










