Legos nwere ijiegbezu 1315, ntọ 392

Ebe foto si, @rrslagos
Kọmishọna ndị uweojii na Legos bụ Edgal Imohimi kwuru na e nwere ijiegbeezu 1315, mwakpo ndị otu nzuzo 359, nakwa ntọ 392 na steeti ahụ n'afọ anọ.
Imohimi, onye kwupụtara nke a na ọgbakọ nchekwa nke Legos steeti nke e mere na Legos kwuru na a nwụchiri ọtụtụ a na-enyo enyo na ha bụ ndị omekeome, ebe ikpe ha ikpe ka na-aga n'ihu.
O kwuru na ndị uwe ojii belatara ike ndị otu nzuzo a kpọrọ 'badoo,' akpa na mpaghara Ikorodu nakwa ndị isiekewọnwụ n'obodo dị na ikpere mmiri na steeti.
O kwuru na ọ bụ nkwado ngwa ọrụ sitere na enyemaka nke gọọmentị Legos steeti mere ka ndị uwe ojii nwelie ike ime nke a.
O kwukwara site na enyemaka ndị nchekwa obodo na njikọaka o hibere kemgbe ọ malitere ọrụ na steeti ahụ.
Ọ kpọrọ oku ka agawanye n'ihu inwe ọrụ nchekwa gbanyere ụkwụ na nchọpụta nakwa enyemaka ndị eze ọdịnala nakwwa ọzụzụ ndị ọrụ nchekwa ka ọrụ ha were na-aga siririwerere.






