Melaye chọrọ ịgba onyeisi uweojii akwụkwọ ma elekere 48 gafee

Ibrahim Idris na Dino Melaye

Ebe foto si, GETTY IMAGES/DINO MELAYE

Nkọwa foto, Ibrahim Idris na Dino Melaye bụ Sinetọ na-anọchite anya ndị Kogi West na-akwata ya maka ebubo mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchiri boro ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Sinetọ Dino Melaye enyela Ibrahim Idris bụ onyeisi ndị uweojii Naịjirịa iwu sị ya kpọpụta mmadụ abụọ sị na o nyere ha egbe, ma ọ bụrụ na ọ chọghị ka ya bụ Melaye kpọpụ ya ụlọikpe.

Melaye kwuru sị na ọ na-enye ya nanị elekere 48 nke bụ mkpụrụ ụbọchị abụọ, iji kpọta ndị a, maọbụ ọ kpọga ya ụlọikpe ebe ọ ga-azara ọnụ ya maka mmegide, iji iyi egwu anapụ mmadụ ihe nke bekee kpọrọ blackmail, nakwa mmekpa ahụ nke echiche nke bekee kpọrọ mental assault.

Cheta na ụnyaahụ,onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa enyere iwu ka e wepu kọmishọna ndị uweojii na Kogi steeti bụ Ali Janga.

Nke a bụ maka mmadụ isii ndị boro Dino Melaye ebubo na o nyere ha egbe gbanahụrị ndị uwe ojii ebe a kpọsara n'isi ụtụtụ.

Ha gbafuru tupu ndị uweojii enwe ike kpụpụ ha n'ụlọikpe ukwu dị na Lokoja.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe Melaye nwere ikwu

Ka Melaye nọ n'ime ụlọomeiwui, o kwuru na ndị mmadụ chetakwa na aka onye eboro ebubo ga-adigide ọcha ruo oge a mara ya ikpe.

O kwuru nke a gbasara mmadụ abụọ ndị ahụ a na-enyo enyo ndị uweojii sị na ha tụrụ ya aka.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ihe Melaye dere n'igwe okwu Twitter gosiri na obi dị ya ụtọ na agaghị ekpe ikpe gbasara ya n'ụlọikpe dị na steeti ya bụ Kogi.

Dịka o kwuru, a ga-ekpezi ikpe gbasara ya n'ụlọikpe ukwu nke gọọmentị etiti dị n'Abuja.