Akku Yadav death: Etu ụmụnwaanyị si jide nwoke n'ụlọikpe ma bepụ ya amụ

Akku Yadav death: Etu ụmụnwaanyị si jide nwoke n'ụlọikpe ma bepụ amụ

Ebe foto si, Praveen Mudholkar/bbc

Nkọwa foto, Akku yadav: Etu ụmụnwaanyị si jide nwoke a n'ụlọikpe ma bepụ amụ

Akku Yadav zutere ọnwụ ya n'aka ihe ruru ụmụnwaanyị narị abụọ (200) boro ya ebubo idina ha n'ike.

Nke a bịara dịka Yadav malitere ịkpa mkpamkpa a n'afọ 1991, nọ na-anya isi na ikpe enweghi ike ịma ya n'agbanyeghi na a na-eme ya nnyocha n'ụlọikpe.

Dịka akụkọ si kwuo, Yadav bụ onye a ma dịka onye omekome, onye ntọ mmadụ, onye ohi, onye na-edina ụmụnwaanyị n'ike nakwa ogbu mmadụ, malitere idina ụmụnwaanyị n'ike mgbe ọ dị afọ 12.

Yadav bi n'obodo Kasturba Nagar, Nagpur, n'India, mgbe ọ malitere ibi ndụ omekome ya. Ọ kpagidere mkpamkpa n'obodo ahụ, mere ka ọtụtụ ezinaụlọ mụrụ ụmụnwaanyị na-akpọchido ha n'ime ụlọ maọbụ kwapụ n'ihi ya.

Indian Rape

Ebe foto si, Anadolu Agency

Ka ọ na-awakpo ụmụnwaanyị ka ọ na-egbukwa onye ọbụla jụrụ inye ya ego ma ọ jụọ ya, ọkachasị ndị nwere obere azụmahịa na-enweghi onye ga-agbatara ha ọsọ enyemaka.

N'ihi na Igbo tụrụ ilu sị na ogbu mma anaghị ekwe ka mma gafee ya n'azụ, Yadav bi n'ụjọ na ihe ọjọọ nwereike ime ya, nke mere na ọ naghị aga ebe e nwere ọgbakọ.

N'ime afọ iri, Yadav wakporo ihe ruru ụmụnwaanyị 40 bi n'obodo Kasturba Nagar - nke pekarịchara bụ nwata nwaanyị dị afọ iri.

Ụfọdụ mkpamkpa a sị na ọ kpara:

  • Yadav tụrụ asị na ọ bụ onye uweojii, wakpoo ụlọ di na nwunye, maa di mma n'apata ụkwụ ya ma kpọchie ya n'ime ụlọ. Ọ kpọrọ nwunye wakpogide ya ihe ruru awa anọ.
  • Ọ wakporo otu nwaanyị ka ụbọchị iri ọ mụrụ nwa ọhụrụ gachara; n'ihi ihere chere ya n'ihu, nwaanyị ahụ mụnyere onwe ya ọkụ wee gbuo onwe ya.
  • Ọ bepụrụ otu nwaanyị ara ya n'ihu nwa ya nwaanyị na ndị agbataobi, bekasịa ya ahụ ma gbuo ya. O gbukwara naanị otu onye a kpọrọ Avinash Tiwari tinyere ọnụ n'okwu ahụ.
  • Ọ wakporo otu nwaanyị dị ime ọnwa asaa n'ụzọ, gbaa ya ọtọ n'ihu ọha ma dina ya n'ike.
  • O gburu opekatampe mmadụ atọ, tọgbọ ozu ha n'ụzọ ụgbọoloko.
  • O gbukwara otu nwaanyị n'ihu nwa nwa ya dị afọ 16, bepụ ya ntị na mkpịsị aka ya - ka o ji nweta ọla ndị o yi n'ahụ.
Aha onyonyo, Gịnị ka e kwesịrị ime nwoke wakporo nwaanyị?

Ebee ka ndị uweojii nọ oge ihe a na-eme?

N'agbanyeghi na ọtụtụ ndị ọ wakporo mere mkpesa n'aka ndị uweojii, akụkọ kwuru na Yadav na ndị uweojii na-arụkọ; na o na-eji ego nakwa mmanya afọju ha ọnụ.

Akụkọ kwuru na nwaanyị bịa mee mkpesa, ndị uweojii atụgharịa bo ha ebubo na ha na-ayị Yadav, maọbụ kwaa ha emu na ha na-agba n'ezi.

Ebe ọ nọ ka njọ bụ na ndị uweojii ekweghi eme ihe ọbụla n'ihi na ọ kacha bụrụ ndị a na-akpaso oke - ndị Dalit - ka ọ ka awakpo.

Indian Rape

Ebe foto si, Anadolu Agency

Etu ihe mgbu ya si bido

Otu nwaanyị a kpọrọ Usha Narayane bụ onye gụrụ akwụkwọ bi n'etiti ndị agaghị akwụkwọ bịara foro ntutu taa mgbe Yadav tara otu nwaanyị agbataobi ya ahụhụ, mebisia ihe ha ma kwuo na ha ga-egbukpọ ezinụlọ ya.

Narayane ji aka ya gakwuru ndị uweojii ime mkpesa mgbe nwaanyị ahụ jụrụ ịga; nke a mere ka Yadav na ndị otu ya bịa ọgụ n'ụlọ ya ma ọ jụ ịwepụ mkpesa o mere.

Narayane gbanyere gaasị, sị ha na ọ ga-agba ma onwe ya ma ụlọ ma onye ọbụla batara n'ime ya ọkụ - nke a mere ka ha rie mbombo ọsọ.

Nke a nyere ụmụnwaanyị ndị ọzọ ọ wakporo obi iji chụrụ ya gawa; ha gbara ụlọ Yadav ọkụ ma na-atụ ndị otu ya okwute, nke mere ka Yadav jiri aka ya nyefee onwe ya n'aka ndị uweojii.

Ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe n'ụlọ ikpe ka atọhapụ ụmụ nwaanyị ndị magburu Akku Yadav
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe n'ụlọ ikpe ka atọhapụ ụmụ nwaanyị ndị magburu Akku Yadav

Etu o si nwụọ

Ka a na-ekpe Yadav ikpe, ụmụnwaanyị nọ ebe ahụ hụrụ na isi ya ga-apụta, mere ka ha ṅụọ iyi na nke ahụ agaghị eme, kama ha akwado ịga nga.

Yadav hụrụ otu nwaanyị ọ wakporo wee kpọọ ya 'akwụna', kwuo na ọ ga-edinakwa ya n'ike ọzọ mgbe ọ pụtara. Ndị uweojii dapụrụ n'ọchị, mana otu nwaayị ji iwe tụọ Yadav akpụkpọ ụkwụ ya n'isi.

Ndị uweojii na-echekwa ya hapụrụ ya gbalaga, okwute, ose a kwọrọ akwọ na mma esi n'elu si n'ala na-adakwasị Yadav n'ahụ.

Etu ahụ ka e sịkwa bepụ ya utu n'ihu ọha n'ụlọ ikpe.

Obodo ahụ banyere n'aṅụrị na mmemme, e mechara nwụchie ma tọhapụ ụmụnwaanyị ise maka itinye aka n'ogbugbu Yadav.

N'ikpeazụ, enweghị onye a mara ikpe maka ọnwụ Yadav, n'ihi na ụmụnwaanyị niile nọ n'obodo ahụ sị na ha tinyere aka n'ogbugbu ya, nke mere ka ọ bụrụ ọnọdụ nwụchie ha niile maọbụ hapụ ha.