Sexual Assault: A chụola okaikpe n'ọrụ maka ịsị nwaanyị 'mechie ụkwụ gị'

Ebe foto si, Getty Images
A chụola okaikpe n'ọrụ maka isi nwaanyị 'mechie ụkwụ gị' n'okwu mwakpo n'ike.
Dịka ụlọakụkọ Associated Press si dee, ụlọikpe kachasị na New Jersey dị na mba Amerịka chụrụ ọkaikpe John Russo n'ọrụ ọkaikpe maka na ọ gwara nwaanyị a wakporo n'ike na ọ kara 'imechi ụkwụ" ya maọbụ kpọọ ndị uweojii ka a bịara ịwakpo ya.
Onyeisi ọkaiwu bụ Stuart Rabner kwuru na okwu ahụ kwuru gosiri na o kweghị ekwesị ịhapụ ya ka ọ na-ekpe ikpe gbasara mkpagbu edị na ezinaụlọ maọbụ iwakpo.
Otu nwaanyị a kpọghị aha ya wetaburu mkpesa n'ụlọikpe Russo n'afọ 2016 ebe ọ rịọrọ ka ụlọikpe ya nye nwoke wakporo ya iwu ya abịakwala ya nso ọzọ.
Otu ndị ọkaikpe mmadụ atọ a họpụtaburu ka ha lebanye anya n'ihe Russo mere tụnyeburu alo ka e wepụ ya n'oche ndị ọkaikpe.
Russo, onye rọburu gbaghara maka okwu ya sị na ọ bụ ọchi ka ya na-akpa.
Ọ sị na ntaramahụhụ e nyere ya karịrị akarị dịka otu e hibeburu nyeburu ntuziaka ka a kwụsị ya ọrụ n'ike na-akwụghị ya ụgwọọnwa ọnwa atọ.
Ndị Amaọbịa na Umuerum enwetala eze ọhụrụ

Ebe foto si, ABS
Ndị obodo Amaọbịa na Umuerum dị n'Anambra steeti enwetala eze ọhụrụ.
Igwe Chinyelụ Nwora Molokwu bụ Eze ndị Amọbịa, ebe Igwe Christopher Ndibe bụ Igwe ndị Umuerum.
Molokwu meriri mmadụ anọ ndị ọzọ ya na ya zọrọ ọkwa eze n'afọ 2019 bụ ndị si n'Ụmụeze bụ ebe ndị Amaọbịa nyere ntuziaka ka a họpụta ndị ga-azọ ọkwa eze.

Ebe foto si, ABS
O ji vootu narị abụọ na iri anọ na anọ merie onye sochiri ya n'azụ bụ Ichie Eddy Nwokoye.
Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ n'obi gọọmenti dị n'Ọka nye ha asambodo dịka onye eze na nso nso a..

Ebe foto si, ABS
Ndị nọ ebe nke a mere gụnyere onyeisi ụlọomeiwu Anambra steeti nakwa onyeisi ndị Eze n'Anambara steeti bụ Igwe Nnaemeka Achebe.









