Afcon 2025: Super Eagles Naịjirịa na Desert Foxes Ọljirịa ga-achịpụ ya

Otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa ga-ezute Desert Foxes nke mba Ọljirịa n'asọmpi ogogo asatọ nke asọmpi Afcon 2025 na-aga n'ihu ugbua na mba Moroko.
Ịmaaka a ga-amalite mgbe ọ ga-akụ elekere ise nke mgbede (n'oge ndị Naịjirịa) n'ụbọchị Satọde 10 Jenụwarị 2025, ebe a ga-ahazi ya n'ama egwuruegwu Stade de Marrakech, Ouahat Sidi Ibrahim.
Super Eagles na Desert Foxes ga-achịpụ ya, dịka otu ọbụla nwetara mmeri ga-abanye n'ogogo nke na-esote nke ikpeazụ (ogogo 4) n'asọmpi a kachasị n'Afrịka.
Ịgba Naịjirịa tirila n'asọmpi a etutegharịala ntụkwasịobi ndị nkwado ha, mba Naịjirịa niile nakwa ndị gara asọmpi AFCON 2025 nwere n'ebe ha nọ.
Kemgbe asọmpi a malitere, otu egwu bọọlụ Super Eagles egosila na ha bụ azụ eru ala site n'inweta mmeri n'ịmaaka anọ ndị ha gbarala.
Ka o sina dị, otu egwu bọọlụ mba Ọljirịa abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba dịka ha gosirila na ha bụ ọkachamma n'ịgbawa obi ndị na-ama ha aka, ọkachasị n'asọmpi AFCON.
Dịka ha mabutere iko AFCON n'afọ 2019, Desert Foxes malitere asọmpi nke afọ a nke ọma, ma nweekwa ọnụnụọkụnobi igosipụta onwe ha ọzọ dịka ọkachamma n'Afrịka.
A tụrụ anya na ndị ụkwụ na-aghọ nkọ n'otu egwu bọọlụ Super Eagles dịka Victor Osimhen, Ademola Lookman na Alex Iwobi ga-akpa ike n'ịmaaka a.
N'aka nke ọzọkwa, mba Ọljirịa nwere ndị ọgbaa bọọlụ dịka Bennacer, Mahrez, Amoura na ndị ọzọ, bụ ndị a tụrụ anya ịbụ ihe iyi egwu nyere ndị mkpachi Super Eagles.









