4-0: Naịjirịa agbaala Mozambik ụkwụ n'éhé

Ịmaaka nke ogogo mgbapụ (ogogo nke 16) malitere mgbe ọ kụrụ elekere asatọ nke abalị n'etiti otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa na Mambas nke mba Mozambik.
N'ime nkeji ole na ole ịmaaka ahụ malitere, Victor Osimhen sụnyere otu ọkpụ goolu, mana e mechara gụpụ ya n'ihi na ọnọdụ ya ekwesịghị ekwesị (off side).
Ka o sina dị, Ademola Lookman gbapeere Super Eagles ụzọ site n'ịsụnye goolu mbụ ha na nkeji iri abụọ ịmaaka ahụ malitere.
N'ime nkeji anọ nke a mere, Victor Osimhen gosiri ihe e ji mara ya site n'ịsụnye ọkpụ goolu nke abụọ na nkeji iri abụọ na anọ.
Ka a gachara ezumike etiti oge ma lọghachi, Osimhen sụnyere ọkpụ goolu nke abụọ ya na nkeji iri anọ na asaa.
Akor Adams gosiri nke o ji biri na nkeji iri asaa na ise dịka ọ nọ n'ebe dị anya sụnye ọkpụ goolu nke ya iji mezuo ya 4-0.
AFCON 2025: Super Eagles nke Naịjirịa na Mambas nke Mozambik ga-akwata ya
Otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa ga-aga n'ihu n'asọmpi Iko Mba Afrịka afọ 2025 a na-ahazi na mba Moroko dịka ha ga-ezute otu egwu bọọlụ Mambas nke mba Mozambik n'ogogo nke iri na isii.
Ịmaaka a ga-amalite mgbe ọ ga-akụ elekere asatọ nke abalị (n'oge ndị Naịjirịa) n'ọgbọ egwuruegwu Stade de Fès, n'ụbọchị Mọnde 5 Jenụwarị, 2026.
Dịka otu egwu bọọlụ Super Eagles rurula n'ogogo a ọtụtụ oge ma gafeekwa ya ụfọdụ oge, ihe a bụ oge mbụ Mozambik ga-eru ya.
Nke a bụ oge mbụ otu egwu bọọlụ Mambas na-erute n'ogogo nke iri na isii, dịka ha dara mba ịgafe n'ogogo nke otu ugboro ise ha gara asọmpi Iko Mba Afrịka na mgbe gara aga.
Otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Eric Chelle na-achịkọta ji azịza zakọrọ mmeri niile n'otu CH dịka ha ji 2-1 merie Tanzanịa, jiri 3-2 merie Tunishịa, ma jiri 3-1 merie Yuganda.
Ka ọ dị ugbua, Naịjirịa asụnyela ọkpụ goolu asatọ n'asọmpi Iko Mba Afrịka 2025, nke kachasị ha na-asụnye n'ogogo otu n'asọmpi AFCON, mana a sụnyekwala ha ọkpụ goolu anọ.
Ademola Lookman na Raphael Onyedika sụnyere ọkpụ goolu abụọ n'otu n'otu n'ịmaaka dị iche iche a haziri n'otu CH ebe Semi Ajayi, Victor Osimhen, Wilfred Ndidi na Paul Onuachu sụnyere otu ọkpụ goolu n'otu n'otu.









