Naịjirịa etiwaala Tanzanịa ka akị oyibo Nsugbe
Otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa na Taifa Stars nke Tanzanịa malitere njem ha n'asọmpi Afcon 2025 mgbe o jiri ọkara gaa elekere isii nke mgbede n'ụbọchị Tuzde 23 Disemba, 2025.
Ịmaaka a kpọtụrụ n'ọgbọ egwuruegwu Fez Stadium dị na Fez na mba Moroko ma bụrụkwa ịmaaka mbụ nke ndị nọ n'otu CH.
Semi Ajayi gbapeere ndị Super Eagles ụzọ na nkeji iri atọ na isii nke ịmaaka ha na Taifa Stars dịka ọ sunyere otu ọkpụ goolu.
Ka a lọghachiri ezumike ọkara oge, Charles M'Mombwa sataara Taifa Stars ọkpụ goolu ahụ na nkeji iri ise.
Mana dịka ọ gara naanị nkeji abụọ, Ademola Lookman gosiri nke o ji biri, ma sụnyere ndị Super Eagles ọkpụ goolu nke abụọ ha na nkeji iri ise na abụọ.
Ka a gbachara nkeji iri itoolu, a gbakwunyere nkeji atọ mana ka e gbuchiri ịmaaka, Super Eagles tuuru ugo mmeri site n'ịsụnye ọkpụ goolu abụọ, ebe Tanzanịa satara naanị otu ọkpụ.

Ebe foto si, Getty Images
Afcon 2025: Etu Super Eagles nke Naịjirịa na Taifa Stars nke Tanzanịa ga-esi asọkọta mpi
Otu Super Eagles nke Naịjirịa na Taifa Stars nke Tanzanịa ga-achịpụ ya n'asọmpi Iko Mba Afrịka (Afcon) nke afọ 2025 dịka ha abụọ nọ n'ofu otu CH.
A ga-agba asọmpi ahụ n'ama egwuregwu Complexe Sportif dị n'obodo Fes nke mba Moroko ma o jiri ọkara gafee elekere isii nke mgbede.
Nke a bụ agba ugboro iri abụọ na otu n'asọmpi Afcon dịka Super Eagles ga-achọ ịmabute ya nke ugboro anọ mgbe ha gbachara ndị abụọ n'asọmpi ikpeazụ mgbe Ivory Coast meriri ha ma buru iko ahụ.
Mba Tanzanịa ga-agba asọmpi nke ugboro anọ ha dịka ha ka na-achọ inwete mmeri mbụ ha kamgbe ha malitere isonye n'asọmpi ahụ.
Mgbe Naịjirịa na Tanzanịa zuterela onwe ha

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa na Tanzanịa ezutela onwe ha ugboro asaa n'asọmpi egwuregwu bọọlụ niile, Naịjirịa emeriela ugboro anọ, ebe ha gbara nhatanha ugboro atọ, Naịjirịa enyela ha ọkpụ goolu iri na otu ebe Tanzanịa nyerela ọkpụ goolu atọ.
Ha zutere onwe ha n'asọmpi Afcon 1980 a mbụ, mgbe a gbara asọmpi ahụ na Naịjirịa ebe e meriri ha site n'ọkpụ goolu atọ asatara otu (3 - 1). Nke ahụ bụ mbụ Naịjirịa na-amabute iko a.
Mgbe ikpeazụ ha zutere onwe ha bụ n'asọmpi itozuokw n'Afcon 2017, ha gbara nhatanha n'obodo Dares Salaam n'ọnwa Sepụtemba 5, 2015.
N'aka nke ọzọ, Naịjirịa ji otu ọkpụ merie ha n'Uyo n'ọnwa Sepụtemba 3, 2016. Mana Ijipt mechara maburu iko ahụ.
"Asọmpi mbụ a dị anyị oke mkpa"

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu egwuregwu Super Eagles nke Naịjirịa bụ Eric Chelle kwuru na asọmpi ha na mba Tanzanịa dị oke mkpa na ọ bụ nnukwu asọmpi.
"Asọmpi mbụ na-adịkaarị mkpa n'oge niile, anyị chọrọ imeri asọmpi a, uche m dị na ya nakwa n'ebe ndị ọgba bọọlụ m na ndị ọrụ m nọọ."
Onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Tanzanịa bụ Miguel Gamondi gwara ndị ntaakụkọ na ihe mere n'oge mbụ agaghị ekpebi ihe ga-eme n'ọdịnihu.
"Ọ bụ nrọ anyị, mmadụ ọbụla apụghị igbochi anyị inwe okwukwe na ịrọ nrọ, ọ bụrụ na i nwere nrọ, ọ gaghị adị mma ka i hufee ụra."
Gamondi kwuru na ọ na-akwanyere Naịjirịa ugwu ọfụma, "mana a bịa n'egwuregwu bọọlụ ihe ọbụla nwereike ime ma anyị nọ ebe ime ọfụma.









