Afcon afọ 2025: Kedụ mgbe ọ ga-ebido, kedụ mba na mba ga-achịpụ ya na ihe ndị ọzọ banyere ya

Ivori Kost

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ivorị Kost bụ ndị ji ọkpụ abụọ a satara otu were merie Naijiria na be n'asọmpi ikpeazụ a gbara na nke gara aga.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Agba nke ugboro 35 asọmpi Iko mba Afrịka 'Africa Cup of Nations' (Afcon) ga-amalite na Moroko n'abalị 21 nke ọnwa Disemba afọ 2025 rue abalị 18 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026.

Ivorị Kost bụ ndị ji ọkpụ goolu abụọ a satara otu merie Naijiria n'agba ikpeazụ nke asọmpi a gara aga bụ a ga-achọ ịnapụta ike ahụ n'aka ha.

Mba iri abụọ na anọ (24) bụ ndị ga-asọmpi nwere ohere ịhọpụta ndị ọgba bọọlụ mmadụ iri abụọ na asatọ (28) ga-anọchiteanya ha.

Ohere mba ndị nwere ịkpọpụta aha ndị ga-anọchite anya ga-akụrụ ọnụ n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Disemba ebe ụbọchị e nyere ha ime ka ndị ọgba bọọlụ sonye n'ọzụzụ nkwado bụ na Mọnde 15 Disemba.

Kedụ mba na mba ga-achịpụ ya?

E kere mba iri abụọ (24) ga-esonye n'asọmpi ahụ ụzọ isii.

Moroko bụ ndị ga-ele mba ndị ọzọ ọbịa na Mali bụ ndị meriri n'afọ 2012 na Zambia na Komoros nọ n'Otu A.

Ebe isiagbọncha Ivori Kost na Kameruun bụ butere iko ahụ ugboro ise nọ n'Otu F.

Senegal na DR Congo nọ n'Otu D, ebe Ijipt ga-ezute Saụt Afrịka bụ ndị meiri n'asọmpi ahụ n'afọ 1996 na Yuganda,Tunisia,Tanzania nakwa Naịjirịa nọ n'Otu C.

Lee ka ha sịrị kwụrụ:

Otu A: Moroko, Mali, Zambia, Komoros.

Otu B: Ijipt, Saut Afrịka, Angola, Zimbabwe.

Otu C: Naijiria, Tunisia, Yuganda, Tanzania.

Otu D: Senegal, DR Congo, Bene, Botswana.

Otu E: Ọljiria, Bọkina Faso, Ekwitorial Gini, Sudan.

Otu F: Ivori Kost, Kemerun, Gabon, Mozambique.

Mba abụọ kachasị mee ọf

Mba abụọ kachasị mee ọfụma n'otu ndị a gụnyere mba anọ ndị gbara ndị atọ nke akara ha dị mma karịa ga-enwe ohere ịbanye n'agba ndị ọzọ na-eso bụ 'round of 16', 'agba anọ nke ikpeazụ (Quarter-finals), agba abụọ nke ikpeazụ (Semi- finals), ndị ga-agba onye atọ (thirdplace) nakwa agba nke ikpeazụ.

Kedụ ndị ga-agbara ndị?

Bryan Mbuemo nke Manchester United ga-agbara Kameruun

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Bryan Mbuemo nke Manchester United ga-agbara Kameruun
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Manchester United nwere ndị ọgba bọọlụ atọ a na-ele anya ga-esonye n'asọmpi ahụ; Bryan Mbuemo (Kameruun), Amad Diallo (Ivori Kost) na Noussair Mazraoui (Moroko).

Bournemouth nwere Amine Adli bụ onye a na-atụ anya ga-gbara Moroko.

Ụfọdụ mba gụnyere Naijiria, Oljiria, Bostwana, Senegal, Sudan, Tunisia, Uganda, Zambia na Zimbabwe ewepụtabeghị aha ndị ọgbabọọlụ ga-anọchiteanya ha n'asọmpi ahụ.

Lee ụfodụ mba wepụtarala ndị ga-agbara ha nakwa otu egwuregwu bọọlụ ha nọ na ya:

Angola

Ocheegoolu: Neblu (Primero Agosto), Hugo Marques (Petro de Luanda), Dominique (Etoile Carouge).

Ọgbaazụ: Rui Modesto (Udinese), Eddie Afonso (Petro de Luanda), To Carneiro (AS FAR), Nurio Fortuna (Volos FC), Pedro Bondo (Famalicao), David Carmo (Real Oviedo), Buatu (Gil Vicente), Gaspar (Lecce), Clinton Mata (Lyon).

Ọgbaaetiti: Beni Mukendi (Victoria SC), Show (Kocaelispor), Fredy (Bodrumspor), Maestro (Alanyaspor), Manuel Keliano (Akhmat Grozny), Mario Balburdia (Boluspor).

Ọgbaaihu: Zito Luvumbo (Cagliari), Manuel Benson (Swansea City), Milson (Crvena Zvezda), Chico Banza (Zamalek), Gelson Dala (Al Wakrah), Randy Nteka (Rayo Vallecano), Ary Papel (Al Akhdar), Mabululu (Al Ahli Tripoli), Mbala Nzola (Pisa), Zine (AEK Athens).

Bene

Ocheegoolu: Marcel Dandjinou (Kruger United), Saturnin Allagbe (FC Chauray), Serge Obassa (Remo Stars).

Ọgbanazụ: Attidjikou Samadou (Smouha), Charlemagne Azongnitode (AC Oulo), Rodrigue Fassinou (Coton Sport), David Kiki (FCSB), Abdoul Rachid Moumini (Sumgayit), Tamimou Ouorou (Unattached), Yohan Roche (Petrolul Ploiesti), Mohamed Tijani (Yverson Dport), Olivier Verdon (Ludogorets Razgrad).

Ọgbanetiti: Matteo Ahlinvi (Arsenal Tula), Mariano Ahouangbo (NK Olimpija), Gislain Ahoudo (AS Gabes), Sessi D'Almeida (Neftchi), Dodo Dokou (Leixoes), Hassane Imourane (Grasshoppers), Rodrigue Kossi (Hassania).

Ọgbanihu: Adam Akimey (Helsingborgs), Rodolfo Aloko (NK Kustosija), Romaric Amoussou (ASEC Mimosas), Jodel Dossou (Pays du Valois), Andreas Hountondji (Burnley), Steve Mounie (Alanyaspor), Junior Olaitan (Goztepe), Razack Rachidou (NK Kustosija), Felipe Santos (Araz-Nakhchivan), Olatoundji Tessilimi (SJK Seinajoki), Aiyegun Tosin (Lorient).

Kemerun

Ocheegoolu: Devis Epassy (Dinamo Bucharest), Simon Omossola (St Eloi Lupopo), Simon Ngapandouetnbu (Montpellier), Edouard Sombang (Colombe Du Dja).

Ọgbaazụ: Samuel Kotto (Gent), Gerzino Nyamsi (Lokomotiv Moscow), Jean-Charles Castelletto (Al Duhail), Nouhou Tolo (Seattle Sounders), Flavien Enzo Boyomo (Osasuna), Mahamadou Nagida (Rennes), Christopher Wooh (Spartak Moscow), Junior Tchamadeu (Stoke City), Darlin Yongwa (Lorient).

Ọgbaaetiti: Martin Ndzie (Rapid Vienna), Carlos Baleba (Brighton & Hove Albion), Arthur Avom (Lorient), Eric-Junior Dina Ebimbe (Brest), Brice Ambina (Valerenga), Jean Junior Onana (Genoa), Olivier Kemen (Istanbul Basaksehir).

Ọgbaaihu: Bryan Mbeumo (Manchester United), Christian Bassogog (Al Okhdood), Georges-Kevin N'koudou (Al Diriyah), Danny Namaso (Auxerre), Frank Magri (Toulouse), Karl Etta Eyong (Levante), Christian Kofane (Bayer Leverkusen), Patrick Soko (Almeria).

DR Kongo

Ocheegoolu: Timothy Fayulu (FC Noah), Lionel Mpasi (Le Havre), Matthieu Epolo (Standard Liege).

Ọgbaazụ: Aaron Wan-Bissaka (West Ham United), Gedeon Kalulu (Aris Limassol), Arthur Masuaku (Sunderland), Joris Kayembe (Genk), Rocky Bushiri (Hibernian), Axel Tuanzebe (Burnley), Chancel Mbemba (Lille), Steve Kapuadi (Legia Warsaw).

Ọgbaetiti: Noah Sadiki (Sunderland), Edo Kayembe (Watford), Samuel Moutoussamy (Atromitos), Charles Pickel (Espanyol), Ngal'ayel Mukau (Lille), Mario Stroeykens (Anderlecht), Theo Bongonda (Spartak Moscow), Michel-Ange Balikwisha (Celtic), Nathanael Mbuku (Montpellier), Brian Cipenga (Castellon).

Ọgbaaihu: Simon Banza (Al Jazira), Fiston Mayele (Pyramids), Samuel Essende (Augsburg), Meschack Elia (Alanyaspor), Cedric Bakambu (Real Betis).

Mozambik

Ocheegoolu: Ernan (Black Bulls), Ivane Urrubal (Ferroviario Nacala), Kimiss Zavala (Maritimo).

Ọgbaazụ: Bruno Langa (Pafos, Cyprus),, Oscar (UD Songo), Diogo Calila (Santa Clara), Nanani (UD Songo),Edmilson Dove (Al Quwa Al Jawiya), Reinildo Mandava (Sunderland), Mexer (Keciorengucu), Chamboco (Black Bulls), Nené (Abu Salim).

Ọgbaaetiti: Dominguez (UD Songo), Alfonso Amade (Dunfermline Athletic), Manuel Kambala (Polokwane City), Keyns Abdala (Chaves), Joao Bonde (Ferroviário da Beira), Guima (Zira FC).

Ọgbaaihu: Geny Catamo (Sporting Lisbon), Faizal Bangal (AC Mestre), Witi (Nacional), Gildo Vilanculos (Tadamon Sour), Chamito Alfandega (AC Viseu), Stanley Ratifo (Chemie Leipzig), Melque (UD Songo).

Saụt Afrịka

Ocheegoolu: Sipho Chaine (Orlando Pirates), Ricardo Goss (Siwelele), Ronwen Williams (Mamelodi Sundowns).

Ọgbaazụ: Samukele Kabini (Molde), Thabang Matuludi (Polokwane City), Mbekezeli Mbokazi (Orlando Pirates), Aubrey Modiba (Mamelodi Sundowns), Khuliso Mudau (Mamelodi Sundowns), Khulumani Ndamane (TS Galaxy), Siyabonga Ngezana (Steaua Bucharest), Nkosinathi Sibisi (Orlando Pirates), Tylon Smith (Queens Park Rangers).

Ọgbaaetiti: Bathusi Aubaas (Mamelodi Sundowns), Thalenthe Mbatha (Orlando Pirates), Teboho Mokoena (Mamelodi Sundowns), Sphephelo Sithole (Tondela), Sipho Mbule (Orlando Pirates).

Ọgbaaihu: Oswin Appollis (Orlando Pirates), Shandre Campbell (Club Brugge), Lyle Foster (Burnley), Evidence Makgopa (Orlando Pirates), Relebohile Mofokeng (Orlando Pirates), Elias Mokwana (Al Hazem), Tshepang Moremi (Orlando Pirates), Mohau Nkota (Al Ettifaq).

Kedụ ebe a ga-agba asọmpi ndị a?

Amaegwuregwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Amaegwuregwu Prince Moulay Abdellah dị na Rabat, Moroko

Amaegwuregwu 'Prince Moulay Abdellah Stadium' dị na Rabat bụ ebe a ga-agba asọmpi nke Otu Moroko so na ya nakwa agba nke Ikpeazụ.

Moroko tinyere nnukwu ego n'ịrụzi amaegwuregwu ha nwere maka asọmpi Afcon nke afọ 2025 ọbụladị dịka ha na-akwado iso Spen na Pọtụgal lee ọbịa n'asọmpi iko mbaụwa '2030 Fifa World Cup'.

A ga-eji amaegwuregwu itoolu dị n'obodo mepere emepe isii dị na Moroko gbaa asọmpi ahụ.

Amaegwuregwu anọ n'ime ndi a dị n'isiobodo Rabat.

Lee Amaegwuregwu ndị ahụ:

Prince Moulay Abdellah Stadium, Rabat (ọ ga-abali mmadụ 69,500)

Complexe Sportif Prince Moulay Abdellah Olympic Stadium, Rabat (ọ ga-abali mmadụ 21,000)

Complexe Sportif Prince Heritier Moulay El Hassan, Rabat (ọ ga-abai mmadụ 22,000)

Stade El Barid, Rabat (ọ ga-abali mmadụ 18,000)

Grande Stade d'Agadir, Agadir (ọ ga-abali mmadụ 45,480)

Complexe Sportif de Fes, Fes (ọ ga-abali mmadụ 45,000)

Grande Stade de Marrakech, Marrakech (ọ ga-abali mmadụ 45,240)

Stade Mohammed V, Casablanca (ọ ga-abali mmadụ 67,000)

Grande Stade de Tangier, Tangier (ọ ga-abali mmadụ 68,000)