Afcon 2023 Deaths: 'Ekirila asọmpị bọọlụ ma i nwee ọrịa ndị a ...- 'Cardiologist'

Osondu Nwoye na Cairo Ojougbo

Ebe foto si, Osondu Nwoye / Cairo Ojougbo

Dọkinta na-ahụ maka obi akọwaala ihe nwere ike ịkpata ọnwụ ndị ahụ a sịrị nwụrụ mgbe ha na-ekịrị asọmpị bọọlụ AFCON 2023 dị na etịtị Naịjirịa na Saụt Afrịka.

Naijiria na-Saụtị Afrịka chịbiri ya n'asọmpi ha sọrọ ụbọchị Wenezde ebe Naijiria ji penarịtị merie ndị Saụtị Afrịka were tozuo ịgba asọmpi ikpeazụ a ga-agba Ụbọchịụka.

Dkta David Oke kọwara na ọtụtụ na ndị ahụ nwere ịke inwe ọrịa ọbị mmapu, maọbụ ọrịa obi ha na amaghị na ha nwere.

“Ihe mere bu ha nwee nnukwu ujo na eme ọbara mgbali elu nke na etịwa ọbị maọbụ ọdị ọdịda”.

Oke gara n’ ịhụ kọwa na ndị dị ọtụa nwere ịke gbanarị ọnwụ na ọ bụlụ na nweta enyemaka ọsịsọ.

David Oke kwuru sị, “Nsọgbu bụ na ọtụtụ amaghị na ha enwere ọbara mgbalị elụ. Ha a ana aga ekịrị asọmpị bọọlụ.”

Ọ gara n' ihu kọwaa etuụ a ga-esi gbochie ọnwụ dị otu ahụ.

“Ndị mmadu kwesịrị ịmara ọnọdụ ahụ ịke ha. Ndị mmadu kwesịri ịhụ dọkịnta ha kwamgbe kwamgbe ma nyọchaa ahụ ha mara ọnọdụ ahụịke ha. Nke a ga-enyere aka igbochi ụdị ọnwụ dị otu a”

“Ozọ bụ ọ dịrị mfe, ndị mmadụ nwere ọnọdụ ahụike a kwesịri ịna-ekiri asọmpị bọọlụ mgbe a gbachara ya.”.

O nyere ndị mmadụ ndụmọdụ na ọbụru na ha nwe ọrịa ọbị ka ha na erị ọgwụ ha etụ ọkwesịrị, ma ha gbaa mbọ kwụsị ịkịrị asọmpị bọọlụ mgbe ana agba ya; kama ha kịrịe ya mgba agbasịrị ya.

Ndị nwụrụ n'ike dịka Naijiria zutere Saụt Afrịca

Dịka Naịjiria merịrị ndị Saụt Afrịka n' asọmpị ọkara ikpeazu n'Afcon 2023, akụkọ pụtara ndị nwụrụ n'ike mgbe ha na-ekiri asọmpi ahụ dị o pekata mpe mmadụ ise.

Asọmpị ahu kpụ ọkụ n' ọnụ nke kpara ọtụtụ jịri nwụọ oge ha na ekịlị ya. Ufọdụ na ịme ha nwuru mgbe a na agba asụwa-agbaa. Enwere onye nke nwuru mgbe ọ na etị mkpụ, ebe onye nke ọzọ nwụru mgbe akachara gọọlụ Naịjịrịa nyere ndị Saụt Afrịka.

Osondu Nwoye

Osondu Nwoye

Ebe foto si, Osondu Nwoye Foundation/Facebook

Otu ọgaranya a na-anụ aha ya bụ onye Anambra steeti a ma ama na mba Aịviri Kost bụ Osondu Nwoye nwuru mgbe ọ na-ekiri asọmpi Naịjịrịa na Saụt Afrịka.

Akụkọ kwuru na Osondu bụ Eze ndị Igbo n'Abijan tiri mkpu, daa tupu ọ nwụọ mgbe a kagbugburu goolu Victor Osihmen nyere ndị Saụt Afrịka.

Osondu Nwoye bu onye na-azụ ahịa ụgbọala na mba Aiviri Kost.

Otu onye maara ya bụ Austin Okolo kọwara Nwoye dịka onye inyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka na-amasị.

"Nwoke e ji imere ndi ukwu ma ndi nta ogo were mara. Onwu oke mmadu a bu nnekwu ihe iri uju nye obodo anyi bu Amanuke."

Cairo Ojougboh

Cairo Ojougboh

Ebe foto si, Cairo Ojougboh

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Cairo Ojougboh bụ onye ọzọ a sị nwụrụ dịka ọ na-ekiri asọmpi Naịjirịa na Saụt Afrịka.

Cairo Ojougboh bu onye otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC n' Asaba, Delta Steetị.

E kwuru na ọ bụ mgbe ogbubọọlụ(referree) nyere asawa-agbaa(penalty) n’ isi Naijiria ka “Cairo tirị mkpụ nwere daa, nwụọ”.

Ayuba Abdullah

Ayuba Abdullah onye bu bọsa na mahadụm dị na Kwara steetị nwuru na otu asọmpị ahụ.

Ayuba ka e kwuru na mgbe ọ na ekịrị bọọlụ ka ọ nwere ịhe mgbu, ndị mmadu eburu ya gaa na ụlọ-ọgwụ e be ọ nọ nwụọ.

“Ayuba kịrị asọmpị ahụ rụọ mgbe eruru na asawa-agbaa tupuu ọ nwee ịhe mgbu, eburu ya ga ụlọ-ọgwụ ebe ọ na nwụọ”

Mikail Osundiji

Mikail Osundiji di afọ ịrị anọ na atọ nwuru mgbe akachara gọọlụ Naịjịria nyere ndị Saụt Afrịka. E kwuru na Osundiji kuru ume oku mgbe akachara ya bu gọọlụ Victor nyere tụpụụ ọ nweleta ịsị ya ala nwere nwụọ na ebe ọ na ekịrị bọọlụ.

Samuel, onye ji otu afọ efe ala nna,

Samuel bu onye jị otu afọ na efe ala nna Naijirịa na Adamawa steetị. Samuel nwukwara mgbe ọ na ekịrị asọmpị ahu. Samuel bụ onye Kaduna Steetị na efe ala nna na Adamawa steetị.