Afcon 2023: A rọrọ m nrọ ka anyị meriri Asọmpị a

Lee ndị otu bọolu Naịjịra ka ha na-enwe anụlị, Ekong Troost so na ha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Lee ndị otu bọolu Naịjịra ka ha na-enwe anụlị, Ekong Troost so na ha

Onyeisi otu bọọlụ Super Eagles Naịjirịa bụ Troost-Ekong kwuru na i meri Asọmpị AFCON nke 2023 ga-abụru ya na Naịjirịa niile ihe anụrị.

Ugo Naịjirịa ji penaliti merie Bafana Bafana Saụt Afrịka nke nyere ha ohere ịgba bọọlụ nke ikpeazu a ga-agba ụbọchịụka n' Abidjan.

Naịjirịa na Aivịrị Kost ga-ezute onwe ha n'asọmpi nke ikpeazu n'Elekere Asatọ nke abali (20:00GMT) nke abalị 11 nke ọnwa Febụwarị,afọ 2024.

Naịjirịa ruru agba ikpeazu n'AFCON kemgbe 2013.

Troost-Ekong gwara BBC Sports sị, ''A na-ebuzo rọọ nrọ maka ihe dị etu a, tupu o mee.''

"Ahụla m ya ugboro ole na ole. Ihe m na-eche bụ ka m nọrọ mgbe ọ ga-abịa na- mmezu n'Ụbọchịụka''.

Naịjirịa esoghị na ndị gbara ọfụma na mbido asọmpị a .

Ha gbakwara ọnyụpa na bọọlụ ndị ha gbara na mbido asọmpi itozu maka ịko mba ụwa nke 2026.

Etu o si gbata kwụrụ, Naịjiria so na ndị kachasị gba bọọlụ ọfụma n'asọmpị a dịka a gbapụcharala ndị burula iko a ugboro asaa dịka Senegal, Moroko na Ijipt.

Onye nchịkọta otu bọọlụ Naịjirịa bụ Jose Peseiro kwuru na o teela okwukwe ya dị na ndị nke ya.

Onye nchịkọta 'Super Eagles' gwara BBC Sport sị,"Mgbe m natara ọrụ a ka kwuru na m ga-emerị asọmpị AFCON.''

"A maghị m na o nwere ndị kwetara ihe m na-ekwu mana o teela m kwetara na ya.''

"Ọ kabeghị nwee ihe anyị meriri, anyị chọrọ imeri n'Afcon''

Bassey toro etu egwu boolu Naijria si eme dịka asọmpi biri

Victor Osimhen chere na ya enyerela Naịjirịa aka merie site na inye goolu mana ọmeghị etua hu, a kagburu ya ma nye Saut Afrikad

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Victor Osimhen chere na ya enyerela Naịjirịa aka merie site na inye goolu mana ọmeghị etua hu, a kagburu ya ma nye Saut Afrikad
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mgbe ọ dịka Naịjirịa a chọrọ imeri Saụt Afrịka n'ime Nkeji 90 ka Ekong ji penariti nye goolu n'agba nke abụọ mana os ighị etu ahụ mee.

Victor Osimhen chere na ya emezuorola ya Naịjirịa goolu abụọ ka o foro obere oge ka a gbacha mana ụwa adịghị ka e si che.

Atụghịarịrị ma nye penaliti n'aha Bafana Bafana site n'ihe onyonyo e kiriri gosiri.

Peseiro kwuru sị, ''Nkagbu a kagburu goolu anyi bụ ihe kwesiri.''.

''Mana n'obi anyị, anyị chere na e megidere anyị maka na o mere ka anyị nọrọ na 1 - 1 tupu amalite ịgba penariti''

Ọ fọrọ nwantịị ka Khuliso Mudau bụ onye bọọlụ Bafana Bafana nye Saụt Afrịka mmeri n'agba nke abụọ n'oge ntụkwasa e nyere ha mana o meghị etu ahụ.

Calvin Bassey gwara BBC Sport sị, ''Nke a kpọrọ-akpọ, n'obi m anyị gosiri ụwa ihe anyị bụ n'ezie.''

''Ihe o gosiri bụ na anyị zuru "kaemee', anyị kwesiri iga n'iru ma nwe okwukwe n'ime onwe anyị''.

''Saụt Afrịka bụ otu bọọlụ chịkọtara onwe ha nke ọma, o bu ihe mgbagọjuanya na anyị ji penaliti merie ndị dị otu ahụ.''

''Ekele dịrị ndị niile katara obi gbaa penariti ahụ."

"Ọ dịghị ofele ị gba penariti n'oge obi mkolopu anyị nọ n'ime ya mgbe ahụ.''

Onye ocheegoolu bụ Stanley Nwabali ritere ọ kachasị gba bọọlụ n'asọmpi nke taa site n'iche bọolụ Mokoena na Envidence Makgopa, nke mere na goolu Kelechi nyere Naịjirịa mmerị.

''Ituruugo dịka ọ kachasị gba bọolụ n'egwuregwu taa ma nwete ọhiere i gba bọọlụ nke ikpeazu n'Asọmpị a bụụrụ m ekpere a zara-aza.'' Nwabali bụ onye na-agbaara otu bọọlụ Saụt Afrịka kwuru.

Ekele diri ndị ndu anyị, mgbe ọ bụla erụrụ na penaliti, ha na-edum ọfụma''

Saụt Afrịka a naghị enweta nkwado na-aka ndị be ha

Saụt Afrịka eriteghị ọkwa ịgba Asọmpị Afcon 2021 mechara rute ọkwa osote bọọlụ ikpeazu n'Asọmpị Afcon 2023.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Saụt Afrịka na-eriteghị ọkwa ị gba Asọmpị Afcon 2021 mechara rite ọkwa osote bọọlụ ikpeazu n'Asọmpị Afcon 2023.

Ka e merichara ha site na penaliti, Saụt Afrika laghachiri jee chee echiche ndụ ha.

Bafana Bafana turugo dịka ndị nke nọ n'ọkwa nke abụọ n'afọ abụọ gara-aga mana n'afọ 2000 ha pụtara dịka ndị nke atọ.

Bọọlụ ha na Ugo Naịjirịa gbara na Wenezde bụ izizi ha na-agba osote egwuruegwu ikpeazu kemgbe afọ iri abụọ na anọ .

Onye otu bọọlụ ha bụ Aubrey Modiba gwara BBC Sport Afrịka ''Anyi gbara mbọ na mbido Asọmpị a rụọ n'njedebe''

''Anyị gbara mbọ sata gọọlụ enyere anyị ma hụ na-enyere oge ntụkwasa n'agbanye na anyị enweteghị ọhiere imezụ ihe anyị chere''

''Ọbụ eziokwu na obi adighị anyị mma, mana onweghị ihe anyị ga-eme maka na penaliti abụghị ihe mmadụ ga-akata ihe ga-eme, n'hi nke a anyi anaghị ata onwe anyị ụta''

''Anyị esila na nke a mụrụ akọ, anyị ga-akwadọ maka Asọmpị ndị ọzo di n'niru''

Modiba na-a gbaara 'Mamelodi Sundowns' dị na 'Pretoria', ha meriri Asọmpị ''African Football League'' bụrụkwa otu zụlitere ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ Saụt Afrịka.

Modiba gbara afọ 28 nwere okwukwe na bọolụ ha gbara n'Aịvịrị Kost ga-akwalite mmuo ndị obodo ha n'ihe gbasara agba m bọọlụ.

''Ndị na-bụghị ndị Saụt Afrịka nwere ntụkwasa obi n'anyị maka na ha hụru etu anyị si a gba mana abata na baanyị , anyị a naghị enweta nkwado dị etu a, ọ maala anyị.'' o kwuru.

Ya mere anyị jiri gbambọ luo ọgụ dị na ya, maka na anyị ma na ndị baanyị enweghị ntụkwasaobi n'anyị''.

''Mana anyi nwere okwukwe n'ime onwe anyị , anyi ma na ụwa na-ekiri bọọlụ anyị na-agba, ha hụrụ etu anyị si agbalị, enwere m okwukwe n'otu bọọlụ a, a ma m na ihe dị mma ga-esi na ya pụta otu ubọchị''

Mara na Saụt Afrịka na Kongo ga-achipụya maka ọkwa nke atọ n'ụbochị Satọde n'Abidjan n'elekere asatọ (20: 00 GMT)