Mmadụ 38 a tọọrọ na Kwara Steeti alakwurula ezinaụlọ ha

Ndị ụka CAC ahụ a tọọrọ lakwuuru ezinaụlọ n'ụbọchị Tuzde Disemba, 2, 2025

Ebe foto si, Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7

Mmadụ 38 ahụ ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọụka Christ Apostolic Church (CAC) dị n'obodo Eruku n'okpuru ọchịchị Ekiti dị na Kwara Steeti n'abalị Tuzde 18 Nọvemba, 2025, alakwurula ezinaụlọ ha dị iche iche.

Akwụkwọozi odeakwụkwọ mgbasaozi onyeisioche okpuru ọchịchị Ekiti bụ Dada Sunda, wepụtara kwuru na ndị ahụ a tọọrọ lakwuuru ezinaụlọ ha dịka Onyeisiala Bola Tinubu, Gọvanọ Mallam AbdulRahman AbdulRasaq na ndị ọrụ nchekwa rụrụ ọrụ iji hụ ha a gbapụtara ha n'aka ndị ntọ ahụ tọọrọ ha.

Dada Sunday kwuru na obi aṅụrị juputara n'obodo Eruku oge ndị ahụ batara n'ụbọchị Tuzde Disemba 2, 2025.

Akwụkwọozi ahụ kwuru na Gọvanọ AbdulRasaq enyefeela ndị ahụ n'aka onyeisioche okpuru ọchịchị Ekiti Awelewa Olawale Gabriel

Awelewa toro mbọ gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa gbara iji zọpụta ndị ahụ.

A tọhapụla ndị ahụ a tọrọ n'ụlọụka n'Eruku Kwara steeti - Tinubu

Bola Ahmed Tinubu bụ Onyeisiala Naịjirịa.

Ebe foto si, President Bola Ahmed Tinubu / X

Nkọwa foto, Bola Ahmed Tinubu

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Almed Tinubu kwuru na a tọhapụla ndị ahụ a tọrọ n'ụlọụka n'Eruku Kwara steeti ọnụ ọgụgụ ha ruru mmadụ iri atọ na itoolu.

Onyeisiala Tinubu ji akara X soshal mịdịa ya n'ụbọchị Sonde, Nọvemba 23 depụta nke a.

Tinubu chetere etu ya si hara ịga ọgbakọ G20 a na-eme na mba Saụt Afrịka kwuru na ọ bụ "ka ya nweike ihazi ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa".

N'okwu ya "ka m mee ka o doo anya, agaghị m ezuike, ụmụ Naịjirịa niile, steeti ọbụla nwereikike ịnweta ezi nchekwa. Anyị ga na-echekwa obodo a nakwa ụmụ amaala anyị".

O ji ohere ahụ kwenkwa na anya ya dị n'ihe gbasara nchekwa obodo niile na mpaghara niile na Naịjirịa.

Ihe ụlọụka CAC kwuru

Ndị ụka CAC na ndị ojiegbe enwebeghị nkwekọrịta maka ego mgbapụta a ga-akwụ ha maka CAC sị na ijeri naira ha kpọga aha dị oke ọnụ.

Ebe foto si, screenshot

Nkọwa foto, N'izuka a Naịjirịa ahụla oke mwakpo na-aka ndị ojigebe nke gunyere ịtọrọ ụmụakwụkwọ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ụlọụka 'Christ Apostolic Church (CAC) ekwuola na ndị ekperima ahụ tọọrọ ndị ụka ha dị n'okpuruọchịchị Ekiti nke Kwara steeti sị ka a kwụọ ha ego mgbapụta ruru otu ijeri naịra tupu ha atọhapụ ha.

Ọdeakwụkwọ ụka ahụ Agbabiaka Michael mere ka o doo anya na ndị ojiegebe kpọrọ ha n'abalị Tọzde 20 Nọvemba, 2025.

O kwuru na ndị a si ka a kwụọ ego dị otu narị nde naira kwa otu onye n'ime mmadụ niile ha tọọrọ.

"O bụ eziokwu na ha kpọrọ anyị ihe dịka elekere asatọ nke abalị ka anyị kwụọ ha ụgwọ mgbapụta ka ha tọhapụ ndị ha ji".

"Ha sị ka anyị kwụọ ha otu narị nde naira n'otu n'otu n'isi ndị a mana anyị gwara ha na-anyị ejighị ụdịrị ego ahụ ha na-akpọ aha.

Ebe o si etu a dị, ndị ojiegbe mechara kwuo na ha ga-akpọghachị ha n'ekwentị ka ha nwe nkwekọrịta ego mgbapụta ha ga-akwụ tupu ndị otu ha enwere onwe ha.

Michael sị na ha agwala ndị uweojii etu ha na ndị ojiegbe ahụ si kpaa nkata.

Mana ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojji na Kwara steeti sị na ha enwetebeghị ozi gbasara ịkwụ ego mgbapụta ahụ.

"Anyị amaghị ihe gbasara ego mgbapụta ọbụla".

Falz, Mr Marcaroni, ndị ọzọ sị Tinubu gbaa arụkwaghịm n'ihi mwakpo mere na Kwara, Kebbi Steeti

Bukola Saraki, Funke Akindele na Folarin Falana a ma ama dịka Falz

Ebe foto si, Falz, Mr Marcaroni, Funk Akindele Saraki/X

Nkọwa foto, Bukola Saraki, Funke Akindele na Folarin Falana a ma ama dịka Falz so na ndị gbarụrụ ihu maka ndakpọ nchekwa

Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa agbarụọla ihu banyere mkpamkpa ndị omekome kpara na mpaghara Ọdịda Anyanwụ nakwa Ugwu Awusa na nsonso a ma kpọọ oku ka Onyeisiala Bola Tinubu gbaa arụkwaghịm.

Otu n'ime ha bụ otiegwu Folarin Falana, a ma nke ọma dịka 'Falz', kwuru na nnu aghaala ofe n'okwu nchekwa ụmu Naịjirịa ma kpọọ oku ka Tinubu gbaa arụkwaghịm.

Falz jụrụ sị, "Mmadụ ole ka a ga-atọrọ ma gbuo maka ego? Kedụ ndụ ole a ga atụfu tupu i dee akwụkwọ arụkwaghịm n'ihi amaghị ọrụ gị?"

N'otu aka ahụ, onye na-eme ejije a ma ama bụ Debo Adedayo, a ma dịka Mr Macaroni kpọkwara oku ka Onyeisiala Tibubu tinye akwụkwọ arụkwaghịm.

Onye bụbụ Onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki kọwara ọdachi ahụ tara isi mmadụ ka 'ihe mwute' ma kpọọ gọọmentị oku ka ha gbaa arụkwaghịm.

"Anụrụ m akụko obi mgbawa na ndị ekperima wakporo obodo m na Kwara Steeti, merụọ ọtụtụ ahụ, ma tọrọ ụfọdụ. Ọ bụ akụkọ mgbawa obi."

N'aka nke ọzọ, onye na-eme ejije Nollywood bụ Funke Akindele sịrị na mkpamkpa ahụ bụ "ihe anyammiri".

"Etetara m ụra hụ ihe onyonyoo ebe a na-awakpo ụlọụka na Kwara. Nke a bụ ihe obi mgbawa. Ebere m akwa oge m hụrụ agadị nwaanyị ụkwụ adịghị ka ọ na-agba ọsọ ịzọta ndụ ya mana o nwelighị ike."

Ndị ekperima wakporo ụlọụka CAC na Kwara steeti gbuo mmadụ abụọ, merụọ ọtụtụ ahụ ma tọọrọ ndị ọzọ n'ụbọchị Tuzde, 18 Novemba, 2025.

N'aka nke ọzọ, a tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị 25 na Kebbi Steeti mana abụọ n'ime ha mechara gbalahụ ndị ntọrị.

Debo Adedayo, a ma dịka Mr Macaroni

Ebe foto si, Mr Macaroni/X

Nkọwa foto, Debo Adedayo, a ma dịka Mr Macaroni kpọkwara oku ka Onyeisiala Tibubu tinye akwụkwọ arụkwaghịm

Mana ụfọdụ ụmụNaijiria akwadoghị oku arụkwaghịm ahụ a na-akpọ onyeisiala Tinubu.

Otu onye n'ime kpọrọ onwe ya @Amazingelejo jụrụ sị," Ndị na-akpo okụ ka Tinubu gbaa arụkwaghịm ozigbo, o were unụanya na o mee ihe ụnụ chọrọ na ọ bụ Shetima ga-abụ onyeisiala?"

Ọ gara n'ihu kpoo oku ka e nwee ọgbakọ iji kpaa etu aga esi jikọọ maọbụ kesaa Naijiria n'udo.

Etu ndị ojiegbe si wakpo, gbuo ma tọrọ ndị ụka CAC na Kwara Steeti

Aha onyonyo, 'Ihe m hụrụ oge ndị ojiegbe wakporo ụlọụka anyị'

Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe wakporo ụlọụka dị n'obodo Eruku dị na Kwara Steeti dịka ndị ụka Kraịst na-enwe ọgbakọ na mgbede Tuzde 18 Nọvamba 2025.

Ndị ojiegbe ahụ gburu mmadụ abụọ ma tọrọ ọtụtụ ndị ọzọ.

Ndị obodo hụrụ oge ihe ahụ mere kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ụlọụka Christ Apostolic Church dị n'Oke Isegun n'okpuru ọchịchị Ekiti oge ndị ụka na-aka ụka mgbede dịka ndị ojiegbe ahụ malitekwara ịgba egbe agharaghara.

Akwụkwọozi ndị uweojii wepụtara kwuru na a hụrụ mmadụ abụọ mgbọ egbe merụrụ nnukwu ahụ nakwa otu onye ọrụ nchekwa obodo merụrụ ahụ e bụgara ụlọọgwụ ECWA Hospital Eruku iji nweta nleta ahụike.

E kwuru na e zigala ndị ọrụ nchekwa dị iche iche ka ha malite ime nnyocha ma nwụchie ndị ojiegbe ahụ kpara mkpamkpa ahụ e kwuru na ha gbabara n'ime ọhịa.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia e kwuru na o si na kamera CCTV ụlọụka ahụ, gosiri oge ndị ụlọụka ahụ na-agba ọsọ ndụ ha ngwangwa ndị ojiegbe ahụ wakporo ha.

Akụkọ kwuru na mmadụ abụọ n'ime ndị ojiegbe ahụ kpuchiri ihu ha ka a ghara ịma ndị ha bụ.

Foto ime ụlọụka CAC ahụ ndị ojiegbe wakporo
Foto ime ụlọụka CAC ahụ ndị ojiegbe wakporo

Ka ọ dị ugbua, ọnọdụ ọgbaaghara dị n'obodo Eruku bụ obodo ha na Kogi steeti nwere okeala.

Mwakpo na-abịa dịka ndị ojiegbe wakporo ma tọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị iri abụọ na Kebbi Steeti n'ime awa iri abụọ na anọ gara aga.

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa akatọọla mwakpo ndị a na-eme n'ụlọụka, ụlọakwụkwọ nakwa n'okporoụzọ n'obodo dị iche iche na Naịjirịa.

Cheta na ndị ojiegbe na-akpa mkpamkpa na Naịja Steeti na Kogi Steeti emeela mwakpo na Kwara steeti n'oge gara aga.

Kemgbe afọ 2020, ndị ojiegbe atọrọla ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa ebe ndị ọrụ nchekwa dị iche iche na-agba mbọ ibu agha megide ndị ojiegbe a na-akpa mkpamkpa na mpaghara ugwu Naịjirịa.

Onye omekome bu egbe

Ebe foto si, Getty Images

Gịnị ka aka na-achị steeti ahụ kwuru?

Aka na-achị steeti ahụ bụ AbdulRahman AbdulRazaq, akatọọla mwakpo ahụ ma kpọọ oku ka e mee ka nchekwa dị n'ogbe ahụ.

"Gọvanọ AbdulRazaq chọrọ ka e wete ndị ọrụ nchekwa ọzọ ozugbo iji kwado usoro nchekwa dị ugbua na mpaghara ahụ," ka odeakwụkwọ mgbasa ozi ya bụ Rafiu Ajakaye kwuru n'ozi ya.

AbdulRazaq gosipụtara ọmịiko nye ezinụlọ ndị ihe metụtara na ndị ụka Christ Apostolic Church, na-ekwe nkwa maka nkwado gọọmenti nakwa ịga n'ihu na-echekwa ndụ na ihe onwunwe na steeti ahụ.

O tokwara Onyeisiala Bola Tinubu maka ibuga ndịagha narị itoolu ọzọ na steeti Kwara n'oge na-adịbeghị anya, na-ekwu na ọchịchị ya "nwere obi ike na ndịagha ndị ọzọ ga-enye ndị bi na Kwara, nchekwa zuru oke" na udo na-adịgide adịgide