A tọhapụla ụmụakwụkwọ ụmụnwaayị ndị a tọọrọ na Kebbi Steeti

Ebe foto si, Yushau Shuaib/Facebook
Akụkọ kwuru na a tọhapụla ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Government Girls Comprehensive Senior Secondary School (GGCSS) dị na Maga n'okpuru ọchịchị Danko/Wasagu Kebbi Steeti a tọọrọ n'izuụka gara aga.
E kwuru na ụmụakwụkwọ ndị ahụ nweere onwe site na mbọ ụlọọrụ National Security Adviser (ONSA) nakwa ụlọọrụ Department of State Services (DSS) gbara.
E kwuru na ọ bụ usoro bekee kpọrọ 'non-kinetic approach' ka e ji rụọ ọrụ iji tọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ.
Ozi kwuru na gọọmenti kwenyere na usoro 'non-kinetic approach' a bụ nke gụnyere mkparịtaụka na inwe nkwekọrịta, bụ usoro kacha mma iji mee ka ndị a tọọrọ nwere onwe ha.
Cheta na ọtụtụ mmadụ katọrọ ọtịtọ a tọọrọ ụmụakwụkwọ ahụ ma kpọọ oku ka ọchịagha ndịagha na ndị ọrụ ya kee aji n'ume ma mee ka a tọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ.
Onyeisiala Bola Tinubu nabtara ntọhapụ ụmụakwụkwọ ahụ ma too mbọ ndị ọrụ nchekwa gbara iji mee ka ụmụakwụkwọ ahụ nwere onwe ha.
Gọọmenti Kebbi steeti enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ niile na steeti ahụ

Ebe foto si, Screenshot, Getty Images
Gọọmenti Kebbi steeti enyela ntuziaka ka e mechie ụlọakwụkwọ sekọndịrị ọhanaeze na nke ndị nkịtị niile, tinyekwara ụlọakwụkwọ ndị dị elu e nwere na steeti ahụ.
Nke a dị n'ozi Kọmịshọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ dị elu bụ Alhaji Issa Abubakar-Tunga na Kọmịshọna na-ahụ maka agụmaakwụkwọ praịmarị na sekọndarị bụ Halima Bande jikọtara aka wepụta n'isi obodo Kebbi steeti bụ Birnin Kebbi.
Kọmịshọna abụọ ahụ kwuru na mmechi ụlọakwụkwọ niile dị na steeti ahụ bịara dị oke mkpa n'isochi mwakpo ndị a na-eme aghara aghara n'ụfọdụ akụkụ steeti ahụ.
Dịka ndị kọmịshọna ahụ siri kwuo, ụlọakwụkwọ ndị dị elu ọnọdụ a ga-emetụta gụnyere: Kebbi State Polytechnic Dakingari, Abdullahi Fodio University of Science and Technology Aliero, College of Health Sciences and Technology Jega, Adamu Augie College of Education Argungu, nakwa School of Remedial Studies Yauri.
Ka o sina dị, ndị kọmịshọna ahụ kwuru na ụlọakwụkwọ ọnọdụ a na-agaghị emetụta bụ naanị College of Nursing Sciences and Midwifery dị na Birnin Kebbi.
Mụ na nwunye m nọ n'oke iru uju kemgbe a tọọrọ nwa anyị nwaanyị - Nna nwataakwụkwọ a tọọrọ na Kebbi Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Nne na nna ụmụakwụkwọ karịrị iri abụọ ndị ohi tọọrọ n'ụlọakwụkwọ Government Girls Comprehensive Secondary School dị na Maga Kebbi Steeti, nọ n'oke iru uju kemgbe ndị ojiegbe tọọrọ ụmụaka ha n'ụbọchị Mọnde 17 Nọvemba, 2025.
E kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo ebe obibi ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ dị n'obodo Maga dị n'okpuru ọchịchị Danko/Wasagu dị na Kebbi Steeti ma tọrọ ọtụtụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị.
Otu onye nna BBC gbara ajụjụ ọnụ, kọwara na ezinaụlọ ya nọ n'oke iru uju kemgbe ha nwetara ozi maka njinji ahụ.
Onye nna ahụ anyị na-achọghị ịkpọ aha ya, kwuru na ọ bụ oge o mechara ekpere n'ụtụtụ ka ọ nụrụ maka akụkọ ahụ.
"Anyị nọ n'ụlọ ekpere mosque dịka anyị mechara ekpere ụtụtụ oge anyị nwetara oku ekwentị onye ndu Imam bụ onye gwara anyị na ndị ojiegbe tọọrọ ụmụakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ."

Ebe foto si, Mustapha Ibrahim/BBC
Onye nna ahụ kwuru na o tinyere ụmụ ya nwaanyị abụọ n'ụlọakwụkwọ ahụ n'afọ gara aga.
O kwuru na "Nwa m nwaanyị nke ọzọ gwara m na ha na-ehi ụra oge ndị ojiegbe ahụ batara n'ebe obibi ha, o kwuru na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ibe ya gbabara n'ụlọ mposi ebe ndị ọzọ gbabanyere n'okpuru akwa ha iji chekwaa onwe ha".
O kwuru na ndị omekome ahụ kwuru na ha ga-agbagbu ha ma ọ bụrụ na ha apụtaghị ebe ahụ ha zoro onwe ha.
O kwuru na ọ bụ oge nwanne ya meghere ọnụụzọ ụlọ mposi ahụ ka ndị ojiegbe ahụ kpọọrọ ya na ụmụakwụkọ ndị ọzọ pụọ.
Onye nna ahụ kwuru na nwunye ya nọkwa n'oke iru uju ugbua ma kwuo na nwa ha bụ nwa ya nwaanyị mbụ. O kọwara na ha amaghị ọnọdụ nwa ha nwaanyị nọ ugbua n'aka ndị omekome ahụ.
Nwoke ahụ kwuru na ezinaụlọ ya enwebeghị ike ihi ụra n'ihi ọnọdụ ọgbaaghara njinji tinyere ha n'ime ya.
Osote onyeisiala Kashim Shettima ga-aga njem nleta ebe a tọọrọ ụmụakwụkwọ na Kebbi Steeti

Ebe foto si, Kashim Shettima/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisiala Bola Tinubu ezigala osote ya bụ Kashim Shettima ka ọ gaa njem nleta na Kebbi Steeti bụ ebe a tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị karịrị iri abụọ n'ụlọakwụkwọ Government Girls Comprehensive Secondary School dị na Maga, n'ụbọchị Monde 17 Nọvamba 2025.
Kashim Shettima ga-aga steeti ahụ taa bụ Wenezde 19 Nọvamba 2025, iji egosi Gọọmentị Kebbi ọmịiko ma kasie nne na nna na ndị nlekọta ụmụaka a tọọrọ n'ụlọakwụkwọ sekọndrị ahụ obi dịka a na-agba mbọ ka a tọhapụ ha ngwangwa.
Ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga, kwupụtara nke a na Tuzde.
N'okwu Onyeisiala Tinubu "Obi adịghị ya mma etu ndị omekome obi tara mmiri si mebie agụmakwụkwọ ụmụaka nwaanyị aka ha dị ọcha. Enyeela m ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha mee ihe ngwa ngwa ma kpọghachi ụmụagbọghọ ahụ na steeti Kebbi."
Onyeisiala Tinubu toro aka na-achị Kebbi steeti bụ Nasir Idris, maka mbọ ọ gbara iji gbochie ntọrọ mmadụ, ebe ọ katọrọ mmebi nchekwa nke mere ka a tọọrọ ụmụaka ahụ n'ụlọakwụkwọ ha dị na Maga.
Ọ gwara obodo niile dị n'ofe Naịjirịa, ọkachasị n'ebe ndị nwere nnukwu ihe ize ndụ, ka ha enyere ndị nchekwa aka site na-inye ozi bara uru.
"Ndị ọrụ nchekwa anyị agaghị enwe ike ichekwa anyị ma ọ bụrụ na obodo ndị dị n'ogbe ahụ ejikọghị aka. Ana m agba ndị ndu obodo na ụmụafọ ha ume, ọkachasị n'ebe ndị nwere nsogbu nchekwa, ka ha kesaa ozi ọgụgụ isi bara uru. Ma nwee mmekọrịta dị oke mkpa n'ọgụ anyị na-alụso enweghị nchekwa," ka Onyeisiala kwuru.
Ụmụakwụkwọ abụọ gbapụrụ oge ndị ohi tọọrọ ụmụaka 25 n'ụlọakwukwọ dị na Kebbi Steeti

Ebe foto si, Mustapha Ibrahim/BBC
Ndị isi obodo na mpaghara ugwu ọdịda anyanwụ Naịjirịa amalitela ịchọ ihe karịrị ụmụakwụkwọ ịrị abụọ atọrọla n'ụlọakwụkwọ ha n'ụbọchị Monde 17 Nọvamba 2025.
Ndị uweojii sị na ndị mwakpo ahụ gara n'ụlọakwụkwọ Government Girls Comprehensive Secondary School dị na Maga, Kebbi Steeti.
E mechara chọpụta n'ụmụakwụkwọ abụọ n'ime iri abụọ na ise gbapụrụ ọsọ ndụ oge ndị ohi ahụ wakporo ụlọakwụkwọ ha.

Ebe foto si, Mustapha Ibrahim/BBC
Dịka a na-eru uju maka osote onyeisi ụlọakwụkwọ ndị ntọ gbagburu, onye nche merụrụ nnukwu ahụ mgbe ndị ohi ahụ wakporo ụlọakwụkwọ Government Girls Comprehensive Secondary School dị na Maga, Kebbi Steeti anwụọla, nke a emeela ya mmadụ abụọ ndị ohi ahụ gburu.
Ihe a bụ mwakpo ọzọ na-eme n'ụlọakwụkwọ na Naịjirịa kemgbe Maachị 2024, mgbe a wakporo ihe karịrị ụmụakwụkwọ narị abụọ n'otu ụlọakwụkwọ dị na Kuriga, Kaduna steeti.
E kwuru na ndị ekperima ahụ jiegbe egbuola osote onyeisi ụlọakwụkwọ ma tọọrọ opekatampe ụmụakwụkwọ iri abụọ na ise na-agụ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ụmụnwaanyị dị na Kebbi steeti, dịka ndị uweojii siri kwuo.
Cheta na ndị ekperima ahụ wakporo ụlọakwụkwọ Government Girls Comprehensive Secondary School dị na Maga, Kebbi Steeti n' ebe Elekere anọ ụtụtụ n'ụbọchị Monde.
Chetakwa na ndị omekome ahụ na ndi uweojii nọ ọrụ kwarịtara mgbọ tupu ndị ekperima ahụ wụọ aja ngwuru ụlọakwụkwọ ahụ nwụchie ụmụakwụkwọ nọ n'ebe obibi ụmụakwụkwọ, dịke ozi ndị uweojii siri kwuo.
Ndị obodo ahụ gwara BBC News na ndị ekperima ahụ kpọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ahụ baa ọhịa.

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị ka gọọmenti Naịjirịa kwuru maka nke a?
Gọọmentị etiti Naịjirịa ekwuola na ọ "nwere nnukwu nchegbu" gbasara ntọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị na Government Girls Secondary School, Maga, na Kebbi Steeti, ma kwe nkwa ime ihe doro anya iji mee ka a tọhapụ ụmụaka ahụ.
N'okwu ya n'ụbọchị Mọnde, Minista ozi na nhazi mba bụ Mohammed Idris, kwuru na ndị ọchịchị "na-ekere oke n'ihe mgbu nke ezinụlọ ndị ọnọdụ ahụ metụtara" ma na-agba mbọ ngwangwa ịzọpụta ụmụaka ndị ahụ.
O kwukwara na Onyeisiala Bola Tinubu "adịghị agbanwe agbanwe na nkwa ya ichekwa onye ọ bụla nọ na Naịjirịa, ọkachasị ụmụakwụkwọ."
Minista ahụ gara n'ihu kọwara na ha enyeela ndị ọrụ nchekwa "iwu doro anya" ịchọta ụmụaka ndị ahụ a tọọrọ ma hụ na ekpere ndị mere ihe ahụ ikpe.
"Gọọmenti etiti agaghị akwụsị ruo mgbe e mezuru ebumnuche a," ka o kwuru.
Idris gbakwunyere na Naịjirịa na ndị otu mpaghara - gụnyere ECOWAS, otu mba Afrịka na Multinational Joint Task Force - na-arụkọ ọrụ nke ọma iji mebie otu ndị omekome na-agafe okeala ma na-eme ka nchekwa sie ike n'okeala.

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Facebook
Onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar ekwupụtala nwute ya banyere nwakpo ụlọakwụkwọ ụmụnwaanyị na Kebbi Steeti.
O kwuru na nke a bụkwa ihe ọzọ na-echetara anyị maka ajọ ọnọdụ nchekwa dị na Naịjirịa ugbua.
"Naịjirịa enweghị ike ịga n'ihu n'ụzọ a. Ana m akpọku Gọọmentị etiti ka ha nyochaa ma mee ka usoro nchekwa ya sie ike, tinye ndị ọrụ zuru oke n'ofe obodo ndị na-adịghị ike, ma mee ka ọrụ ọgụgụ isi sikwuo ike. Ụmụafọ anyị kwesịrị inwe nchekwa, ugwu na udo," ka o kwuru.
Ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị awakporo n'oge gara aga na Naịjirịa

N'afọ 2014, ndị Boko Haram tọọrọ ụmụaka Chibok n'ebe a tọọrọ ụmụakwụkwọ ụmụnwanyị dị narị abụọ na iri asaa na isii (276).
N'afọ 2018, ndị Boko Haram tọọrọ ụmụnwaanyị mmadụ otu narị na iri (110) n'ụlọakwụkwọ dị na Yobe Steeti.
N'afọ 2020, a tọọrọ ihe karịrị ụmụakwụkwọ nwoke narị atọ n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị dị na Kankara na Katsina Steeti.
N'afọ 2021, a tọọrọ ihe karịrị ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị narị atọ n'ụlọakwụkwọ obibi dị na Jangebe, na Zamfara Steeti.
N'ọnwa Maachị n'afọ 2024, a tọọrọ ihe ruru ụmụakwụkwọ narị atọ n'ụlọakwụkwọ dị na Kaduna Steeti.








