O nweghị onye m naara ala ya n'ike na Ngor-Okpala - Ebuka Obi

Aha onyonyo, O nweghị onye m naara ala ya n'ike na Ngor-Okpala - Ebuka Obi
O nweghị onye m naara ala ya n'ike na Ngor-Okpala - Ebuka Obi
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Reporter and Video Journalist

Onye ozioma a ma ama bụ Ebuka Obi bụ onye isi ụlọ ekpere "Zion Ministry," Legọs,ekwuola na o nweghi mgbe ya jiri were aka ike nara ndị Ngor-Okpala dị n'Imo Steeti ala ha.

O kwuru na akụkọ ahụ na-efeghari maka ya na soshal midia bụ aka ọrụ ndị ihe ọma na-asọ nsọ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo were, Obi kọwaara na ya so usoro iwu obodo ahụ nakwa iwu gọọmenti Imo steeti kwadoro oge ọ zụrụ ala ahụ.

Cheta na ndị ntorobịa obodo ahụ mere ngaghrịiwe n'oge gara aga maka ya bụ ala ma kwuo na ọ bụ ala ha.

Obi mere ka o doo anya na gọọmenti Imo Steeti na ndị Eze ise si obodo ahụ nyere ya nkwado ma nabata Zion Ministry oge ọ chọrọ ịzụ ala ahụ nke ha kọwara na ọ ga-eweta mmepe obodo.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo were, Obi kọwaara anyị na ya so usoro iwu obodo ahụ nakwa iwu gọọmenti Imo steeti kwadoro oge ọ zụrụ ala ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị nani maka ekpere ka o jiri bata obodo Ngor-okpala, kama na ya nwere olileanya ịrụ ihe dị iche iche gụnyere ụlọakwụkwọ praịmarị, sekọndiri nakwa mahadum, ụlọọrụ na-emepụta Candle, ụlọọrụ na-arụpụta mmiri ọṅụṅụ, ụlọ obibi nakwa ọtụtụ ihe ga-eweta mmepe obodo.

Evangelist Ebuka Obi kọwakwara na ya arụọla ulọọgwụ ebe a n'eleta ndị agadị na ụmụaka nne ha tụhapụrụ n'efu na Mgbirichi dị n'Imo steeti.

O kwuru na ọ rụkwara ebe a na-agwọ ndị nwere ọrịa isi n'Aguleri Anambra steeti.