Trump agbaala BBC akwụkwọ n'ụlọikpe nke ọnụego ya bụ ijeri dọla ise maka ebubo imetọ aha ya
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agbaala BBC akwụkwọ n'ụlọikpe nke ọnụego ya bụ ijeri dọla ise ($5bn) maka ịrụgharị okwu o kwuru n'ụbọchị Jenụwarị 6 2021 bụ nke ha wepụtara n'ihe onyonyon Panorama.
Trump boro ụlọọrụ mgbasaozi a ebubo imetọ aha ya nakwa ịda iwu n'achị azụmaahịa dịka akwụkwọ ọ gbara n'ụlọikpe dị na Florida si kwuo.
BBC rịọrọ Trump mgbaghara n'ọnwa gara aga, mana ha jụrụ ịkwụ ya ụgwọ iti aka n'obi ma kwuo na "o nweghi ihe gosiri na e metọrọ aha ya".
Ndị ọkaiwu Trump boro BBC ebubo "ịkpachara anya metọọ aha ya, ma tụọ asị ghọgbuo ndị mmadụ site n'ịrụgharị okwu ya". BBC enyebeghi ọsịsa banyere akwụkwọ a gbara ha n'ụlọikpe.
Trump kwuru n'ọnwa gara aga na o nwere atụmatụ ịkpụpụ BBC n'ụlọikpe maka ihe onyonyo ahụ, nke gosiri na mba Briten tupu e mee ntuliaka mba Amerịka n'afọ 2024.
"Eche m na m ga-eme nke a," Trump gwara ndị ntaakụkọ maka atụmatụ ya. "Ha ghọgburu m, ha gbanwere okwu si m n'ọnụ pụta,"
N'okwu o kwuru n'ụbọchị 6 Jenụwarị 2021 tupu e mee ngagharịiwe n'ụlọ nzukọ 'Capitol, Trump gwara ọha: "Anyị ga-aga too ndị sịnetọ anyị na ndị omeiwu ụmụnwoke na ụmụnwaanyị."
Ihe karịrị nkeji iri ise n'okwu ahụ, o kwuru: Anyị ga-alụ ọgụ. Anyị alụsi ọgụ ike."
Mana ihe onyonyo Panorama gosiri mgbe o kwuru: Anyị ga-aga n'ụlọomeiwu Capitol...Aga m eso gị nọrọ ebe ahụ. Anyị ga-alụ ọgụ. Anyị ga-alụsi ọgụ ike."
BBC kwetere n'ezie na a kpara ihe onyonyo ahụ aka nke "a ghọtara dịka ọ kpọrọ oku ka e mee ọgbaghara", mana ha jụrụ na o nweghi ihe dịka imetọ aha ya.
N'ọnwa Nọvemba, ozi kepu kepu si na BBC gosiri ka ha si katọọ nrụgharị okwu Trump nke mere onyeisi ụlọọrụ BBC bụ Tim Davie na onyeisi ntaakụkọ ya bụ Deborah Turness jiri gbaa arụkwaghịm n'ọrụ.
Mgbe Trụmp ṅụrụ iyi ịkpụpụ BBC n'ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-akpụpụ ụlọọrụ mgbasaozi BBC n'ụlọikpe maka ịjụ ịkwụ ya ego iti aka n'obi n'ihi etu ha si chapụ ozi ọ gbasara n'oyonyo 'panaroma'
Mgbe Onyeisiala Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu dịka ọ na-abanye ụgbọelụ 'Air Force One' n'ụbọchị Fraịde, o kwuru na o nwereike malite ikpe ka BBC kwụọ ya otu ijeri dọla [£759m] na ijeri dọla ise ($5bn) n'izuụka na-abịa.
Na-agbanyeghị na ụlọọrụ mgbasaozi BBC arịọla Trump mgbaghara ma kwuo na ha agaghị akwụ ya ụgwọ itiaka n'obi, Trump sị na ọ ga-akpụpụ ha n'ụlọikpe ka ha "ghara ịkpa ụdịrị agwa ahụ ọzọ megide onye ọzọ"
O kwuru na ya na Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer enwebeghi mkparịtaụka ọbụla gbasara nsogbu a mana ọ na-atụ anya ịkpọ ya n'ekwenti.
"Echere m na m ga-eme ya. Ha ghọgburu m. Ha gbanwere okwu ndị si n'ọnụ m pụta."
"Ọ bụrụ na i meghị ya, ị gaghị egbochi ya ime ọzọ nakwa ndị ọzọ."
BBC rịọrọ Trump mgbaghara ma jụ ịkwụ ụgwọ itiaka n'obi

Ebe foto si, Reuters / AFP via Getty Images
Ụlọọrụ mgbasaozi BBC rịọrọ Donald Trump mgbaghara maka etu ha si jụụ na ha agaghị akwụ ego iti aka n'obi maka ichabi okwu o kwuru n'ihe onyonyo 'Panorama' ha wepụtara mana ha dịka o siri chọọ.
Ụlọọrụ mgbasaozi ahụ kwuru na nchabi ahụ "mere ka ọ dị ka Trump a kpọrọ oku kpọmkwem ka e mee tigbu-zogbuo" ma kwee nkwa na ha agaghị egosikwa ihe onyonyo ahụ e gosiri n'afọ 2024 ọzọ.
Ndị ọkaiwu Trump majara BBC si na ha ga-akpụpụ ụlọrụ ahụ ụlọikpe ka ha kwụọ ego dị otu ijeri dọla belụsọ n'ụlọọrụ ahụ e kwuru na ihe ha kwuru na ha ekwuzikwa ma tie ya aka n'obi.
Odeakwụkwọ na-ahụ maka omenala BBC bụ Lisa Nandy gwara 'BBC Breakfast' na ya nwere obi isi ike na BBC ghọtara ụdị ihe ha mere ma kwuo na ọrụ ya bụ ihụ na a na-eme ihe dịka o kwesịrị.
Ihe mere Trump ji sị na ya ga-agba BBC akwụkwọ ọnụego ya dị otu ijeri dọla

Ebe foto si, Screegrab
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-agba ụlọmgbasaozi BBC akwụkwọ ọnụego ya dị otu ijeri dọla($1Bn) maka etu ha si chapụ ozi ọ gbasara ọn'abalị isii nke ọnwa Jenụwarị.
N'akwụkwọozi nke ndị ọkaiwu Trump zigaara BBC, Trump chọrọ ka ha kwụsị ihe mmeme BBC na-eme n'ikuku a kpọrọ 'Panorama' tupu abalị 14 nke ọnwa Novemba 2025, sị na 'ozi ha bụ "ụgha ma na-emebi aha".
Nke a na-abịa dịka Onyeisioche BBC bụ Samir Shah rịóchara mgbaghara maka etu BBC siri chabie ozi Trump gbasara ma kwuo na BBC na-eche ihe ha ga-eme maka ya bụ okwu.
Onyeisi BBC (Director General) bụ Tim Davie nakwa onyeisi na-ahụ maka Akụkọ (News) bụ Deborah Turness gbara arụkwaghịm ụbochị Sọnde 9 Nọvemba, 2025 dịka akwụkwọ ozi e dere n'ime BBC katọrọ ihe emume Panorama nke e mere maka Onyeisiala Amerịka hipụrụ ama.
N'akwụkwọ ahụ nke Michael Prescott bụbụ onye ndụmọdụ BBC dere, o katọrọ etu ihe emume Panorama siri chabie ma jikọta ihe Trump kwuru nke mere ka ọ dị ka ọ bụ Trump kpalitere ngagharịiwere e mere na Capitol Hill na Jenụwarị afọ 2021.

Ebe foto si, PA
N'akwụkwọozi nke Shah degaara kọmiti ndị omeiwu na-ahụ maka Omenala, Mgbasaozi nakwa egwuregwu, Shah kwuru na etu e siri chabie ihe Trump "mere ka ọ dịka A kporo oku tigbuo-zogbuo kpomkwem".
Ọ gara n'ihu, "Nke a bụghị eziokwu bụ sị na o nweghị ihe BBC mere maka nsogbu a.
Mana ọ kwuru na mkparịtaụka ọzọ na ụlọmgbasaozi BBC enweghị ndị ha kwunyere iche.












