Ihe Wole Soyinka gwara BBC banyere ihe kpatara Amerịka ji napụ ya akwụkwọ ikike 'visa'

Ebe foto si, BBC/Getty Images
Onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Wole Soyinka ekwuola na nnapụ Amerka napụrụ ya akwkwụkwọ ikike ịbabata maọbụ pụọ na mba ahụ bụ n'ihi nkatọ ọ na-akatọ Ọchịchị Donald Trump na-ezogh ọnụ banyere ebe ọ kwụ n'okwu ndị mbịarambịara n'Amerịka.
Na nkata ya na BBC Africa nwere na nsonso a, Soyinka kọwara Trump sị, "Ọ bụ onye ọchịchị aka ike."
"Ị ga ahụ ya n'etu o si emeso onye ọbụla ọ kpọrọ asị."
Soyinka bụ onye a ma maka nkatọ ọ na-akatọ atụmatụ Trump.
O sịrị, " Gaa lee ya, ekwuru m ya, sị na nwoke ahụ bata n'ọchịchị, ihe mbụ ọ ga-eme bụ ịkagbu akwụkwọ ikike onye mbịarambịara ịghọ nwaamaala Amerịka(green card.)"
Soyinka dọkara akwụkwọ ikike mbịarambịara ịbụ nwaamala nke ya n'afọ 2016 iji gosi iwe ya, kama ọ chọọ ịga Amerịka, o tinye akwụkwọ ikike mbata na ọpụpụ nke nwa mgbenta.
" Ekwuru m na m agaghị eche ka a gwa m agwa sị m bịa ka anyị gbagharịa gị ajụjụ ọnụ maọbụ si ebe a pụọ!"
"Achọghị m ka achụpụ m, ọkara m mma na mchụrụ onwe n'ihi a ọ ga-aka nye m ugwu."
"Ka ọ banyechara n'ọkwa ọchịchị, enwetara m akwụkwọozi n'aka ụlọọrụ IRS, nke a bụ ihe m tụrụ anya ya."








