Ihe asatọ ndị agbụrụ ọzọ kachasị jiri mara ndị Igbo na nke bu eziokwu

Ebe foto si, @Igbankwunigeria
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Ndị Igbo bụ ndị na-asụ asụsụ Igbo bụ ndị e nwere ike ịhụ na steeti ise dị n'Ọwụwa Anyanwụ; Abịa, Anambara, Ebonyi, Enugwu na Imo steeti.
Ha nọkwa na mpaghara ụfọdụ na Delta, Rivas, Benụwe, Kogi, Edo nakwa ebe ndị ọzọ.
Mana ebe ọbụla ha nọ, ndị agbụrụ ndị ọzọ nwere ihe ndị ha jikara atụnyere ha n'agwa, ejije nakwa omenala.
Anyị jụrụ ndị mmadụ ma ndị Igbo na ndị agbụrụ ọzọ ihe ha na-anụkarị maka ndị Igbo, lee ụfọdụ ihe ndị ha rụtụrụ aka nakwa ihe anyị chọpụtara maka ya:
1. Ndị Igbo hụrụ ego n'anya nke ukwu

Ebe foto si, @Igbankwunigeria
Ihe bụ ihe mbụ ị ga-anụ maka ndị Igbo na mpaghara dị iche iche na Naijiria.
Nke ahụ bụ n'ama, a batakwa n'ụlọ, ọtụtụ ndị Igbo na-ekwukwa "Igbo ahụka ego n'anya."
Nke bụ eziokwu: Okammuta nkụzi Igbo na mahadum Legọs bụ Chigozie Nnabuihe sị na ya bụ okwu bụ"mkparị" n'ihi na o nweghị agbụrụ ọbụla kpọrọ ego asị.
Ọ sị na ndị Igbo kama ịrịọ arịrịọ nwere ike "ịma mmiri, maa anwụ iji kpata ego" .
"Onye Igbo bụ onye e ji ịgba mbọ mara. Ọ na-agba mbọ ịkpata nke ọ ga-eri, nke ọga-eji nyere nne na nna ya na ọha izugbe aka."
"Ọchọ-nke-ya-enwe-iro bụ ihea e ji enye Igbo mkparị ahụ."
2. Ndị Igbo nwere nka azụmahịa

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ọzọ ọtụtụ ndị mara ndị Igbo bụ azụmahịa.
Ha na-ekwu na ụmụ Igbo chị ọkụ n'azụmahịa.
Ọ na-agba ndị mba ọzọ gharịị etu onye Igbo nwere ike ịbata obodo na enweghị ihe ọbụla karịa obere ngwaahịa mana e nye ya oge ọ tụtụjuo akpa ya.
Ọtụtụ na-eji ya ama ndị Igbo njakịrị na onye Igbo nwere ike iresị ndị Eskimo akụ mmiri igwe.
Nke bụ Eziokwu: Ịzụ na ire ahịa mara ndị Igbo ka ego mara Ojukwu.
Nke mere ọ bu ha bu ọka ibe n'Ahịa Ọnịcha, Arịrịa Aba, Mgbuka Nnewi, Nkwo Igbo, Ogbete Enugwu, Alaba dgz.

Nka azụmahia esorola Igbo pụọ ala Igbo gawa mpaghara ndị ọzọ na Naijiria nakwa ofesi.
I legharịa anya, n'otụtụ ebe, ụfọdụ ndị Igbo na-azụ ahịa e sila na inweta ọdọahịa ebe ha na-akwụ ụgwọ, tiwaa ịzụrụ ebe ọ na-ere ahịa maọbụ iwu ahịa.
Na Legọs, ahịa dịka Idumota, Ladipo, ebe a na-ere mkpụka na International Trade Fair nke a makwa dịka "ASPAMDA" (Auto Spare Parts & Machinery Dealers Association) bụ ọgbọ ahịa ndị Igbo juputara.

Ebe foto si, Undone Rice/Twitter
3. Ndị Igbo anaghị ekwe ka nwaanyị ha lụọ ọrụ Bekee

Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala
Ụfọdụ ndị abụghị ndị Igbo na-ahụta ndị igbo dịka ndị anaghị ekwe ka nwunye ha chakee n'ọrụ bekee n'ihi egwu na nwaanyị ria n'ọkwa n'ọrụ Bekee ọ ga-akarị di ya maọbụ ọ ga na-agba n'ezi.
Nke bụ eziokwu: Ọkammụta Nnabuihe kwuru na ọ bụghị eziokwu.
Ọkaiwụ Dorothy Oleka kwuru na, "Ngụkọ goziri na Ndị Igbo kachasị nwee ụmụnwaanyị nọ na di na-arụ ọrụ Bekee".
4. Ụmụnwaanyị ha na-agbakarị ajị n'obi nakwa n'iru ma nwee ji n'ụkwụ ha

Ebe foto si, Iwaria
Ụfọdụ ndị abụghị ndị Igbo na-ekwu na ụmụnwaanyị Igbo na-enwekarị ajị n'ahụ ha ọkachasị n'ihu nakwa n'obi ma na-enwekwa 'mba ji' n'ọkpa.
Nke bụ eziokwu: Otu dọkịta ahụike ụmụnwaanyị bụ Dọkịta Joseph Akinde kwuru na ọ bụ eziokwu mana ọ gbara ama na ọ bụghị naanị ụmụnwaanyị Igbo, na ndị si mpaghara Cross Rivers nakwa ụfọdị ndị Yoroba na-enwekwa oke ajị.
Akinde, onye nwee Ụlọọgwụ 'Living Spring Hospital'dị na Legọs sị; "Ihe mere ụfọdụ ji enwe ajị bụ na ha nwere mmiriahụ (hormone) nke nwoke bụ 'protesterone' rinne n'ahụ ha."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
5. Ndị Igbo na-amụ oke ụmụ

Ebe foto si, Getty Images
Nke bụ eziokwu: Ọkammụta Chigozie Nnabuife kwuru na "ndị Igbo huru nwa n'anya karịa ihe ọbụla ọzọ bụ eziokwu."
"N'ala Igbo, a na-alụ nwaanyị n'ala Igbo, ihe ana-ajụ bụ "ha na-amụkwa ụmụ"
Ọ kọwara na mpaghara Mbaise, a lụụ nwaanyị ọ mụọ ụmụ iri, e gburo ya ewu ukwu.
"Ndị Igbo kwere n'ụwa ebighi ebi. A mụọ gị, ịmụta onye ọzọ."
Mana ọ gara n'ihu kọwaa na ọnọdụ akụnaụba obodo, agbanwewala nke a.
6. Ndi Igbo bụ ndị oke amamihe

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ na-ekwu na ndị Igbo bụ ndị anaghị eme anya ụra n'ihe abụla ihe.
Nke a na-abụkarị okwu akọmọnụ maọbụ mkparị, ụfọdụ na-ekwu na ndị Igbo bụ ndị oke amamihe, na ha na-egosikarị na ha bụ ndị ọnọ na ndo ahụ ọnwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, chimamanda_adichie/ Instagram
Nke bụ eziokwu : Anaghị egbuchi afọ ime aka, ndị Igbo bụ ndị Chukwu ji amamihe gozie.
Ka ọ dị be oke , ka ọ dị be ọgịnị. Agbụrụ ọbụla nwere ndị nwere amamihe nakwa akọ na ụche nwekwa ndị aghụghọ na ndị efulefu.
Ọtụtụ ndị Igbo bi mpaghara dị iche iche bụ ndị a na-anụ aha ha maka ịbụ ọkaibe n'agụmakwụkwọ, mmepụta ihe nka na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Mmadụ dịka Chinua Achebe lara mmụọ, Ngozi-Okonjo Iweala, Chimamanda Adichie, Philip Emegwali, wdgz. bụ ụmụafọ Igbo Chukwuokike jiri amamihe chọọ mma.
7. Ego nwaanyị ha na-adị nnukwu elu

Ebe foto si, Mazi Nwonwu
Ihe ọzọ a na-ekwu maka ndị Igbo bụ na ha na-ana oke ọnụ ahịa n'ịlụ nwaanyị,
Nke bụ eziokwu: Ọnụ nwaanyị dị iche site n'otu obodo Igbo nke a gaa n' obodo ọzọ.
Ebe ụfọdụ sị mpagha ụfọdụ dịka Mbaise, Owere bụ ndị e ji imefu nnukwu ego na-agbaka isi were mara , ụfọdụ ndị ọzọ nwere nkwenye na ọ bụ ebe aka ruru nwaanyị ka ọ na-ekonye di ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
8. O nweghị mba Igbo anọghị
Ụfọdụ na-eji ya ekwu okwu sị, ịbata na mba, ịhụghị onye Igbo, gbawa ka ụkwụ gị ha.
Nke bụ eziokwu: Ndị Igbo bụ ndị njem. Ha gbasara ka akwụkwọ ụkpaka n'ụwa dum dịka ha na-achọ ebe azụmahịa, nka, mmụta na ọganihu.
Ọtụtụ ka na-achakeekwa ka ọnwa ebe ọbụla ha nọ.
Nkwenye ndị Igbo bụ na njegharị ka nwa mkpị jị mụta ịsọkali imi elu.















