Jollof Wars: Osikapa Ghana ekweghị m merie n'asompi Jọlọf - Osinri Nigeria

Ebe foto si, Promasidor Ghana
Abass Adebukola bụ onye osiite Naijiria sonyere n'asọmpi 'Onga Jollof Battle' nke afọ 2019, ekwuola na ya bu n'obi na ọ bụ ya ga-emeri n'asọmpi ahụ.
Adebukola a ma dịka "Chef Turay" kwuru na ọ bụ osikapa mba Gana e nyere ya sie wụrụ ya n'ala".
Adebukola kwuru na ihe ogbo ya onye nke Gana jiri merie ya bụ na o nwere ohere iji osikapa nke ya bịa asọmpi ahụ, ebe ya onwe ya enweghị ohere isi Naijiria weta ihe ọbụla.
"Nsogbu dapụtara abụghị naanị osikapa, ọ gaara aka mma ma na eji m osikapa Naijiria were gaa. Osikapa m nwetara bụ nke Gana nke m weere dịka m siri hụ ya n'ihi na ọ bụghị ihe m chọrọ."
Adebukola kọwara na ikuku menyụrụ ọkụ o ji esi ya bụ nri ugboro ugboro nke mere na jọlọf ya egheghị etu kwesịrị."
Adebukola bụ onye meriri mmadụ 13 ndị ọzọ n'asompi 'Onga Jollof Battle' nke e mere na Naịjirịa, nke mere ka ọ gaa ịnọchite Naijiria na mba Gana n'asọmpi mba na mba.
'Sị sọgharia asọmpi ahụ'

Ebe foto si, Promasidor Ghana
Chef Turay chọrọ ka ndị haziri asọmpi jọlọf ahụ hiwegharịa ya ma nye ya ohere ka ya were osikapa Naịjiria nakwa ngwanri Naijiria were bịa asọmpi ahụ.
Ọ gwara BBC sị, "Ana m atụ anya ka a sọgharịa asọmpi ahụ. Ama m na jọlọf Naijiria ka nke Gana mma mana onye mụ na ya sọkọrọ mpi nwere ihe o jiri karịa m."
E nwere asọmpi 'Onga Jollof Battle' n'Akra dị na mba Gana, ebe ndị osinri abụọ nke si Gana na nke si Naijiria sọkọtara mpi iji mata mba ka esi jọlọf dị ụtọ.
Mpụtara asọmpi a gosiri na Gana nwetara 95%, ebe Naijiria nwetara 75%.
Sika Mortoo bụ nwaafọ Gana bụ onye meriri n'asọmpi nke afọ a, ritere puku dọla abụọ ($2000), ebe Adebukola nke Naijiria ritere otu puku dọla ($1000).
Mmadụ atọ ndị lere nri ma nye mkpebi n'asọmpi ahụ si Gana, Saụt Afrịka na Naijiria, kwadoro jọlọf nke Gana.
Jọlọf bụ nri a ma ama n'ọdịda anyanwụ Afrịka nke e ji osikapa, tomanto, ose na ngwanri ndị ọzọ esi.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Lee ihe nkiri ga-amasi gị:













