Food poisoning: Etu ị ga-eji gbanarị nsị nri

Ebe foto si, Getty Images
"Nsị ọnụ abụchaghị ihe mmadụ na erite maka na mmadu tunyere ya ọgwụ na nrị," Dọkinta Eghosa Emasuen gwara BBC.
Na nkọwa ya, ọkachasi ebe ndi mmadu si adata nsị ọnụ bụ site na nrị ha riri, ebe nsị dị n'ime ya bụ ihe nje butere na nri ahụ.
Emasuen kọwara na nje dị icheiche na-efesa nrị, mana ọ si na ọ bụ nke akpọrọ e coli bụ nke kachasị emepụta nsị nrị.
"Ọ bụ nje bacterium Clostridium botulinum na emepụta botulinum toxin - ihe na-ebute nsị nri."
O kwukwara na ihe a so nsị kachasị sie ike n'ụwa a.

Ebe foto si, Getty Images
Na nkọwa Dọkinta Emasuen; ọ bụ mmekọrịta nje na nri na emepụta nsi a na-enye mmadụ nsogbu.
Ọ sị na nje a nyụpụtacha nsị a, mmadụ rie nri ọ di na ya, onwereike nye mmadụ obele maọbụ nnukwute ọrịa, ma nke nwereike gbuo mmadụ.
Unu anụala ya, nsị dị a nri bụ ihe nje na-ebute.
Ọtụtu oge ọ bughị ndị kpọrọ gi asị na-etinye ya.

Ebe foto si, Getty Images
Lee nu etu esi egbochi ya:
1) Saacha aka gị ọfụma
Dọkinta Emasuen kwuru na nje na-abakarị nri site na adịghị ọcha. Yabụ, onye na edowe onwe ya ọcha site n'ịsacha aka ọfụma ma emetụcha ihe dị ụnyị aka.
Yabụ, ịgacha mposi, saa aka gị tupu ịmetụ nri aka.
2) Saacha nri gị
Ọtụtụ nri, ọkachasị ndi nwere okuko, na-enwe nche nke na-egbochi nje ịba ha n'ime ha.
Mana, ọ na-aka mma ịsacha ha ọfụma tupu itinye ha n'ọnụ.
Nke a pụtara na ịsacha nri bụ ihe dị ezigbote mkpa ma ichọọ igbochi nsị nri.
3) Nyocha ihe ọbula ịchọro iri tupu irie ya.
Emasuen si na ọtụtụ mmadụ na-ebute nsị nri maka etu esi hazie nri ahụ, ọkachasị mgbe nri ahụ ka dị oyi oyi.
Okwuru na nri nsị dị nwereike na-esi ajọ usi, maọbụ koo eko ma ọ bụrụ na ọ di n'iko.
Ya bụ, jiri anya na imi gị nyere onwe gị aka.
4) Sie nri ọfụma
Nke bụ ihe Dọkinta Emasuen si bụ egwu eji maka igbochi nje and nsị nri ha na-ebute.
"Ọkụ na-egbu ma mebie ọnọdụ nje na nsi ha, nke mere na isi nri bụ ihe kachasị egbochi ya," Emasuen kwuru.









