Kedụ ihe i kwesịrị iri n'ogogo ndụ gị dị iche iche?

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ahụ mmadụ na-achọ na-agbanwe dịka anyị na-etolite. Nke a pụtara na nri anyị kwesịrị iri na-agbanwe mgbe niile n'ogogo ndụ anyị niile.
Ndị ọkachamara kwuru na site n'oge mmadụ bụ nwa ọhụrụ ruo n'oge ị kara nka, ihe ị na-eri nwere nnukwu mmetụta n'ahụike gị, nkea pụtara na nri nwereike ibutere gị ọrịa.
N'afọ 2025, otu ndị nchọpụta nyochara ihe ndekọ ahụike nke mmadụ 63,000 a mụrụ n'UK n'agbata afọ 1951 na 1956 - mgbe a na-ebelata etu ndị mmadụ si eri shuga.
Ha chọpụtara na ụmụaka ndị na-eri obere shuga n'ime afọ nne ha nakwa n'ime otu puku ụbọchị mbụ nke ndụ ha nwere obere ohere ruru pasentị 20 ibute ọrịa obi mgbe ha toro; ebe pasentị 25 n'ime ha nwere obere ohere inwe nkpụchi obi; 31 pasentị nwere obere ohere ịrịa ọrịa strok karịa ụmụaka e kwere ka ha na-ere ihe ụtọ mgbe niile.
Ndị ọkachamara kwuru na iri oke nri dị ụtọ ya na shuga adịghị mma n'ahụ n'agbanyeghị afọ ole anyị dị. Lee ihe anyị kwesịrị iri ebe a:
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ihe ụmụaka kwesịrị iri
Ahụ ụmụaka ọhụrụ chọrọ ọtụtụ abụba dị na mmiri ara ehi, mana nri dị otu ahụ a gaghị a dị mma maka onye dị afọ iri abụọ na iri atọ.
Dịka Federica Amati bụ ọkammụta na sayensị nri na Imperial College London dị n'UK si kwuo, ụmụaka chọrọ oke ike nke pụtara na ha chọrọ nri ndị nwere ihe ndị na-edozi ahụ.
O kwuru na ụmụaka chọkwara iron, iodine, na ọtụtụ vitamin iji kwado ahụike, wulite ụbụrụ na uto akwara.
Nke a pụtara na ahụ ụmụaka chọrọ ọtụtụ mkpụrụosisi na akwụkwọ nri, nri ọka, agwa na abụba dị mma gụnyere mkpụrụ nri, yana obere nri ndị a rụrụ arụ.
Ọkammụta Amati kwukwara na ụmụaka chọkwara calcium na vitamin D nke a na-enweta site n'anyanwụ na nri dịka azụ na akwa.
O kwuru na vitamin D bụ ihe ndị kacha mkpa n'ogogo ndụ ụmụaka iji wulite uto ọkpụkpụ ha, ma belata ohere inwe ọrịa osteoporosis na ọ dị n'ihu.
Ndị dị afọ iri na ụma na afọ iri abụọ

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka Amati si kwuo, oge ndụ a bụ mgbe ọkpụkpụ na akwara tochara. Ọ bụkwa mgbe mmadụ na-eji ọtụtụ awa na-amụ ihe, na-arụ ọrụ, na-akpakọrịta ụka - ihe ndị a niile na-eme ka ahụ mmadụ chọkwuo nri.
"Uto na-ebelata n'ime afọ iri abụọ, mana ọ ka bụ afọ dị mkpa maka ibi ndụ ga-emetụta ahụike obi na ụbụrụ anyị. Ọtụtụ ntọala maka ọrịa obi na-amalite n'ime afọ a, mana ihe mgbaama ya na-apụta ihe mgbe oge ụfọdụ gasịrị."
"N'oge anyị dị afọ iri na ụma, ahụ anyị na-achọ ọtụtụ ihe oriri karịa ndị toro eto. Nke a gụnyere calcium, vitamin D na iron - nke dị mkpa karịsịa maka ụmụagbọghọ na-ahụ nsọ ha. Ahụ ha chọkwara Vitamin B, nri nwere protin," Amati na-ekwu.
O kwuru na ahụ ụmụaka ndị na-eto eto chọrọ ọtụtụ mkpụrụosisi, akwụkwọ nri, ọka, agwa, mkpụrụ nrị na obere nrị arụrụ arụ, obere azụ, obere mmiri ara ehi na anụ ọkụkọ.
Nnyocha na-egosikwa na nri nwere folic acid gụnyere akwụkwọ nri, broccoli na chickpeas nwereike inye aka na ọmụmụ nwa n'ahụ ụmụnwaanyị.
Ndị nọ n'afọ etiti
Dịka ọkammụta Elizabeth Williams nke na-ahụ maka nri mmadụ na Mahadum Sheffield dị n'UK si kwuo, n'etiti afọ ndụ anyị, anyị kwesịrị ịmalite iche echiche banyere nri anyị maka ahụike anyị n'oge agadi.
Williams kwuru na estrogen dị n'ahụ ụmụnwaanyị ndị ka na-amụ nwa, na-arụ ọrụ iji belata agụụ ebe ụmụnwaanyị ndị anaghị ahụ nsọ ha na-enwe karị oke ibu, ọrịa obi, na ọrịa shuga ụdị nke abụọ.
Mana e nwereike ibelata ihe ize ndụ a site na-iri nri na-edozi ahụ.
Nnyocha gosiri na nri dị mma nke nwere mkpụrụosisi, akwụkwọ nri, ọka, obere abụba, agwa na mmiri ara ehi nwere obere abụba na-enyeaka maka mmadụ ịka nka dị mma.
"Ka ụmụnwaanyị na-eru afọ iri anọ na iri ise, ihe abụọ dị oke mkpa n'ihe gbasara nri: ahụike obi na ahụike ọkpụkpụ na akwara," ka Amati na-ekwu.
Amati kwuru na abụba sitere na Omega 3 - karịsịa ụdị si n'azụ nwere mmanụ dịka mackerel na salmon - na-enyere aka n'ihi na ha na-ebelata ihe ndị nwereike ibute ọrịa obi.
O kwuru na ndị nọ n'ogogo a kwesịrị ibelata iri nrị arụrụ arụ.
Ndụ okenye
Mgbe anyị bụrụ okenye, ahụ anyị na-agbanwe, ike anyị na-achọ na-ebelata, yabụ anyị kwesịrị iri obere kalori. Agbanyeghị, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na anyị na-enweta ihe oriri zuru oke iji hụ na ọkpụkpụ na akwara anyị na-enwete ike.
Dịka Williams si kwuo, ihe abụọ dị mkpa anyị kwesịrị ilekwasị anya n'oge agadi bụ calcium na vitamin D. Ndị agadi na-enwetaghị calcium maọbụ vitamin D zuru oke nwere ike ibute ọrịa osteoporosis na nkwarụ adịghị ike.
Ahụ ndị agadi chọrọ protin, calcium sina mmiri ara ehi, chiiz, yogọt, sardines, tofu na spinach ebe nri ndị bara ụba na vitamin D gụnyere azụ, akwa na nri ndị ọzọ.
Ndị okenye kwesịrị ị na-eri abụba dị mma nke sitere na mmanụ oliv, ube bekee, mkpụrụ na mmanụ azụ, yana vitamin na mineral. Ahụ ha chọkwara nri nwere fibre gụnyere akwụkwọ nri na mkpụrụosisi.
Nnyocha gosiri na 'supplement' sitere n'okike nke na-akwalite uto nke 'microorganisms' bara uru na ndụ ndị okenye ebe ụfọdụ n'ime ha chọkwara 'supplement' nwere vitamin D.




























