Kedụ uru ose bara n'ahụ mmadụ?

Ụdị ose abụọ na-acha uhie uhie nọ n'ime efere abụọ. Otu dị ogologo ebe nke ọzọ bụ ose na-afụ afụ.
    • Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Legọs
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ose bụ ngwa e ji esi nri na-abịa n'ụdị dị iche iche, jupụta n'akụrụngwa dị iche iche ma na-afụ ụfụ na nrị.

Ose bụkwa ngwa e ji enyere ụtọ nri aka.

E nwere ose ojii, ose odo, ose uhie, ose na-afụ ụfụ Bekee kpọrọ 'chilli' nakwa ose na-adighị afụ ụfụ a kpọrọ 'non chilli'.

Ndị nchọcha kwuru na ụfọdụ ndị bi n'ọtụtụ mpaghara mba Amerịka gụnyere Alaska, Dakota na ndị ọzọ ejighị ose na-efụ ụfụ eme ihe ọbụla.

Ma n'Afrika ebe a, anyi na-eji ose na-afụ ụfụ eme otutu ihe. Ndị seyensị nwere ọtụtụ aha ha jiri mara ose nke gụnyere Capsicum Annuum, Pipeer Guineense, na Pipeer Nigrum.

Etu e si eji ose esi nri

Ụfụdọ mmadụ na-etinye ose na nri ha oge ọ ka dị ndụ, ya bụ mgbe agwakọtara ya n'ụdị mmiri mmiri tupu etinye ya na nri.

E nwere ike ichekwa ose n'okpuru anyanwụ tupu akwọpịa ya ka ọ bụrụ ntụ, karịsịa ose ojii bụ nke e ji mara ụmụafọ Gana na Kameruun.

A na-echekwa obere ose na-acha uhie uhie n'okpuru ihu anyanwụ tupu akwọpịa ya ka ọ bụrụ ntụ. A na-eji ụdịrị ose ndị a esi nri.

Onye ọkachamara n'ihe banyere ahụike bụ Dọkịta Solomon Kelechi Nwafuru gwara BBC News Igbo na ose e ji ikuku mịkpọọ ebe enweghị ihu anyanwụ kpọmkwem, ga-akacha enye ihe n'ahụ mmadụ, karịa ose a mịrị amị n'okpuru ihụ anyanwụ kpọmkwem.

Dọkịta Nwafuru kọwara na mgbe ọbụla mmadụ mịkpọrọ osisi, mkpụrụ osisi maọbụ akwụkwọ nri n'okpuru ihu anyanwụ, ọtụtụ ihe na-edozi ahụ dị n'ime ya ga-apụ maọbụ kpochapụ n'ihi mmetụta nke ihu anyanwụ nwere na ya.

O kwuru na ụfọdụ akwụkwọ nri anaghị achọ mmetụta nke ihu anyanwụ maka na ọ na-ebelata ihe mejupụtara ya na ngwa dị mkpa nke ahụ chọrọ maka uto na ọrụ ndị ọzọ na-edozi ahụ.

Dr Solomon Kelechi Nwafuru yi uwe emume ụbọchị nkpọkọta n'ụlọakwụkwọ na-acha uhie uhie ya na okpu na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ma nwee eriri na-acha uhie uhie.

Ebe foto si, Dr Solomon Kelechi Nwafuru

Nkọwa foto, Dr Solomon Kelechi Nwafuru bụ osote onyeisioche nke otu ndị dọkịta na-ahụ maka ọgwụ n'ụlọọgwụ bụ Clinical Pharmacists Association of Nigeria.

Ọtụtụ ndị mereela nnyocha banyere ose gụnyere Dagnoko et al., 2013 na Hammeed et al., 2022. Ha kwuru na ose nwere ngwa kemịkalụ Bekee kpọrọ 'antioxidant' dịka vitamin C maọbụ E nke na-ewepụ ihe ndị nwereike imebi nri e chekwara n'ahụ mmadụ.

Ndị ọkachamara kwuru na ose nwere ọtụtụ akụrụngwa n'ime ya, nke gụnyere vitamin, mineral, alkaloid na ihe ndị ọzọ dị iche iche.

Nwafuru kwuru na ọ bụ ngwa ndị a ose nwere ka ahụ mmadụ chọrọ maka ịrụ ọrụ ahụ na-arụ kwa ụbọchị.

Gịnị ka ose na-eme n'ahụ mmadụ n'ezie?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dọkịta Nwafuru kwuru na ose nwere ngwa 'alkaloid' nke na-akwụsị ahụ mgbu ma na-akpalite ọgwụgwọ ọnya n'ahụ.

Ọ kọwara na ọ bụrụ na mmadụ erie ose mgbe ọ na-enwe isi ọwụwa, ose ahụ ga-ewepụta ngwa a na-akpọ 'Capsaicin' iji mee ka isi ọwụwa onye ahụ dajụọ site n'ịkwụsị ihe ndị na-akpalite isi ọwụwa ahụ.

"Ose nwekwara ihe mgbochi dị ire nke na-ebibi nje a naghị ahụ anya bụ 'microorganism' nke na-ebute isi ọwụwa dịka nje 'bacteria', maọbụ parasaịti iji nye ahụ gị ndajụ ahụ ị chọrọ," ka Dọkịta Nwafuru kọwara.

Dịka o siri kwuo, "Ose na-eme ka mmepụta mmiri e ji akpụ nwa dị n'ahụ nwoke na-abawanye site n'ịbawanye ọbara na-eruba n'ahụ ma na-enyekwa aka na nkeli ahụ nwoke. Ọ dị mma ka ụmụnwoke na-eri ose mgbe ọbụla," ka o kwuru.

O kwuru na ose na-ebelata ahụọkụ ma na-ebelata oke abụba iji zere oke ibu ma na-emekwa ka ọrịa shuga beleta n'ahụ mmadụ.

"Ose na-asachapụkwa usoro mgbari nri nke pụtara na onye nwere afọ ntachi nwereike iri ose iji nwere onwe ya."

Ose na-enye aka na-asachapụ akụrụ, imeju na imeziwanye ọrụ uche, na-abawanye ọgụgụ isi. Ọ na-enyere ndị mmadụ aka ihi ezigbo ụra, na-abawanye mgbochi ahụ gị, na-abawanye mmepụta mmiri ara n'ahụ nwaaanyị mụrụ nwa ọhụrụ.

Ose na-ebelata ọbara mgbali elu site n'ime ka ọbara na-aga n'ahụ nke ọma ma na-ewepụ ihe mgbochi na-eme ka ọbara ghara ịgafe n'akwara nke ọma.

Ose na-ebelata mgbu na nkeji ọkpụkpụ bụ 'arthritis'.

Onye nwere ọrịa onya afọ 'ulcer' o kwesịrị iri ose?

Ọtụtụ ose diị iche iche na-acha odo, uhie uhie na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ nọ n'ime efere dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images

Ka o si dị, e nweela ọtụtụ mgbagha banyere etu iri ose si emetụta onye nwere ọrịa ọnya afọ nke Bekee kpọrọ ucler.

Mana Dọkịta Nwafuru kọwara na iri ose na-agwọ ọnya afọ maọbụ ọnya eriri afọ.

"Ọ bụrụ na i rie ose, ọ ga-aga na ọnya ahụ wee kpasuo ya iwe nke ga-eme ka afọ malite ịfụ onye ahụ ụfụ maọbụ onye ahụ wee malite inwe ahụ mgbu. Onye ahụ nwereike ikwu na ose ahụ na-eme ka ọrịa ucler ahụ kawanye njọ mana ọ bụghị eziokwu n'ihi na mgbe ahụ mgbu ahụ gasịrị, ọnya ahụ ga-ajụrụ oyi mgbe ahụ ọgwụgwọ ga-ewere ọnọdụ," ka ọ kọwara.

Mana mgbe onye nwere ọnya afọ kwụsịrị iri ose n'ihi na ọ na-eme ka ọnya afọ na-afụ ya ụfụ, ọnya ahụ ga-amalite ịbawanye n'ihi erighị ose.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ụzọ ihe abụọ na-akpalite ọrịa ọnya afọ nke gụnyere nje microorganism na nke abụghị microorganism.

Ọ kọwara na ọnya afọ nke microorganism bụ nke nje 'bacteria' na-akpalite, ebe nke abụghị microorganism na-amalite site na ịṅụbiga mmanya ọkụ oke, ise anwụrụ ọkụ, agụụ na-agụ mgbe niile, iri nri na-esi isi ụtọ, iri oke nri arụrụ arụ ya na ịṅụbiga ọgwụ ahụ mgbu oke.

O kwuru na ose na-arụ ọrụ abụọ n'ahụ onye nwere ọrịa ọnya afọ.

Na mbụ ose na-ebibi nje 'microorganism' nke na-emepụta acid ma na-eme ka ọnọdụ ọnya ahụ dịkwuo njọ.

Nke abụọ, ose na-enyekwa ihe ndị ahụ pụrụ n'ahụ mmadụ mgbe ọnya ahụ dị n'afọ ma mee ka ọgwụgwọ malite na-ewere ọnọdụ.

Ose anaghị eme ka ọnya afọ na-akawanye njọ n'ihi na ọ na-ewepụta vitamin na-enye aka ịgwọ ọnya dịka ọnya afọ bụ ucler.

Nwafuru kwuru na ose bụ otu n'ime ihe kacha mkpa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile kere n'ụwa.

Ọ gbakwunyere na agbụrụ ndị dịka Kameruun, Togo, Gana na ndị ọdịda anyanwụ Naịjirịa na-eri ose nke ọma kachasị ebi ogologo ndụ karịa ndị anaghị eri ose nnukwu.