Nnaji agbaala arụkwaghịm ka ebubo asambodo adịgboroja pụtachara

Ebe foto si, Uche Nnaji/facebook
Minista na-ahụ maka sayensi na nkanụzụ na Naịjirịa agbaala arụkwaghịm n'ọrụ ya dịka ọ gachaara abalị ole na ole ụlọmgbasa ozi mpaghara kpughechara akụkọ boro ya ebubo iji asambodo adịgboroja arụ ọrụ dịka minista.
Ozi Onye ndụmọdụ pụrụ iche nke Onyeisiala Bola Tinubu wepụtara n'akara soshal midịa ya n'abalị Tuzde 7 Ọktoba 2025, kwuru na Geoffrey Uche Nnaji gbara arụkwaghịm n'ọrụ ya n'ihi ebubo ụfọdụ eboro ya.
Mana Nnaji gọnarịrị ebubo a site n'ozi ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Robert Ngwu wepụtara mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Mọnde 6 Ọktoba 2025.
Onye ndụmọdụ ahụ bụ Bayo Onanuga kwuru na Nnaji gbara arụkwaghịm n'ụbọchị Tuzde n'akwụkwọ ozi ekele o nyere Onyeisiala Tinubu maka inye ya oghere ijere ala Naịjirịa ozi.
Dịka Onanuga siri kwuo, Nnaji gwara Onyeisiala Tinubu na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpagbu ya.
O kwuru na Onyeisiala Tinubu kelere Nnaji maka ọrụ ya ma kwuo na ọ ga-adịrị ya mma n'ọdịnihu.
Cheta na Onyeisiala Tinubu họpụtara Nnaji dịka minista Naịjirịa n'ọnwa Ọgọst 2023.
Aka anyị adịghị na nsogbu Uche Nnaji na Mahadum UNN na-enwe - Gọọmenti Enugwu Steeti

Ebe foto si, Uche Nnaji/facebook na Peter Mbah/X
Gọọmenti Enugwu steeti ekwuola na aka na ụkwụ ya adịghị na nsugbo dị n'etiti Uche Nnaji bụ minista na-ahụ maka sayensi na nkanụzụ na Naịjirịa na Mahadum University of Nigeria Nsukka (UNN).
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Cheta na akụkọ malitere na-efegharị n'izu gara aga na minista ahụ ji asambodo adịgboroja nke o kwuru na ọ bụ mahadum UNN nyere, were nwete ọrụ dịka minista nke Naịjirịa n'ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu.
Ozi onye ji ọkwa onye nduzi na mịnịstrị mgbasaozi nke steeti ahụ wepụtara, kwuru na Maazị Uche Nnaji kwesịrị iji isi ya buru obe ya ma hapụ ịna atụ Gọọmenti Enugwu Steeti aka n'ihi ihe ọ maghị maka ya.
Chukwuemeka Nebo gara n'ihu katọọ akparamagwa ya bụ minista maka abịaghị zara ọnụ ya oge ndị ntaakụkọ gbakọrọ n'ụbọchị Mọnde n'isi obodo Abuja ịgba ya ajụjụ ọnụ.
Dịka o siri kwuo, "ajụjụ Nnaji kwesịrị ịza gụnyere; ọ bụ eziokwu na o ji asambodo BSC nke ụlọakwụkwọ UNN enyeghị ya were nwete ọrụ minista?"
"Ebee ka o siri weta asambodo BSC Microbiology o ji nweta ọrụ ma na-azọ ọchịchị kemgbe?"
"Ọ bụ ezie na ọ dara ule otu cọsụ akpọrọ "Virology? nke nwere akara "code 431" UNN gwara ya ka kwụọ naira anọ (N4.00) ka olegharịa ya n'afọ 1985, mana o degharịghị ya."
Nebo jụkwara; "Kedụ ka o siri nweta asambodo o jiri nwee fee ala nna ya bụ National Youth Service Corp ebe ọ gụchaghị akwụkwọ ya?
Nebo rụtụrụ aka na ọ bụ ihe ndị a mere ha jiri kwuo na asambodo NYSC nke Nnaji dịkwa ka ọ bụ nke adịgboroja.
Nebo gwara Nnaji ka o were ọsọ na ij zaa ụmụ Naijiria ajụjụ ndị a na-echu ha ụra.

Ginị ka Nnaji kwuru banyere ebubo iji asambodo adịgboroja arụ ọrụ?

Na nzaghachi, Nnaji kwuru na "Ọ bụ ndị iro m na-ebusasị akụkọ ụgha banyere m." ma kwuo na o ji aka ya rụọ asmbodo adigboroja n'aha Mahadum UNN.
Nnaji kwuru na ihe ndị ahụ niile bụ asị nke ndị iro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji aka ha edekọba.
O kwuru nke a mgbe onye nkwuchitere ya bụ Robert Ngwu gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ụbọchị Mọnde 7 Ọktoba 2025 n'isi obodo Abuja.
Ngwu gara n'ihu kwuo Nnaji gụchara akwụkwọ Mahadum UNN, ma gbakwunyekwa na ndekọ o jiri gụọ n'ụlọakwukwọ di na Mahadum ahụ maka onye ọbụla chọrọ ị ga jiri anya ya hụrụ.
"Ka m kwuo ya ka odoo anya, Chief Uche Nnaji gụrụ akwụkwọ na UNN, ọ gụchara ma nweta nzere "BSc, Science n'agụmagụ nke "Microbiology/Biochemistry, ma nweta "Nsọpụrụ klaasị nke abụọ, na nkewa nta."
Ngwu kọwara na ụlọ akwụkwọ UNN ji aka ha dee na Decemba 2023 na ọ bụ ezie na Nnaji gụrụ akwụkwọ ebe ahụ ma nweta nzere ya.
O kwukwara na ọ bụ Oriaku Celine Ngozi Nnebedum binyere aka n'akwụkwọ nzere ahụ dịka 'Registrar'.
"Akụkọ ahụ e dere n'ụlọmgbasa ọzi 'Premium Times' bụ okpotokpo asị nke akpachapụrụ anya nye ha ka ha wee kwaa Uche Nnaji emu," Ngwu kwuru.
Ihe anyị ma maka ebubo asambodo adịgboroja nke minista Uche Nnaji

Ebe foto si, Uche Nnaji/facebook
Kemgbe akụkọ malitere ifegharị na soshal midịa na mịnịsta na-ahụ maka sayensi na nkanụzụ na Naịjirịa bụ Uche Geoffery Nnaji ji asambodo adịgboroja na-arụ ọrụ dịka minista, ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedụ nke bụ eziokwu?
Nke a mere ụlọmgbasa ozi BBC News Igbo jiri tinye anya n'ala ma chọpụta ihe ndị mahadum Naịjirịa bụ University of Nigeria (UNN) kwuru banyere asambodo ahụ nakwa ihe mere tupu ọ bụrụ okwu akpụ n'ọnụ ugbua.
Cheta na ọ bụ ụlọ mgbasaozi mpaghara bụ Premuim Times degaara mahadum UNN akwụkwọ ka mahadum ahụ nye ya ndekọ banyere mgbe Nnaji jiri gụchaa n'ụlọakwụkwọ ahụ.
Aha Uche Nnaji adịghị n'akwụkwọ ndị gụrụ na mahadum anyị - UNN
Ndị isi ụlọakwụkwọ mahadum University of Nigeria Nsukka ekwuola na aha minista na-ahụ maka nka na ụzụ na mba Naịjirịa bụ Uche Geoffrey Nnaji adịghị n'akwụkwọ ndị gụchara na mahadum ahụ.
Dịka ụlọakwụkwọ ahụ siri kwo, University of Nigeria Nsukka enyeghị Mazi Nnaji asambodo BSC nke ọ na-ebugharị ugbua.
Onyeisi mahadum ahụ bụ Ọkammụta Simon Ortuanya wepụtara ozi a, kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ nwere ihe akaebe na-egosi na Mazi Uchenna Geoffrey Nnaji batara n'ụlọakwụkwọ ahụ n'afọ 1981 mana aha ya adịghị n'akwụkwọ ndị gụchara na ndị mahadum ahụ nyere asambodo.
Kedụ ka nnyocha a si bido?
Mahadum UNN kọwaara na ọ bụ n'ihi ọtụtụ akwụkwọ mkpesa nke ndị mmadụ na-edetara ya mere ha ji tinye anya na mmiri ịmata ma asambodo Nnaji ji ọ bụ ezigbo ya.
Ọkammụta Ortuanya dere na "otu n'ime akwụkwọ ahụ niile e detara mahadum ahụ si n'ụlọọrụ University Pubic Complaints Commission" rute ụlọakwụkwọ ahụ na Mee 13, 2025.
"Nkea mere anyị ji malite inyocha akwụkwọ anyị niile nke ọma were hụ na ọbụghị UNN nyere ya asambodo BSC".
Senior Registrar Mahadum ahụ bụ Oriakụ F. G. Achiuwa depụtara na akara nke a kpọrọ 'Registration Number' olu bekee Nnaji jiri malite ịgụ akwụkwọ na mahadum ahụ bụ bụ 1981/30725.
Ụlọikpe ajụla ịkwụsị UNN ịgba asambodo Nnaji n'anwụ
N'ihi ozi mahadum ahụ wepụtara, Nnaji gbakwara akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja iji kwụsị mahadum ahụ ka ọ ghara iwepụta asambodo Nnaji n'ihu ọha.
Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe ukwu ahụ kwuru na ya agaghị akwụsị mahadum UNN igosi ndị ụwa etu Maazị Uche Nnaji si gụọ akwụkwọ na mahadum ahụ.
Ọkaikpe Hausa Yilwa kere ikpe ahụ n'ọnwa Septemba 22, 2025, ebe ọ nọ kagbuo akwụkwọ Nnaji gbara iji kwụsị ndị UNN iwepụta ndekọ banyere etu o si gụọ akwụkwọ ma gosi ohaneze.
Onye bụ Uche Geoffrey Nnaji?
Uche Geoffrey Nnaji bụ mịnịsta na-ahụ maka nrụpụta ihe, sayensi na nkanụzụ bụ onye Enugwu steeti, ndịda ọwụwa anyanwụ Naíjiría.
A mụrụ ya n'ezinaụlọ Obed Nnaji nke Akpugo dị n'okpuru ọchịchị Nkanu West, n'Enugwu steeti.
Ọ bụ nwa mbụ n'ụmụ anọ nne na nna ya mụrụ.
Nnaji gụrụ akwụkwọ praịmarị ya na 'Santa Maria Primary School' dị n'Enugwu (nke a na-akpọ Ziks Avenue Primary School ugbua),
Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị ya na St Patrick's College, Emene.
Mana dịka akụkọ kwuru na mbụ na ọ gara mahadum na UNN; akụkọ na-efegharị ugbua na ọ gụchaghị mana o ji asambodo ụlọakwụkwọ ahụ arụ ọrụ.
Ndị nweburu nsogbu asambodo adịgboroja na Gọọmenti
Na Naịjirịa, ọtụtụ ndị nọ n'ọchịchị enwere nsogbu gbasara asambodo adịgboroja.
Ọtụ ndị nwere nsogbu a bụ n'oge ha na-azọ ọkwa ọchịchị maọbụ mgbe ha nọ n'ọchịchị.
Otu n'ime ha bụ mịnịsta na-ahụ maka akụnụba aha ya bụ Kemi Adeosun.
Cheta na Septemba 2018, ka Kemi Adeosun rituru n'ọkwa dịka mịnịsta maka ebubo asambodo ife alanna nke adịgboroja o jiri nweta ọrụ.
Nkọwa Kemi nyere bụ na ya agafeela afọ iri na atọ nke mere e ji nye ya asambodo ife ala nna mana e mechere ọ bụrụ na asambodo ahụ bụ nke adịgboroja.









