Lee etu ị ga-esi kwalite ahụike mkpụrụobi gị

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Ameer Ahmed
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Obi nwere ezi ahụike dị mkpa na-ime ka ahụ niile na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ na-eziga ọbara, ikuku na ihe niile na-enyere ndụ aka n'ime ahụ gị.
Ọrịa obi a na-akpọ "Cardiovascular diseases (CVDs)" bụ ihe so akpata ọnwụ igwe mmadụ n'ụwa niile, ebe mmadụ ruru nde iri na asatọ na-anwụ maka ya afọ niile dịka otu ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation (WHO) si kwuo.
Mmadụ anọ n'ime mmadụ ise ọbụla nwụrụ maka ọrịa obi nwụrụ maka obi nkpọchi na ahụ mkpọnwụ.
Ime ka obi mmadụ zuoike, na-akụ n'agbata 60-100 n'otu nkeji bu ihe mmadụ kwesiri ime ụbọchị niile dịka dọkịta na-ahụ maka obi si kwuo.
Dọkịta Evan Levine na-ahụ maka ọrị obi kwuru na "anyị nwereike ibelata mmebi obi site na nri, mmegharị ahụ na ị sepụ aka n'ihe gbasara anwụrụ".
Ajụjụ abụrụ na mmadụ nwere ezigbo obi ọ pụtara na ọ gaghị enwe nsogbu obi nkpọchi ọzọ?
Nke mbụ, gịnị bụ nkuchi obi?

Ebe foto si, Getty Images
Obi nkuchi na-eme mgbe obara na-aga n'obi nwere mgbochi.
Obara na-enye obi ikuku kwụsị, uru bụ muscle n'asụsụ bekee emebie maọbụ bido na-anwụ.
Ọ bụrụ na enyeghị onye ahụ ọgwụgwọ ngwangwa ọ ga-ebido inwe ọrị obi nke nwereike ibute ọnwụ onye ahụ.
Ọtụtụ ndị nwụrụ na nkuchi obi nwụrụ n'etiti awa atọ maọbụ anọ ha wechara mgbawa obi.
N'afọ niile, mmadụ ruru 805,000 na mba Amerịka na-enwe nkuchi obi, mmadụ 605,000 bụ ndị na-enwe ya na mbụ mana mmadụ 200,000 n'ime ya bụ ndị nwegero ya na mbụ.
Nke a gosiri na e nwere otu onye na-enwe nkuchi obi n'Amerịka na timkom timkom iri na anọ ọbụla.
Kedụ ka m ga-esi mara na m na-enwe nkuchi obi?

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọtụtụ ihe nwereike ibute nkuchi obi mana oke obi ụfụ na obi mkpọchị so n'ihe e ji amata.
Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwereike inwe obi ụfụ maọbụ akpịrị mgbu maọbụ aka mgbu.
Dọkịta Ailin Barseghian na-ahụ maka obi na California kwuru na ndị mmadụ na-enwere obi mgbu dịka afọ igbachu mmadụ, ma kọwaa na nkuchi obi na-ebuta ihe ụfụ na mpaghara ahụ mmadụ dị iche iche dịka n'aka ekpe, na-agba, n'azụ nakwa n'afọ.
Ihe ọzọ e ji ama onye na-enwe nkuchi obi ike ọgwụgwụ, nnukwu okpo ofufu ịgba mmadụ, na iku ume ibeneta dgz.
Obi mgbu adịghị akwụsị mgbe mmadụ zuchereike so n'ihe e ji amara onye na-enwe nkuchi obi.
Nnyocha adọọla aka na ntị na ọrịa obi bụ ihe e chere na ọ bụ "ọrịa ụmụnwoke".
Nke a mere na ọtụtụ ụmụnwaanyị esoghị na nnyocha e mere.
Akwụkwọ Bristish Medical Journal Heart dere maka nnyocha ha mere n'isi mmadụ 300,00 chọpụtara na ndị isi ojii ụmụnwaanyị nwere ọrịa nkuchi obi nakwa ndi bi na mpaghara ebe ndi enweghị ego bụ a dịghị enye ịwa ahụ maka ọrịa obi ebe ọtụtụ n'ime na-agaghachị azụ n'ụlọọgwụ maka ọrịa ahụ ma awachaa ha ahụ.
Ihe na-ebute ya n'ebe ụmụnwoke nọ gunyere obara mgbarielu, ise anwụrụ, ọrịa suga dịka UK National Health Service si kwuo.
Etu mmadụ ga-esi gbanarị ọrịa nkuchi obi

Ebe foto si, Getty Images
E nwere ụzọ dị mma mmadụ ga-esi gbochie nkuchi obi dịka imegharị ahụ na ezigbo nri.
Iri nri nwere obele abụba, jupụta na nke a na-akpọ 'fibre' nakwa inwedeta nnu i ritere na nri na-enyere aka maka na mmadụ iri nnukwu unu na-ebuta ọgbara mgbanielu.
Nri na-adịghị mma n'ahụ gụnyere ihe a rụpụtara arụpụta a na-erieri nke gụnyere udiri achịche.
Mana nri dị mma n'ahụ gụnyere azụ nwere mmanụ, ube, mkpụrụ osisi na mmanụ si n'akwụkwọ nri.
Dọkịta Ailin Barseghian kwuru na " e nwere ihe gosiri na nri ndị ahụ si na mkpọrọgwụ, mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri na-enyeaka ibeleta ọrịa nkuchi obi".
Dọkịta Evan Levine kwuru na ọ dị mma na mmadụ na-eji nkeji iri atọ na-emegharị ahụ kwa ụbọchị, ugboro isi n'otu izu ụka.
Ọnụ ọgụgụ ụmụntoroọbịa na-enwe nkuchi obi na-arị elu

Ebe foto si, Getty Images
Ndekọ ngalaba ụlọrọrụ "US National Center for Health Statistics" gosiri na ndị ntoroọbịa na-enwe ọrịa nkuchi obi na-arị elu.
N'afọ 2019, ihe ruru pasentị 0.3% dị agbata afọ iri na asatọ ruo iri anọ na anọ na-arịa ọrịa nkuchi obi. Mana nke ahụ gbagoro ruo 0.5% ugbua.
Mana Dọkịta Evan kọwara na ihe mere ọnụ ọgụgụ ndị nwere ọrịa nkuchi obi ji arị elu gụnyere etu ndị na-eri nri arụrụ arụ si arị elu nakwa maka na ndị mmadụ adịghị enwe oge emegharị ahụ na ihe ndị ọzọ.









