Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 08, 2026
Akụkọ dị mkpa - Ọktoba 08, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- A tọhapụla ndị ntoroọbịa iri abụọ ji otu afọ na-efe ala nna ha Bekee kpọrọ, 'National Youth Service Corps' (NYSC), nakwa otu onye ọzọ a tọọrọ n'okporoụzọ si Owerri gawa Onitsha n'Imo Steeti.
- Ndị ahụ a tọhapụrụ na-anata ọgwụgwọ ugbua n'ụlọọgwụ ngalaba nchekwa DSS dị n'Owerri, Imo steeti.
- Ndịgaha elu nke Nigeria ekwuola na ụgbọelu 'helikọpta' ha fedara n'elu ubi ndị ọrụ ugbo nke foto ya na-efegharị na soshal midia gara ọrụ nchekwa megide ndị ntọrị mmadụ n'oke ala Enugu na Benue steeti.
- Ha kwuru na ụgbọelu ahụ fedara ala n'usoro ọrụ ha dịka o nyere aka chụsaa ndị ntọ tupu o feghachị n'ogige ndịagha.
- Cheta na nke a na-eme dịka a ka na-achọ ozu ndị agha na-kwa ndị niile nọ n'ụgbọelu ahụ kpọkachara n'Ondo Steeti abalị ole ma ole garaaga.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






