Akụkọ dị mkpa - Eprel 8, 2026
Akụkọ dị mkpa - Eprel 8, 2026
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na Amerịka na mba Ịran ga-arụkọ ọrụ iji gwupụta ma wezuga akụrụngwa nuklịa niile.
- Trump kwupụtara nke a dịka Amerịka na Ịran nwechara nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ruo izuụka abụọ, nke a gbakwunyere ụfọdụ ọnọdụ na ya.
- Ndị pati African Democratic Congress (ADC) emeela ngagharịiwe n'Abuja iji gosipụta iwe ha gbasara mkpebi ụlọọrụ INEC.
- Oge ha na-eme ngagharịiwe ahụ n'ụbọchị Wenezde 8 Eprel 2026, ha ji ọkọlọtọ dị iche iche ha depụtara ebumnobi ha, dịka "Tinubu, kwere ka ọchịchị onye kwuo uche anyị kute ume."
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






