Asụsụ Igbo edugaala m ọtụtụ obodo n'ụwa - Chief Imo

Ebe foto si, Chiefimo Official/Facebook
- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Nwaamadị a ma ama na-eme ihe ịkpa ọchị nakwa ejije bụ Longinus Anokwute Iheoma, onye ndị mmadụ maara nke ọma dịka Chief Imo Worldwide, akọwaala etu o siri malite ime ejije, ịkpa ọchị nakwa ịza aha njirimara ya.
Mgbe ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Longinus bụ nwaafọ Umuduruekwe dị n'okpuru ọchịchị Isu n'Imo steeti, kwuru na ya malitere ihe dịka afọ iri na asatọ gara aga.
O kwuru na ya malitere ịkpa ndị mmadụ ọchị mgbe ya na-eto eto.
"Ihe ọbụla m bụ taa si na Chi bịa, asataghị m ya asata. Mgbe m bụ nwata, ọ na-abụ ebe ọbụla m gara kwuo okwu, ndị mmadụ a na-achị ọchị."
"Mmadụ nwụọ, anyị gaa ịmụ anya abalị Bekee kpọrọ "Wake Keep" m ga na-eme etu onye ahụ nwụrụ anwụ si eme mgbe ọ dị ndụ. Mgbe ụfọdụ, m ga-ejikere ka onye ahụ na-akpa ndị mmadụ ọchị," ka o kwuru.
Longinus kwuru na ọ bụ nne ya zụrụ ya maka na ọ hụghị nna ya na ụmụnne nna ya mgbe ọ na-eto eto.
Ọ sịrị na ya mere ọtụtụ ihe na ngalaba ejije Naịjirịa, gụnyere ịhazi ogige, ịchọ ndị mmadụ mma, nchịkọta, ọgụụ abụ (soundtrack) na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Ọ kọwakwara etu o siri malite ịza aha ọtụtụ mmadụ jiri mara ya bụ Chief Imo.
Dịka o siri kwuo, ọ bụ "Orịakụ Jesus" ka ndị mmadụ jiri mara ya mgbe ọ gụrụ egwu ya wuru ewu a na-akpọ "Orịakụ Jesus" afọ iri na asaa gara aga.
Mana aha ya gbanwere ọtụtụ afọ gara aga mgbe o mere otu ejije wuru ewu n'asụsụ Igbo, a kpọrọ "Imo Nkịtị" bụkwa mgbe a na-enye ndị mmadụ aha site n'obodo ha si pụta dịka e nyere Rachael Okonkwo Nkọli Nwa Nsụka na Angela Okorie Ada Abakaliki.

"E dere m ejije nke m jiri gagharịchaa ebe dị iche iche mana enweteghị m onye enyemaka dịka nwa ogbenye. Mana otu ụbọchị, Chineke ziteere m onye nzọpụta aha ya bụ Chief Emeka Okparanze n'Abagana dị n'Anambra Steeti bụkwa onye ihe m na-eme na Facebook na-amasị.
"Nwoke ahụ deere m ozi na Facebook na m na-akpa dị mmadụ ọchị nke ukwuu karịa ọtụtụ ndị a ma ama na ngalaba ejije Naịjirịa bụ Nollywood. Ọ gwara m na ọ bụrụ na m nwere akụkọ m chọrọ imepụta dịka ejije, na ya ga-akwado m.
O kwuru na nwoke ahụ kwadoro ya mepụta ejije ahụ nke ọtụtụ ndị na-eme ejije a ma ama gụnyere Zuby Michael, Amaechi Muonagor na Chinedu Nwadike nọ n'ime ya.
"Ọ bụ asụsụ Igbo ka m jiri mee ejije ahụ nke m zara 'Imo Nkịti'. Mgbe m mechara ya, eji m ejije ahụ na-achọgharị onye ga-ekesa ma ree ya, nke bekee kpọrọ "Marketer". Mana ebe ọbụla m gara, ha asị na o nweghị onye ga-anụ asụsụ m" ka ọ kọwara.
Ọ gara n'ihu kwuo: "Agaghị m echefu ọchị ha chịrị m n'ebe a na-ere ihe onyonyo n'Upper Iweka Road Ọnịcha dịka otu nwoke sịrị m na ego m jiri mee ejije ahụ dịka sị nye ya ka o were gaa mee oliliozu nna ya nọ n'ọbaozu. Anyammiri tapụrụ m n'anya n'ihi na ọ bụ ego mmadụ ka m jiri mee ejije a."
"Nke a mere m ji were ya gaa n'ebe nchụaja n'ụlọụka tọgbọ "master" ya ma gwaa Chukwu na m laghachite hụ ya m were, ma m ahụghị ya, m hapụ."
O kwuru na ejije ahụ nọrọ ya n'aka ihe dịka afọ atọ maka na o nweghị onye kwere ekesa ya mana mgbe e bidoro Africa Magic Igbo ka otu nwoke kpọrọ ma jụọ ya maka ejije ahụ ya chefuru echefu.
Dịka o siri kwuo, ọ bụ ego ruru nde naịra atọ (N3m) ka e jiri mee ejije ahụ, mana a zụrụ ya narị puku naịra isii (N600,000) n'Africa Magic.
"Mkpa m abụghị egole a zụrụ ya, ọ bụ ka ọ gawa agawa," ka o kwuru.
Longinus kwuru na ndụ ya malitere ịgbanwe ụbọchị mbụ e gosiri ejije ahụ n'African Magic dịka ahụhụ niile ọ tara mee ejije ahụ bịara na njedebe.
"Aha m (Imo, Imo) malitere ụbọchị ahụ na-efesasị n'ụwa niile. Ọ bụ ya mere m ji kwuo na akaraaka nwereike gbuo oge mana ị tụkwasị obi na Chineke ma hapụ imejọ mmadụ maọbụ itinye aka n'ihe ọjọọ, Chineke ga-echeta gị."
"Mgbe izụ ahụ gachara, o nwere onye kpọrọ mụ na Sister Maggie ka anyị bịa meere ya onyonyoo egwu ya. Anyị abụọ jikeere, m were ekwentị m mee obere ihe onyonyo nke kwuru na 'ọ bụ Chief Imo na Lolo ya Maggie. Sister Maggie were sị m onye? M sị ya ndị mmụọ fọrịkwaa gị.
"Ọ sị m 'egbe eluigwe gbagbukwa gị, ala Ekwe… ozugbo m tinyere ihe ịkpọchị ahụ n'ịntaneetị, ọ gazuru ụwa niile. Ebe ahụ ka aha m Chief Imo siri bido," ka ọ kọwara.
Longinus kwukwara na Sister Maggie abụghị nwunye ya dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-eche.
Ọ kọwara na aha nwunye ya bụ Evang Blessing Anokwute, onye na-azabu Okorie ma bụrụkwa nwaada Ụmụahịa.
"Alụmdi na nwunye anyị eruola afọ iri na asaa. Anyị amụọla nwoke ma mụọ nwaanyị. Ọ bụghị Maggie bụ nwunye m," ka ọ gbakwunyere.



