Ndụmọdụ m na-enye ụmụnwaanyị gbasara BBL - Sunshine Rosman

Ebe foto si, Sunshine Rosman/Instagram
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Nwaagbọghọ na-eme ejije a ma ama bụ Sunshine Rosman akọwaala etu o siri mụta ịsụ asụsụ Igbo nke ọma.
O kpughere nke a oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.
Sunshine Rosman kọwara na nna ya bụ nwaafọ Kanada mana nne ya bụ onye Orlu dị n'Imo steeti.
Dịka o siri kwuo, nne ya kụziiri ya na ụmụnne ya ndị ọzọ ka e si asụ asụsụ Igbo mana ọ bụ oge ọ gara Abịa steeti ka ọ mụtara ụfọdụ okwu Igbo ndị ọzọ.
"Nne m bụ onye Igbo na-asụrụ ụmụ ya asụsụ Igbo mana ọ bụ oge m gara Abịa steeti ka m mụtatụkwara ụfọdụ okwu Igbo," ka Rosman kwuru.
Ọ gara n'ihu kọwaa na ya malitere ime ejije oge ọ bụ nwata site na nkwado nne ya, n'ihi na ya na ụmụnne ya nwere mmasị n'ịgụ egwu, ime ejije nakwa ihe ndị ọzọ e ji eme ndị mmadụ obiụtọ, mana ọ bụ n'afọ 2015 ka o mere ejije mbụ ya.


Sunshine Rosman kwuru na ọ na-amasị ya igosipụta agwa ụmụnwaanyị ndị na-akpa ike, dịka o mere n'ejije "To Kill a Monkey".
"Ọ bụghị na igosipụta agwa akwụna n'ejije na-amasị m, kama ọ na-amasị m igosipụta agwa nwaanyị siri ike. Ọ ga-abụ nke nwere ihe dị omimi ọ na-akụziri ndị mmadụ. Ọ bụ ụdị agwa ahụ na-amasị m," ka o kwuru.
Oge a jụrụ ya ụzọ o chere teknọlọji siri nye aka n'ejije Nollywood, Rosman kwuru na teknọlọji emeela ka ụmụnwaanyị nwee ike ruo ebe dị iche iche e gbochiri ha kemgbe ọtụtụ oge.
Sunshine Rosman sịrị, "ụmụnwaanyị na-emecha ihe niile ugbua. Ya bụrụ ma gị gụkọọ ejije ndị kachasị ewu ewu na Naịjirịa ugbua, ị ga-ahụ na ọ bụ ụmụnwaanyị haziri ha maọbụ tuzie aka."
O nyere ụmụnwaanyị, ọkachasị ndị na-eme ejije ndụmọdụ ka ha ghara ime ihe ọbụla ga-ebutere ha ọghọm maka na ha na-achọ mma.
"Ọ gaghị adị mma na ị gara ime BBL, nwụọ ebe ahụ. Kedụ ihe ị ga-akọrọ chi gị, ebe ọ bụ na i nwere ezigbo ọdịnihu," ka ọ jụrụ ụmụnwaanyị.
Ụfọdụ ejije ndị Sunshine Rosman mere gụnyere; Lunchtime Heroes, Superstar, Flawsome, To kill a Monkey na ndị ọzọ.





