"Idemmiri gburu Ada m nwaanyị na ụmụ ya atọ ebe ha gara ịkọ ugbo n'Enohia Etim, Ebonyi Steeti"

Aha onyonyo, Lee ọnọdụ ndị mmadụ n'ebe idemmiri kpara mkpamkpa n'Afikpo, Ebonyi Steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ihe ruru mmadụ asaaa anwụọla n'ebe idemmiri kpara mkpamkpa n'obodo Enohia Etim dị n'okpuruọchịchị Afikpo nke Ebonyi Steeti.

A ka na-achọ mmadụ ise achọ dịka a hụrụ ozu mmadụ atọ n'Idemmiri ahụ.

Akụkọ kwuru na idemmiri ahụ malitere n'ọdọ ugbo a na-akọ unere n'ụbọchị Fraịde 1 Ọgọst, 2025, ma metụta mmadụ karịrị narị asatọ na-akọ ugbo ahụ, mebisie akụrụ akụ ha.

Nke a na-abịa dịka oke mmiri zoro n'ime ọtụtụ ụbọchị, nke mere mmiri jiri tojuo ebe niile.

Oshimiri n'Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Oshimiri n'Ebonyi steeti
BBC News Igbo abanyela n'ọbaozi Whatsapp Channel
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i sonye na Whatsapp chanelụ anyị

Nkọwa Ezinaụlọ ndị idemmiri gburu ndị nke ha nyere

Ndị mkpamkpa idemmiri metụtara n'Afikpo, Ebonyi steeti
Nkọwa foto, Afikpo, Ebonyi steeti

Otu nwaanyị n'ime ndị gwara BBC okwu sị na aha ya bụ Grace Otu kwuru na ụmụ ya so n'ihe nwụrụ.

N'okwu ya "ọ bụ ụmụ m so na ndị nwụrụ. Ada m nwaanyị na ụmụ ya mmadụ atọ. Ha si ebe ha gara na-alọta mgbe ide mmiri bụrụ ha. Ma ya ma ụmụ ya mmadụ atọ nwụrụ".

Onye ọzọ bụ Augustin Ugah kọwara na udiri mmiri ahụ ezobeghị afọ ole ma ole gara aga mgbe ọ na-agwa anyị etu ezinaụlọ ya si banye n'iri uju.

"Nne nwunye m nwụrụ mgbe idemmiri kpụrụ ụgbọ ha. Mana ndị mmadụ zọpụtara ụmụ m atọ. Ha atọ dị ndụ."

Ọ gara n'ihu kọwaa na mmiri mebiri ihe niile ha kọrọ n'ugbo.

Ihe ndị nọ n'ọchịchị n'ime obodo kwuru

Ndị isi obodo Enohia Etim dị n'okpuruọchịchị Afikpo nke Ebonyi Steeti.
Nkọwa foto, Afikpo

Onye Kanselọ na-anọchiteanya Itim wọọdụ bụ Francis Abani Okpani kwuru na a hụla ozu mmadụ atọ n'ime mmadụ asatọ ahụ nwụrụ anwụ ma na-achọ mmadụ ise achọ.

O kwuru na ụmụaka atọ so na ndị nwụrụ n'idemmiri ahụ.

Onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo bụ Timothy Nwachi gosiri nwute ya n'ihe a mere, ma tie ezinaụlọ ndị ụmụnne ha nwụrụ aka n'obi.

O kwere ha nkwa na gọọmenti ga-enyere ha aka, ma kwuo na ha na gọọmenti steeti nakwa nke etiti ga-arụkọ iji gbatara ha ọsọ enyemaka n'oge.