Ụlọomeiwu Sineti akwadola iwu ntụliaka e megharịrị emegharị

Ebe foto si, Nigeria Senate/Facebook
Ụlọomeiwu Sineti akwadola Iwu Ntụliaka 2022 nke emegharịrị emegharị n'afọ 2026 dịka ụlọọrụ mgbasaozi mpaghara sị kwuo.
Tupu ndị ụlọomeiwu akwado iwu ntụliaka 2022 nke emegharịrị emegharị n'afọ 2026 n'ụbọchị Tuzde abalị iri na asaa nke ọnwa Febụwarị, e nwere obere ogbaghara dịka ha maliteghachiri nzuko.
Otu onye omeiwu a ma ama bụ Enyinnaya Abaribe na-anochite anya ndị Abia Saụt n'ụlọomeiwu dọghachiri uche ndị omeiwu gbasara mpaghara iwu ahụ bụ 'Clause 60(3)' nke kwuru na ya bụrụ na netwọk ịntanetị arụghị ọrụ, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec nwereike iji akwụkwọ depụta mpụtara ntuliaka mana Abaribe kwuru ka ewepụ nke n'iwu ahụ.
Akpabio mechara kpọ oku ka ndị omeiwu chọrọ ka ewepụ iwu 'Clause 60(3) welie aka, mmadụ iri na ise bụ sọsọ ndị welitere aka ha ebe ndị welitere aka ka aghara iwepụ mpaghara iwu ahụ bụ mmadụ iri ise na ise.
Cheta na Iwu ntuliaka ulọomeiwu ukwu Sineti binyere aka n'ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị, 2026, kpalitere ndọrịụka dịka ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ya n'ihi na o tinyeghị n'iwu ka a na-agbasa mpụtara ntuliaka dịka a na-agụ vootu n'ogige ntuliaka.
Ụfọdụ ndị a ma ama nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mere ngagharịwe n'ihi nkea ma kpọọ oku ka onyeisioche ụlọomeiwu bụ Godswill Akpabio wepụ mpaghara iwu ntụliaka ahụ n'eseokwu.
Ndị uweojii ejirila anwụrụ anyammiri chụsaa ndị ngagharịiwe maka mgbasa mpụtara ntuliaka ozugbo n'ịntaneetị

Ebe foto si, Screengrab
Ndị uweojii ejirila anwụrụ anyammiri chụsaa ndị ntoroọbịa na-aga n'ihu n'ime ngagharịiwe maka itinye mgbasa mpụtara ntuliaka ozugbo n'ịntaneetị n'ime Iwu Ntuliaka 2022 nke e megharịrị emegharị.
Nke a mere ka abalị ise nke ngagharịiwe 'Occupy National Assembly' ndị ntoroọbịa na-eme n'ọnụ ụzọ ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu dị n'Abuja bịa na njedebe n'ike.
Akụkọ kwuru na a gbara anwụrụ anyammiri nke mbụ, mgbe ụfọdụ ndị ngagharịiwe gbalịrị ịga n'ọnụ ụzọ ụlọomeiwu Naịjirịa dị n'Abuja.
Nke a bụ mgbe onye bụbu minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Oby Ezekwesili na Omoyele Sowore hapụrụ ebe ogige ngagharịiwe ahụ.
Cheta na ọtụtụ ụmụafọ Naijiria gụnyere ndị ntoroọbịa, ndị otu kpọrọ onwe ha 'Obidients' na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị malitere ime ngagharịiwe n'ihu Ụlọọmeiwu Naijiria n'Abuja n'ụbọchị Fraide iji gosi iwe ha banyere iwu ntuliaka ọhụrụ nke Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria binyere aka na nsonso a.
N'ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị 2026 ka ndị omeiwu Sineti kwuru na ha ga-akwado mbufe mpụtara ntuliaka n'ịntanetị dịka o dị na Iwu Ntuliaka nke 2022.
Ndị omeiwu anabatala iji eletrọnik nakwa nke e dere n'akwụkwọ agbasa mpụtara ntuliaka

Ebe foto si, Nigerian Senate/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị omeiwu Sinetị ekwuola na ha anabatala ka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na mba Naịjirịa bụ Inec jiri electrọnik nakwa e dere n'akwụkwọ na-agbasa mpụtara ntuliaka ọbụla.
Onyeisioche ụlọomeiwu bụ Godswill Akpabio, kwupụtara mkpebi a n'oge ọgbakọ mberede nke ndị omeiwu Sinetị mere n'ụbọchị Tuzde abalị iri nke ọnwa Febụwarị 2026.
Mkpebi ụlọomeiwu a kagburu mkpebi ha meburu nke jụrụ ịmanye ụlọọrụ Inec ka ọ bụrụ iwu na ha ga na-agbasa mpụtara ntuliaka n'ịntaneetị n'ọba nke 'Result Viewing Portal' (Irev).
Na mgbanwe ọhụrụ a, ndị omeiwu Sineti kwadoro iji eletrọniki agbasa mpụtara ntuliaka mana ha wepụkwara ịgbasa ya dịka ọ na-eme ma kwuo na ha nwekwara ikike iji e dere n'akwụkwọ ewepụta mpụtara ntuliaka n'ebe enweghị ịntaneetị.
Ụlọomeiwu Sineti gakwara n'ihu họpụta kọmitii ogbako nke mmadụ iri na abụọ ga-ahazi ọdịiche dị n'etiti Iwu Ntuliaka ọhụrụ a na nke ndị Ụlọ Nnọchiteanya.
Akpabio gwara kọmitii ahụ ka ha were ọrụ ha dịka ihe dị mkpa, na-egosipụta olileanya na a ga-emecha usoro ahụ ngwa ngwa.
Cheta na ọtụtụ mmadụ akatọọla mgbanwe ndị omeiwu wepụtara maka iwu ntuliaka ọhụrụ a ma kwuo na ọ na-ebelata ịkwụ aka ọtọ na ntuliaka ya na ịhọpụta ndị ga-achị Naịjirịa n'ọkwa dị iche iche.
Nke a kpalitekwara ngagharịiwe nke ndị ntoroọbịa, ndị otu na-ahụ maka ikike dịrị mmadụ na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche haziri n'Ụlọọmeiwu Naijiria n'Abuja kemgbe Fraide 6 Febụwarị 2026 iji gosipụta iwe ha banyere iwu ntuliaka ọhụrụ ahụ.
Ndị a ma ama sonyere na ngagharịiwe ahụ gụnyere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dịka Peter Obi, Rotimi Amaechi, Solomon Dalung ya na Aisha Yusuf na ọtụtụ ndị ọzọ.
Anyị chọrọ ka ụlọọrụ Inec na-agbasa mpụtara ntuliaka dịka ọ na-eme – Ndị ngagharịiwe

Dịka ngagharịiwe megide iwu ntuliaka ọhụrụ nke na-aga n'ihu n'ogige ụlọomeiwu Naịjirịa banyere abalị atọ ya, ndị na-eme ngagharịiwe ahụ na-akpọ oku ka a gbanwee iwu ntuliaka ọhụrụ nke ndị omeiwu binyereaka.
N'okwu ha, ndị na-eme ngagharịiwe ahụ kwuru na ha chọrọ ka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec na-agbasa mpụtara ntuliaka ozugbo dịka ọ na-eme.
Ha gara n'ihu kwuo na onyeisioche ụlọomeiwu Sinetị bụ Godswill Akpabio ekwesịghị ịnọ na-ekwuchitere ụlọọrụ Inec site na ịrụụka na-ịgbasa mpụtara ntuliaka ahụ agaghị ekwe omume ma ọ bụrụ na enweghị netwọk.
"Ndị Sineti nwere ihe niile mana anyị enweghị ihe ọ bụla, anyị anaghị arịọ maka ihe karịrị akarị. Ihe anyị na-arịọ bụ ka a gụnye vootu anyị. A ga-agụnyerịrị vootu anyị; otu nwoke, otu vootu na enweghị nrụrụaka vootu maọbụ aghụghọ," ka ndị ngharịiwe ahụ kwuru.

Ebe foto si, Screengrab
Na nzaghachi ya, ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu nnọchiteanya bụ Akin Rotimi kwuru na ndị omeiwu Sineti na ndị nnọchiteanya na-anọchitekwa anya ndị Naịjirịa.
"Ha egeela unu ntị, taa ha ga-eme ntuliaka banyere ya. Ka anyị hụ ihe Sineti ga-eme maka ihe niile anyị nụrụ na ndị Naịjirịa chọrọ. Anyị ga-enwe kọmitii ogbako ga-anọkọ ọnụ."
"Anyị maara n'oge adịzighị mana ụlọomeiwu nnọchiteanya na Sineti ga-ejikọta aka ọnụ mepụta iwu ntuliaka nke ga-egosipụta ọchịchọ nke ndị Naịjirịa niile maka ntuliaka ziri ezi na nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nke ahụ bụ nkwa m nwere ike ikwe unu," Rotimi kwuru.

Ebe foto si, Screengrab
Onye bụbu Minista ndị ntoroọbịa na egwuruegwu na Naịjirịa bụ Solomon Dalung kwuru na o teela aka Ụlọomeiwu Sịnetị malitere ịgharịpụ ndị Naịjirịa nke mere na ndị mmadụ adịghị atụkwasịobi na nkwa ọ bụla ha kwere.
Dalung siri na ihe ndị Naịjirịa chọrọ agwụchaala ka ndị omeiwu nabata ịgbasa okwe ntuliaka n'ịntaneetị oge ọ na-eme, ma zigaara ya onyeisiala ka o binye aka na ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ngagharịiwe nke ugbua bụ naanị ịdọ aka na ntị n'ihi na o dobeghị anya ma "ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekperima" ha ga-ekwe ka mkpebi ụlọomeiwu bụrụ ihe onyeisiala ga-ebinye aka na ya.
"Anyị ga-apụta ọzọ ma ọ bụrụ na 'ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekperima' ahụ degharịa ihe Ụlọomeiwu nabatara ma nye onyeisiala ihe ọzọ ka o binye aka".
"Ọ bụghị taa ka ha malitere ime ya, ha mere ya oge e wepụtara iwu mmegharị ụtụisi. Anyị chọrọ ịdọ ha aka na ntị, ka ha mara na ndị nwe obodo apụtala," ka Dalung kwuru.
Ndị omeiwu Sineti ga-enwe ọgbakọ mberede dịka arụmụka ịgbasa mpụtara ntuliaka n'ịntanetị na-aga n'ihu
Ndị omeiwu Sineti ekwuola na ha ga-enwe ọgbakọ mberede n'ụbọchị Tuzde, 10 Febụwarị, 2026 ka ọ gara abalị ole na ole ụmụafọ Naijiria malitere ime ngagharịiwe maka iwu ntuliaka ọhụrụ.
N'akwụkwọ ozi nke odeakwụkwọ ndị Sineti bụ Emmanuel Odo wepụtara, ka ọ gwara ndị omeiwu ka ha zukọọ n'ụlọomeiwu mba dịka onyeisioche Sineti bụ Godswill Akpabio si kwuo.
"Onyeisioche ndị omeiwu Sineti bụ Godswill Obot Akpabio, gwara m ka m gwa ndị Sineti niile a ma ama nke Nịajirịa na ha haziri nzukọ mberede nke Sineti n'ụbọchị Tuzde, 10 Febụwarị, 2026, n'oge ọkụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie," ka ọkwa ahụ kwuru.
Odo gwara ndị sinetọ niile ka ha bịa n'ọgbakọ mberede ahụ.
Ka ọ dị ugbua, e kwubeghị ihe kpatara ya bụ nzukọ ahụ, mana oku ahụ na-abịa dịka a na-enwe arụmụka gbasara ịgbasa mkpụtara ntuliaka n'ịntanetị mgbe mgbanwe iwu ntuliaka gafere ọgụgụ nke atọ na Sineti. Ndị omeiwu ahụ a kwụsịtụla ọgbakọ ahụ mgbe nke ahụ gasịrị.
Cheta na ọtụtụ ụmụafọ Naijiria gụnyere ndị ntoroọbịa, ndị otu kpọrọ onwe ha 'Obidients' na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị malitere ime ngagharịiwe n'ihu Ụlọọmeiwu Naijiria n'Abuja n'ụbọchị Fraide iji gosi iwe ha banyere iwu ntuliaka ọhụrụ nke Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria binyere aka na nsonso a.
N'ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị 2026 ka ndị omeiwu Sineti kwuru na ha ga-akwado mbufe mpụtara ntuliaka n'ịntanetị dịka o dị na Iwu Ntuliaka nke 2022.
Ha kpebikwara na ha agaghị anabata ka a na-ewepụta mpụtara ntuliaka n'ịntanetị dịka a na-atụ vootu ozugbo ma mmachibido iwu afọ iri maka ndị na-azụ votu. Kama nke ahụ, ha kwetere inye ntaramahụhụ mkpọrọ na ịgwụ ụgwọ.
Peter Obi esonyela na ngagharịiwe megide iwu ntuliaka ọhụrụ Sịneti binyereaka

Peter Obi ji otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Lebọ Patị zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 esonyela na ngagharịiwe megide iwu ọhụrụ ahụ ụlọ omeiwu Sịneti binyereaka na ya.
Obi gara n'ebe a na-eme ngagharịwe ahụ nke juputara na ndị niile na-akpọ oku ka Sịneti mee ihe ga-akwụsị nrụrụaka na ntuliaka.
Ha na-akpọ oku ka e jiri usoro nkanaụzụ a kpọrọ 'E-transmission' were na-eziga ndekọ vootu site mgbe a tụchara ya.

Etu e si mee ngagharịiwe megide Iwu Ntuliaka ọhụrụ

Ebe foto si, ......
Ọtụtụ ụmụ Naijiria gụnyere ndị ntọrọbịa, ndị otu kpọrọ onwe ha 'Obidients' na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị mere ngagharịiwe gaa n'ihu Ụlọọmeiwu Naijiria n'Abuja taa bụ Fraide iji gosi iwe ha banyere iwu Ntuliaka ọhụrụ nke Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria binyere aka na nsonso a.
Ụfọdụ ihe e dere n'akwụkwọ ha kpa n'aka eme ngagharịiwe gụnyere, '"Wuru wuru Ntuliaka- anyị na-asị mba", "Anyị na-ajụ nnabata Ụlọọmeiwu anabataghị iji igwe ezipụ mpụtara ntuliaka dịka a na-atụ vootu";" Iji igwe intanet ezipụ mpụtara ntuliaka bụ ịganihu, ọ bụghị ịga azụ,";"Akpabio, iji igwe intanet ezipu mpụtara ntuliaka bụ iwu," wdgz.
Cheta na ụbọchi Wenezde, Ụlọmeiwu Ukwu Naijiria binyere aka n'Iwu Ntuliaka ọhụrụ nke e meghị ya iwu iji igwe intaneti ezipụ mpụtara ntuliaka.
Nke a kpalitere iwe ọtụtụ ụmụafọ Naijiria bụ ndị na-ebo ebubo ọ ga-egbochi ohere ime ntuliaka kwụ ọtọ.
Ihe PDP, ADC kwuru maka iwu Ntuliaka ọhụrụ

Ebe foto si, ADC/PDP/X
Ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị akatọla Ụlọọmeiwu maka ịjụ itinye
Otu PDP kpọrọ ihe Ụlọomeiwu Ukwu mere "mmegide nye ọha ndị mmadụ" kwuru na 'Ihe Ụlọomeiwu Ukwu nke APC mere nwere ike iji ọtụtụ afọ dọghachi ọchịchị onyekwuuche ya azụ."
Otu ADC kwuru n'ozi nke odeakwụkwọ bụ Bolaji Abdullahi binyere aka ma wepụtara sị, "Ịjụ ịnabata iji ige inanet ezipụ mpụtara ntuliaka bụ mbọ APC na-agba iji mee wuruwuru n'ọdịnihu."
Ọ bụ ị ma ụma agba ntuliaka kwụ ọtọ mgba okpuru-Atiku
Onye bụbụ Osote Onyeisiala Naijiria bụ Atiku Abubakar kwuru ọjụjụ Seneti jụrụ ime ka ọ bụrụ iwu iji igwe intanet ezipụ mpụtara ntuliaka bụ ịgba ntuliaka kwụ ọtọ mgba okpuru.
Abubakar sịrị na o gosiri "adịghị nkwadobe ịhụ na ntuliaka bụ ihe ọha ndị mmadụ ga-elenye anya."
Ọ gara n'ihu sị na
zọburu ọkwa To reject it, and adopt what is obviously a face-saving provision of the 2022 Act on electronic transmission of results is to signal an unwillingness to submit elections to public scrutiny.
Ginị mere ndọrịtaụka ji soo iwu ntuliaka ọhụrụ Sineti binyere aka na ya?

Ebe foto si, Nigeria Senate/Facebook
Iwu ntuliaka ulọomeiwu ukwu Sineti Naịjirịa binyere aka n'ụbọchị Wenezde 4 Febụwarị, 2026, akpalitela ndọrịụka dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ ya n'ihi na o tinyeghị n'iwu ka e jiri igwe ezipụ mpụtara ntuliaka (electronic Transmission) dịka a na-agụ vootu n'ọdọ atụmvootu.
N'ụbọchị Tọzde 5 Febụwarị, 2026, ụlọọmeiwu Sinetị nke Godswil Akpabio nọ n'isi ya binyere aka na mgbanwe ha tinyere n'iwu ntuliaka ha hazigharịrị ọhụrụ.
Otu n'ime ihe a hụrụ dị n'iwu ọhụrụ ahụ bụ iwedata oge Inec na-ewepụta ọkwa oge a ga-eme ntuliaka ka o si n'abalị narị atọ na iri isii (360) gbadata na abalị otu narị na iri asatọ (180).
Mana ha jụrụ itinye ya n'iwu ka ọ bụrụ iwu i ji igwe ezipụta mpụtara ntuliaka dịka a na-atụ vootu nke Bekee kpọrọ, 'eletronic transmission'.
Kama itinye nke a n'iwu, Sineti hapụrụ ikike ikwu etu a ga-esi ezipụ mpụtara ntuliaka n'aka ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Independent Electoral Commission (inec) dịka ọ dịbụ n'iwu ntuliaka nke afọ 2022 (Clause 60 of 2022 Electoral Act) ụlọomeiwu ukwu jụkwara ịnabata ụzọ ọzọ mmadụ nwere ike iji nweta ikike ịtụ vootu karịa na onye ahụ enwere akwụkwọ 'Permanent Voters Card.'
Ihe ndị Naịjirịa na-ekwu

Ebe foto si, Inibehe Effion/ Peter Obi/Facebook
Onye ọkaiwu a ma ama bụ Inibehe Effiong kwuru na ọ bụrụ na e meghị ya iwu iji igwe intanet ezipụ mpụtara ntuliaka, ị mara na anyị na-egbu oge anyị."
"Inec emeela ka ihe dị n'Iwu ntuliaka nke afọ 2022 ghara inwe isi, ụlọikpe kwadokwara na ihe Inec mere."
Cheta na n'afọ 2023, Ọkaikpe Nwite n'ikpe ya banyere ntuliaka afọ 2023, kwuru na ọ dị Inec n'aka ikpebi etu ha chọrọ isi chịkọta mpụtara ntuliaka dịka ọ dị n'iwu ntuliaka nke afọ 2022 akụkụ 60(5)
Ọ bụghị naani ndị ọkaiwu, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị gbarụrụ ihu maka ụkwụ a Sineti zọpụrụ.
Peter Obi nke otu pati ADC kwuru sị, "Site na ịjụ ime ya iwu ka e jiri igwe ezipụ mpụtara ntulaika, bụ inye oghere ka gharaghara na wuruwuru chie eze, ka ọ nwe ndị ọ na-abara."
Iwu Ntuliaka Akpabio binyere aka abụghị nke anyị kpebiri- Abaribe, Umeh,Tambuwal, Akpoti

Ebe foto si, BBC/Natasha Akpoti, Aminu Tambuwal/Facebook
Dịka ụmụ Naijiria na-eti mkpu ma na-agbarụ ihu banyere Iwu Ntuliaka ọhụrụ Ụlọomeiwu binyere aka, ụfọdụ ndị omeiwu gụnyere Enyynnaya Abaribe, Natasha Akpoti nakwa Aminu Tambuwal eboola ebubo na ihe e wepụtara abụghị ihe ndị omeiwu Seneti kpebiri.
Ha kwuru nke a dịka ha na ndị ntakụkọ nwere mkparịtaụka n'Abuja.
Abaribe sịrị, "Ma Komiti ntuliaka nakwa otu pụrụ iche ehiwere iji tulee Iwu ahụ ihe anyị nile kwekọrịtara bụ na a ga eji igwe ezipu mpụtara ntuliaka. Anyị achọghị mihe edoghị anya maọbụ nke ga-agbagwoju anya."
N'otu aka ahụ, Victor Umeh kwuru na "ihe karịrị ndị omeiwu senati pasent 85 kwekọrịtara ka e mee ya iwu iji igwe intanet ezipu mpụtara ntuliaka."




























