Anambara, Enugwu, Imo, etu steeti ndịda ọwụwa anyawụ Naịjirịa siri nwete aha ha

- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Naịjirịa nwere mpaghara ọchịchị isii nke ndịda ọwụwa anyawụ bụ otu n'ime ha.
Ndị Igbo, nke bụ otu n'ime agbụrụ atọ kachasị n'ọnụọgụgụ na Naịjirịa bụ ndị bi na steeti ise ahụ dị na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Mpaghara ndịda ọwụwa anyawụ nwere steeti ise gụnyere Anambara, Imo, Abịa, Enugwu na Ebonyi steeti.
Tupu gọọmentị Naịjirịa amalite ikepụta steeti dị iche iche, nke dị iri atọ na isii (36) n'ọnụọgụgụ ugbua, mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ otu n'ime mpaghara atọ e nwere mgbe ekere Naịjirịa niile ụzọ atọ n'afọ 1950.
Oge ahụ, steeti ise a dị na mpaghara n'ọwụwa anyanwụ bụ otu ma a kpọrọ ha niile Mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ "Southeast zone" maọbụ "East Central state", dịka Ọkankụzi Alex Anedo siri kwuo.
Anedo kwuru na mgbe a malitere ikepụta steeti na Naịjirịa, gọọmentị kewara ochie mpaghara ọwụwa anyanwụ ụzọ abụọ, were kpọọ otu Anambara steeti ma kpọọ nke ọzọ Imo steeti.
Ndị Igbo nwere olumba dị iche iche gụnyere Owere Igbo, Ọnịsha Igbo, Ika Igbo na olumba ndị ọzọ mana ndị Igbo niile na-eji Igbo Izugbe akpakọrịtaụka maka ịhọta onwe ha.
Anambara: Kedụ mgbe e kepụtara na etu siri nwete aha steeti a?

Anambara bụ otu n'ime steeti ise e nwere na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjiria. E kepụtara Anambara n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1991 mgbe Ọchịagha Ibrahim Badamasi Babangida bụ Onyeisiala Naịjirịa.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ọnụọgụgụ ndị bi na mba Naịjirịa National Population Commission (Npc) siri kwuo, ọnụọgụgụ mmadụ bi n'Anambara ga-akarị nde ise n'afọ 2022.
Anambara na Delta steeti nwere okeala n'akụkụ ọdịda anyanwụ ya, yana Imo steeti nwere okeala na mpaghara ndịda, Enugwu n'akụkụ ọwụwa anyanwụ, yana Kogị steeti n'akụkụ ugwu ya.
Ọkankụzi Anedo gwara BBC na mgbe steeti niile dị n'ọwụwa anyanwụ ka bụ otu, na e nwere okpuru ọchịchị a na-akpọ Anambara mgbe na 'Anambra Division' n'ochie mpaghara ọwụwa anyanwụ.
"Aha Anambara bụ n'osimiri dị na steeti ahụ a kpọrọ Omambala ka e siri nwere nwete aha ya. Osimiri ahụ na-ehubanye n'Osimiri Riva Nịja dị n'Otu Ọcha, mana ọ gafere Nsugbe, Umuleri, Aguleri na Igbarịam," Ọkankụzi Anaedo kwuru.
Dịka o siri kọwaa, ndị ọcha nwetere Anambra site na-ịkpọ 'Anam Branch of River Niger' nke aha Igbo ya bụ Omambala.
O kwukwara na mgbe e kepụtara Anambara steeti bụ mgbe gọọmentị na-akpọ steeti site n'osimiri gafere na steeti ahụ.
O kwukwara na gọọmentị chọburu ịkpọ Anambara Nịja steeti mana ndị ugwu buru ụzọ zaa aha ahụ nke mere ejiri kpọzie ya Anambara steeti.
N'afọ 1991, gọọmentị gakwara n'ihu ikekwaa ochie Anambara were wepụta Enugwu steeti na Anambara ọhụrụ.
Imo steeti: Mgbe e kepụtara ya na ebe aha ya siri bịa

Ebe foto si, AFP
Imo bụ steeti ọzọ dị na ndịda ọwụwa anyawụ Naịjirịa. E kepụtara ya n'oge ọchịchị ndịagha mgbe Ọchịagha Murtala Muhammed bụ onyeisiala Naịjirịa n'afọ 1976.
Dịka steeti eji obiala ọwụwa anyawụ "Eastern Heartland" were mara, Imo bụ steeti e siri n'ime ya kewapụta Abịa steeti n'afọ 1991.
Ọ bụkwa ebe e wepụtara ụfọdụ mpaghara sonyere Enugwu na Ebonyi steeti taa.
Imo na Anambara nwere okeala n'akụkụ ugwu ya; Abịa steeti n'akụkụ ọwụwụ anyawụ ya, Rivas steeti n'akụkụ ndịda yana ọdịda anyanwụ.
Dịka ụlọọrụ Ncp siri kwuo, ọnụọgụgụ mmadụ bi n'Imo steeti ga-akarị nde 5.4 n'afọ 2022.
Ọkankụzi Chigozie Nnabuihe gwara BBC na Imo steeti nwetere aha ya site n'Osimiri 'Imo Riva' bụ osimiri dị mkpa nke gafere na steeti ahụ.
Dịka Nnabuihe siri kwuo, ọ bụkwa Osimiri Ọmambala na Osimiri Abonie ka esi nwete aha Anambara na Ebonyi steeti.
Enugwu steeti: Etu e siri kewapụta ma nwete aha ya

Enugwu bụ steeti ọzọ dị na mpaghara ọchịchị ndịda ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa, nke ya na Benue na Kogi nwere okeala n'akụkụ ugwu ya.
Enugwu na Ebonyi steeti nwekwara okeala n'akụkụ ọwụwa na ndịda ọwụwa anyanwụ ya, ebe ya na Abịa steeti nwere okeala na ndịda ya, mana Anambara dị n'akụkụ ọdịda anyanwụ steeti a.
Ọkankụzi Nnabuihe kwuru na Enugwu nwetere aha ya site n'okwu Igbo bụ "enu na ugwu" nke gosiri na okirikiri steeti ahụ jupụtara n'ugwu.
"Mgbe anyị nọ n'ọchịchị ọwụwa anyanwụ Naịjirịa, ọ bụ Enugwu bụ isi obodo mpaghara ahụ. Ka ọ dị ugbua, ihe ọ bụla a na-eme n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa bụ n'Enugwu ka a na-eme ya," Nnabuihe kwuru.
Ọ bụ n'ọnwa Ọgọọst n'afọ 1991 ka gọọmentị Ọchịagha Ibrahim Babangida bụ onyeisiala Naịjirịa sitere n'Anambara kewapụta Enugwu steeti.
A mara Enugwu dịka nnukwu obodo ebe a na-egwuputa "coal" dịka a chọpụtara coal n'ala Enugwu n'afo 1909.
Nke a mekwara eji akpọ ya obodo coal "Coal City".
N'afọ 1917, ka a kpọrọ ya Enugwu-Ngwo, mana n'ihi mgbasawanye ngwa ngwa nke obodo ahụ, a kpọgharịrị ya Enugwu n'afọ 1928.
Ụlọọrụ Ncp kwuru na ọnụọgụgụ ndị mmadụ bi n'Enugwu steeti ga-akarị nde anọ n'afọ 2022.
Ebonyi: Mgbe e kepụtara steeti a na etu e siri nwete aha ya

Ọkammụta Goodluck Nwode gwara BBC na-esiri n'akụkụ Enugwu na Abịa steeti were kepụta Ebonyi steeti n'afọ 1996.
Dịka o siri kwuo, isi obodo Ebonyi bụ Abakiliki -nke aha ya sitere na 'Aba Nkariki' bụ aha otu obodo dị n'Izzi nke si n'ochie "Anambara Division" tupu etinye n'Enugwu steeti.
O kwuru na Abakaliki sitere n'ochie Anambara na Afikpo 'Division' nke Enugwu na Abịa steeti.
Ọkammụta Nwode kwuru na Ebonyi steeti sitere n'Osimiri a mara dịka Abonyi maọbụ Aboine Riva nke gafere mpaghara etiti ugwu steeti ahụ.
Ebonyi nwere okpuru ọchịchị dị iri na atọ (13) ebe ihu igwe steeti ahụ na-adịkarị ọkụ.
"A maara steeti anyị dịka 'nnu nke mba' Naịjirịa n'ihi n'enwere nnu na mpaghara dịka Ọkpọsị. Anyị na-emebe nri gụnyere ji, akpụ, mmanụ nri, ọjị, osipaka na ndị ọzọ. Isi obodo Abakaliki bụ obodo kachasị n'Ebonyi steeti," Nwode kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo: "Isi obodo Abakaliki dị n'akụkụ Osimiri Ebonyi nke jikọrọ steeti ahụ na Kalaba, Pọtakọt, Gabon, Cameron na Legọs."
"Ebonyi nwere ọtụtụ ihe onyinye si na chi gụnyere ọla edo, nnu, okwute na ihe ndị ọzọ," o kwuru.
O kwuru na Ebonyi bụ steeti eji imepụta nri olili were mara dịka ọ na-emepụta ji na osikapa.
Ụlọọrụ Ncp kwuru na ọnụọgụgụ mmadụ bi n'Ebonyi steeti ga-akarị ihe dịka nde atọ n'afọ 2022.
Steeti ahụ na Benue nwere okeala n'akụkụ mpaghara ugwu ya nke dị nso n'Osimiri abụọ a kpọrọ Ichelle na Igbe, ebe ya na Krọss Riva nwere okeala na mpaghara ọwụwa anyanwụ ya.
Ọzọ, ya na Abịa steeti gbara na mpaghara ndịda, ebe ya na Enugwu nwere okeala n'ọdịda anyanwụ.
Abịa: Etu e siri kepụta steeti a na-akpọ nke Chineke

E kepụtara Abịa n'ọnwa Ọgọst n'afọ 1991 site n'Imo steeti.
Steeti ahụ nke isi obodo ya bụ Ụmụahịa bụ steeti a mara dịka steeti nke Chineke "God's own state".
Abịa na Imo steeti nwere okeala na mpaghara ndịda ya, Cross Riva na mpaghara ọwụwa anyanwụ, Rivas steeti na ndịda, Anambara na mpaghara ugwu ndịda, ebe ya na Enugwu na Ebonyi nwere okeala na mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ ya.
Abịa bụ steeti eji imepụta uwe Akwete, mmanụ nri na akwụkwọ nrị ụgụ were mara dịka gọọmentị Abịa steeti siri kwuo na websịtị ya.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC kpọtụrụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Abịa steeti Okey Kanu iji nwete ihe ha nwere ikwu maka steeti ahụ, o kwuru na ọ ga-akpọtụrụ anyị oge na-adịghị anya.
Dịka akụkọ ihe mere eme siri kwuo, Abịa bụ steeti nwetere aha ya site na mkpụrụedemede mbụ nke aha mpaghara anọ ndị mmadụ kacha bi na ya na steeti ahụ gụnyere Aba, Bende, Isuikwuato, na Afikpo.
Websịtị steeti ahụ kwukwara na e jiri azụmaahịa, nka na mmepụta nri n'ugbo were mara steeti ahụ.
Ha kwuru na obodo Aba a ma ama malitere iwu ewu n'afọ 1929 maka ngagharịiwe ụmụnwaanyị Aba mere megịde ụtụisi ọchịchị ndị ọcha Naịjirịa.
Ụlọọrụ Ncp kwuru na ọnụọgụgụ mmadụ bi na steeti ahụ nwereike ịkarị nde 4.1 n'afọ 2022.









