Ihe mere m ji sị na m akachaala - James Okoye

James Okoye a ma dịka 'Ebube Anaedo'.

Ebe foto si, BBC/Screengrab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 7
Aha onyonyo, James Okoye: Ihe mere m ji sị na akachaala m

Otu nwoke wuru ewu na soshal midia maka ịjụ ụka Kraistị ekwuola na iwe ya o ji kụchaa akpụkpọ ụkwụ ya jụ ụka Kraịstị bụ enyeghị Senetọ Ifeanyi Ubah ugwu pụrụ iche maka ịrụlite ụlọụka dịka ya na ụfọdụ ndị Nnewi tụrụ anya.

James Okoye a ma dịka 'Ebube Anaedo', onye Nnewi, Anambara steeti kọwara BBC Igbo na mkparịtaụka na Senetọ Ụba tụnyere nde kwuru nde naira n'ịrụlite ụlọụka ahụ tupu ọ nwụọ, mana e nyeghị ohere ịkara ya ụka ọkwụ maọbụ nye ya ugwu pụrụ iche ka e mere emume mgbape nnukwu ụlọụka ahụ a kpọrọ " 'Our Lady of Assumption,Nnewi.

"Ọ bụghị ihe m kwadoro gaa ka o mee. Ihe m gara ebe ahụ bụ ka m ga mara na ihe ahụ m na-arịọ onyeisi ụkọchukwu, ihe ahụ m rịọchara ya n'ime, ọ baa mba, rịọkwa ya n'ihu akwụkwọ(Facebook), ka m gaa mara na ọ ga-emezi ya ,kwanyere nwanne anyị ahụ bụ Ifeanyị Ubah ugwu."

Onye nnukwu ụkọchukwu nke Dayosii Nnewi bụ Bishopụ Jnobnas Benso nọ n'ofufe nro e doro n'abalị 14 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026 iji gbape ụlọụka 'Our Lady of Assumption,Nnewi, kelee "Kadinal Arinze na ndị tụtara ihe eji wuo ụlọụka gụnyere Senetọ Uba lara mụọ..."

Mana Okoye kwuru na ọ bụ okwu a "fanyere n''ime okwu', o kwuru na Anambara steeti nwere Seneta Ubah abụọ ndị ọzọ nke mere ya ka okwu ahụ ghara iwe anya.

N'okwu na ndị Knight nyere ya akwụkwọ sị na ha achụọla ya, Okoye sara sị, : Mmadụ sịrị gị na ọ kachala ụka,otu otu dị n'ime ụka na-akpọ ya oku,. Azaghị m ha, ọ gachaa otutu izuụka, ha tụpụta akwụkwọozi" sị na ha achụọla m."

Ụlọọrụ Dayọsis Nnewi enyeghị BBC Igbo ọsịsa banyere ebubo Okoye boro Bishọpụ Benson. ọnụ na-ekwuru dayọsisi ahụ bụ Fr Ọnwudiiwe azaghị ekwentị ya nke ọ naasa ozi ezigara ya n'ekwentị tupu akụkọ a apụta.

Bishọpụ ma ụma jụ inye Ifeanyi Ubah ugwu pụrụ iche- Ezeimo, onye enyemaka ya

Prince Tony Ezeimo, Sir James Okoye na Senetó Ifeanyi Ubah lara mmúó

Ebe foto si, Tony Ezeimo.Nnewi City/Ifeanyi Ubah

Ndọrịtaụka ka na-aga n'ihu dịka otu onye ọgụ ụka Katọlik(knight) jụrụ ụka Kraịstị n'iwe n'ihi ebubo na a kwanyereghị Senetó Ifeanyi Ubah ugwu pụrụ iche dịka onye wuru ụlọụka 'Our Lady of Assumption Cathedral' ,Nnewi ,Anambara steeti.

Onye enyemaka pụrụ iche nke Ifeanyi Ubah n'okwu mmetụtara nnyocha iwu bụ Tony Ezeimo, kpọrọ ihe onyeisi nchụaja ụlọụka ahụ bụ Bishọpụ Jonas Okoye "ihe jọgburu onwe ya" kwuru sị,"Bishọpụ Jonas Okoye ma ụma ghara inye Ifeanyi Ubah ugwu kwesịrị ya."

" Ọ bụrụ na i sonyere usoro emume ahụ, ị hụ na o wepụtara oge kelee ndị gbara ndị Bishọpụ ụgbọelu, ma onye tere ụlọụka uhie, kelee ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị ndụ, mana onye wuru ntọala ụlọụka ma wulite ya rue na mgbamgba, Bishọpụ ekeleghị ya."

O kwuru na ikwu dịka ọ na-ekele Francis Kadinal Arinze, na Ifeanyị Ubah so na ndi rụrụ ụlọụka bụ, ka ọ bụrụkwa, dịka a kpọghị ezinaụlọ ya maọbụ nwunye ya oku bịa mmemme ahụ.

Prince Tony Ezeimo

Ebe foto si, Prince Tony Ezeimo

Ezeimo kọwara na dịka Bishọpụ mbụ nke Katidralụ ahụ bụ Bishọpụ Hillary Okeke kpọkọbara ndị mmadụ ka e me agbamọnya ego ịrụzi ụlọụka ahụ,Ifeanyi Ubah nyere nde naira iri natọ na asatọ(N38M).

Ezeimo bụ onye e ji 'Ikenga Nimo' mara kwuru sị,"O mechaa chọpụta na ọ ga-aka mma ka a tutuo ụlọụka ahụ bido ya n'isi."

Nnewi Dayọsis Katọlik asaghị okwu banyere ebubo ọhụrụ a.

Ọnụ na-ekwuru dayọsis ahụ bụ Fada Martin Onwudiiwe asaghị ozi BBC Igbo zigara ya n'ekwentị tupu akụkọ a pụta.

Sir James Okoye

Ebe foto si, Nnewi City

Nkọwa foto, Sir James Okoye kwuru na Bishọpụ ekelere ndị gbara ndị Bịshọpụ ụgbọelu ga jiri bịa emume n'ụzọ pụrụ iche mana hapụ nwoke wulitere ụlọụka ahụ

Cheta na ụbọchị 14 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026, Sir James Louis Okoye nọrọ n'ogige Ụlọụka 'Our Lady of Assumption yipụ akpụkwọụkwụ ya ma tie mkpu na ya ajụla Ụka Kraisti n'ihi nebubo na agwanyere Ifeanyi Ubah ugwu pụrụ iche dịka onye wuliterere Ụlọụka ahụ.

Ihe onyonyo ya fegharịrị na soshal midia ma kpalite ndọrịtaụka. ebe ụfọdụ kwadoro ya, ụfọdụ kwuru na ọ bụghị onye otu Kraịstị na mbụ.

Etu 'Knight' ụka Katọlik si jụ ụka Kraistị n'iwe n'ihi Ifeanyị Ubah na mmemme mgbape ụlọụka 'Cathedral' na Nnewi

Sir James Okoye, ime Ụlọụka Our Lady of Assumption Cathedral,Nnewi l, Senetọ Ifeanyị Ubah

Ebe foto si, Nnewi City/ Ifeanyi Ubah/Facebook

Otu nwoke ajụla nkwenye ya dịka onye otu Kraisti dịka e mere mmemme mgbape Ụlọụka "Our Lady of Assumption Cathederal, Nnewi n' nsonso a.

Sir James Louis Okoye, onye Okpuneze Nnewi dị n'Okpuru Ochichi Nnewi-North, nọrọ n'ogige ụlọụka a ma ama dịka 'Okwuana' kwupụta na ya agbahapụla okpukperechi ụka Kraist n'ihi iwe na a kwanyereghị Senetọ Ifeanyi Ubah ugwu pụrụ iche n'emume ahụ.

Senetọ Ifeanyị Ubah, onye bụbụ Senetọ na-anọchite Anambra-South n'Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria , onye nwụrụ n'afọ 2024 bụ onye a malitere owuwu ụlọụka ahụ ma nye ya nnukwu nkwado ego oge ọ dị ndụ.

Ime Ụlọụka Our Lady of Assumption Cathedral, NNewi

Ebe foto si, Nnewi Catholic Diocese/Facebook

N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, Sir Okoye kwuru n'iwe sị, " "Akachala m." "Nke a bụ ụbọchị ikpeazụ dịka onye otu KraistI".

"Ọbụladị ka mkpuru obi Ifeanyi Ubah) zuru ike na ndokwa, ị nụrụ ya?"

Nwoke ahụ a ma ama dịka 'Jalou' ji onu arịrị ga n'ihu sị, "Ka anyị kpọọ ihe ọjọ ihe ọjọọ. Ụkwụ m na-emetụ ala Okwuana dịka m na-ekwu ya, Ifeanyị Ubah , ndo o!."

Ka o kwuru nke , ọ kụchaa akpụkpọ ụkwụ ya aja, kpupụ oku 'knight ya; zọwara pụọ n'ogige ụlọụka ahụ.

Ọ bụghị eziokwu na akwanyereghị Ifeanyị Ubah ugwu- Nnewi Katọlik Dayosis

Bishọpụ Jonas Okoye

Ebe foto si, Nnewi Catholic Diocese

Ụka Katọlik na Nnewi Dayosis ekwuola na ọ bụghị eziokwu na a kwanyereghị Ifeanyi Ubah ugwu n'ofufe nro e mere iji gbapee ụlọụka ọhụrụ ahụ.

Na mkparịtaụka nke BBC na ọnụ na-ekwuru dayosis ahụ bụ Fada Martin Onwudiwe nwere n'ekwentị, o kwuru na " Nke bụ eziokwu bụ na ọ bụrụ na i gee ntị nke ọma oge Bishọpụ Jonas Benson Okoye na-ekwu okwu,ọ kpọrọ aha kpọmkwem na ọ bụ Bishọpụ bu ya ụzọ malitere ịrụ ụlọụka ma kpọkwa aha Ifeanyi Uba lara mmụọ dịka onye nyere nnukwu nkwado."

"Ikekwe, nsogbu onye 'knight nwere bụ na ọ nụghị ka a kpọrọ oku dere ji otu nkeji maọbụ ekpere ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa."

Ndị chiri 'Knight' biara mmemme ahụ

Ebe foto si, Nnewi City/Facebook

Ọ gara n'ihu kwuo na ụka Katọlik agaghị ahapụ nwa amadi ahụ ka o were iwe gbakụta Chukwu azụ.

Fada Onwudiwe sịrị,"Anyị bụ Ụka Katọlik, ọrụ anyị bụ ime ka mmadu nile na Chineke dozie."

"Anyị agaghị ahapụya ka o jefuo n'ihi ihe ahụ ọ tụrụanya mana ọ hụghị ya."

Igwe Nnewi bịara emume ahụ

Ebe foto si, Nnewi City

Nkọwa foto, Igwe Nnewi Bụ Kenneth Onyeneke Orizu bịara emume ahụ

Ndị ma ihe ekwe na-akpụ na Nnewi gwara BBC na ọ bụ Ifeanyi Ubah malitere iwu ụlọụka ahụ oge ọchịchị Bishọpụ Hilary Okeke site na nukwu nkwado ego ma chọọ iwulite ya naanị ya tupu Bishọpụ nọ n'oche ugbua bụ Bishọpụ Jonas Okoye weghara ọkwa.

Etu mmemme mgbape Ụlọụka ahụ si gaa

Ndị ukwu na ndị nta gụnyere CardinalFrancis Arinze, Gọvanọ Anambara steetibụ Charles Soludo, onye zọburu ọkwa Onyeisiala Naijiria bụ Peter Obi,ojiegoachuego, Chukwuma Innocent Bishhọp ụka Katoli bụ Ezeokafor na ọtụtụ ndị ụkọchukwu tụrụ ka igwurube n'ofufe nro iji hafee ụlọụka 'Our Lady of Assumption, Nnewi n'aka Chineke.