Pastọ Chris Okafor enyefeela onwe ya n'aka ndị uweojii n'okwu ebubo mmetọ

Ebe foto si, Chris Okafor/Instagram
Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ụkọchukwu nwe ụlọụka 'Mountain of Liberation and Miracles Ministries' bụ Pastọ Chris Okafor enyefeela onwe ya dịka ọ zara oku ha kpọrọ ya na nsonso a.
Ndị uweojii Legọs kpọrọ Pastọ Chris Okafor oku ka ọ bịa n'ogige ha nke DC SCID, Panti zara ọnụ ya n'ebubo ndịna n'ike nakwa ịkpa agwa nwere ike ibute ọgbaghara na Monde abalị ise nke ọnwa Jenụwarị.
Mana Okafor zaghị oku ahụ ụbọchị a kpọrọ ya nke mere ka Komishona ndịuweojii na Legọs nye iwu ka a nwụchie ya.
Mana tupu a gaa ịnwuchi ya, Pastọ Chris nyefere onwe dịka ọ zara oku a kpọrọ ya.
Kọmịshọna ndị uweojii Legọs bụ Olohundare Jimoh, onye gbara ama nke a taa bụ Wenezde na mkparịtaụka ya na ụlọmgbasaozi TVC kwụrụ sị: "Anyị chere ya ụbọchị Monde, ahụghị m ya , m nwere nye iwu ka a nwụchie ya mana ọ bazịa ụbọchị Tuzde."
Jimoh gara n'ihu kwuo e wegala okwu ahụ n' ogige isi ụlọọrụ ndị uweojii nnke Etiti 'Zone 2 Headquarters' ebe Osote Onyeisi ndịuweojii Naijiria ga-eleba ya anya.
Ebe okwu si malite

Ebe foto si, Doris Ogala/Facebook
Okwu malitere kpọtụwa na nsonso a dịka otu onye ejije Nollywood bụ Doris Ogala boro ebubo n'ihe onyonyo o wepụtara na soshal midia na Pastọ Chris Okafor kwere ya nkwa ọlụlụ ma hapụ ya dịka ha abụọ yịchara ọtụtụ afọ, ga lụọ onye ọzọ na nsonso a.
Kemgbe ihe onyonyo ahụ pụtara, ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ ebola ya ebubo di iche iche nke gụnyere ebubo mmetọ na iji nkwa ụgha tụwa ha ime.
Mana Okafor agọọlaa na aka ya dị ọcha.
N'okwu ya , o kwuru sị, "Ihe nile e kwuru maka m abughị eziokwu."
Cheta na n'ozi ndí uweojii wepụtaburu n'okwu a, ha rụtụrụ aka na achọghị ịkpọ aha ndị e mọtọrọ, ebe ha kpọkwarara oku ka onye ọ bụla nwere ebubo mmetọ maọbụ ihe akaebe megide ụkọchukwu ahụ wetara ha mkpesa.










