'Mmadụ asatọ nwụrụ n'ọkụ 'Great Nigeria Insurance' - Sanwo-Olu ka ọ gara nleta abalị asatọ ọkụ gbachara

Aha onyonyo, Babajide Sanwo-Olu: Mmadụ asatọ nwụrụ n'ọkụ gbara 'Great Nigeria Insurance'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Babajide Sanwo-Olu

Ebe foto si, Lagos State Government

Aka na-achị Legọs steeti-Babajide Sanwo-Olu agaala nleta n'ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' gbara ọkụ ọ gachara abalị asaa.

Ọ nọrọ ebe ahụ gbaa ama na ọ bụ mmadụ asatọ nwụrụ, ebe a zọtara ndụ mmadu 13.

Ọkụ gbara ụlọọrụ ogogo 22 na Martin Streeti dị na Lagos Island, Legọs n'abalị foro ụbọchị Ekeresimesi(24/12/2025) n'ebe Elekere isii nke mgbede.

Sanwo-Olu onye gbara ama na ezinaụlọ mmadụ ise n'ime ndị nwụrụ kọtanwuru ndị nke ha, nyere ntuziaka ka eme nnyocha DNA iji mata ozu atọ ọkụ gbara nke na amaghịzị ndị ha bụ.

Ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance'gbara ọkụ

Ebe foto si, Legọs Steeti Government/Facebook

Nkọwa foto, Ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' gbara ọkụ na mgbede abalaị 24 nke ọnwa Disemba afọ 2025

Ndị nwụrụ na ihe mberede ọkụ ọgbụgba ahụ gụnyere ụmụnne atọ si n'otu afọ nakwa onye ojiegoachụego na ndị ọzọ tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ abalị ole na ole ka ọkụ ahụ gbachara.

Ụlọọrụ GNI gbara ọkụ

Ebe foto si, Lagos State government

Nkọwa foto, Ụlọọrụ GNI gbara ọkụ nansonso a

Ọtụtụ ngwahịa dara nde kwuru nde memilakwara n'ụlọọrụ nke e ji ụfọdụ ogogo mere ụlọ nkwasa ngwahịa.