Naijirịa, Legọs steeti gharịpụrụ ụmụnne m- Fada ụmụnne ya atọ nwụrụ n'ọkụ 'Great Nigeria Insurance'

Fr William Omatu na ụmụnne ya ndị lara mmụọ; Stephen Onyeka Omatu, Casmir Nnabuike Omatu na Collins Kenechukwu Omatu

Ebe foto si, Omatu Family

Nkọwa foto, Fr William Omatu na ụmụnne ya ndị lara mmụọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Nwanne nnukwu nke ụmụnne atọ nwụrụ n'ọkụ gbara ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' (GNI)bụ Fada William Omatu Eboola Gọọmentị Naijiria, ọkachasị nke Legọs steeti ebubo ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị dịka ụmụnne ya atọ na ndị ọzọ ha nwụọ na-enweghị enyemaka ọbụla n'ọkụ gbara.

Onyeka Omatụ, gbara afọ 40, Nnabuike Omatu gbara afọ 39 na Kenechukwu Omatu gbara afọ 37, so na ndị nwụrụ n'ọkụ gbara ụlọelu ogogo 22 a na-akpọ GNI n'ịchafụ na mgbede abalị 24 nke ọnwa Disemba afọ 2025.

N'ozi ya n'akwamaozu ụmụnne atọ ahụ, nke e mere n'obodo ha bụ Ihiala n'Anambara steeti, Fada Omatu sịrị, " Ọ bụ ihe mmute na Naijiria gbaghapụrụ anyị."

"Ọ bụ ihe mwute na Naijiria Hapụrụ anyị."

Ezinaụlọ Omatu n'akwamozu ụmụnne ha

Ebe foto si, Peter Obi

Nkọwa foto, Ezinaụlọ Omatu n'ụbọchị akwamozu ụmụnne ha na nsonso a

"Gọvanọ Legọs steeti, Ị gbaghapụrụ anyị."

Fada William tụrụ arịrị na ndị ọrụ mmanyụ ọkụ enyeghị aka ka o kwesịrị ma hapụ ọkụ ahụ ka ọ gbaa ọtụtụ ụbọchị na-enyenyụghị ya.

Fada Williams Omatu

Ebe foto si, Ogochukwu Ndubueze

"Ọkụ ahụ malitere n'ụbọchị 24 nke ọnwa Disemba, ọkụ ahụ gbara abalị 25, 26,27,28,29,30, 31, ebe ka gọọmentị nọ?"

Fada boro ebubo na-ewezuga ụmụnne ya atọ, na ndị ọzọ nwụrụ karịrị 100.

Akpatiozu Onyeka, Nnabuike na Kenechukwu Omatu

Ebe foto si, Ogochukwu Ndubueze

Mana oge Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu gara nle ta abalị asatọ gachara ọkụ ahụ ji gbawa, o kwuru na ọ bụ mmadụ asatọ nwụrụ n'ọdachi ahụ.

Cheta na ụmụnne atọ so na ndị ji ekwentị zipụrụ ozi itimkpu enyemaka dịka ha tọrọ n'ime ụlọọrụ ahụ gbara ọkụ ọtụtụ abalị ụlọọrụ ahụ malitechara gbawa ọkụ.

'Mmadụ asatọ nwụrụ n'ọkụ 'Great Nigeria Insurance' - Sanwo-Olu ka ọ gara nleta abalị asatọ ọkụ gbachara

Aha onyonyo, Babajide Sanwo-Olu: Mmadụ asatọ nwụrụ n'ọkụ gbara 'Great Nigeria Insurance'
Babajide Sanwo-Olu

Ebe foto si, Lagos State Government

Aka na-achị Legọs steeti-Babajide Sanwo-Olu agaala nleta n'ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' gbara ọkụ ọ gachara abalị asaa.

Ọ nọrọ ebe ahụ gbaa ama na ọ bụ mmadụ asatọ nwụrụ, ebe a zọtara ndụ mmadu 13.

Ọkụ gbara ụlọọrụ ogogo 22 na Martin Streeti dị na Lagos Island, Legọs n'abalị foro ụbọchị Ekeresimesi(24/12/2025) n'ebe Elekere isii nke mgbede.

Sanwo-Olu onye gbara ama na ezinaụlọ mmadụ ise n'ime ndị nwụrụ kọtanwuru ndị nke ha, nyere ntuziaka ka eme nnyocha DNA iji mata ozu atọ ọkụ gbara nke na amaghịzị ndị ha bụ.

Ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance'gbara ọkụ

Ebe foto si, Legọs Steeti Government/Facebook

Nkọwa foto, Ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' gbara ọkụ na mgbede abalaị 24 nke ọnwa Disemba afọ 2025

Ndị nwụrụ na ihe mberede ọkụ ọgbụgba ahụ gụnyere ụmụnne atọ si n'otu afọ nakwa onye ojiegoachụego na ndị ọzọ tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ abalị ole na ole ka ọkụ ahụ gbachara.

Ụlọọrụ GNI gbara ọkụ

Ebe foto si, Lagos State government

Nkọwa foto, Ụlọọrụ GNI gbara ọkụ nansonso a

Ọtụtụ ngwahịa dara nde kwuru nde memilakwara n'ụlọọrụ nke e ji ụfọdụ ogogo mere ụlọ nkwasa ngwahịa.