Chimamanda Adichie: E hiwela ikpe pụrụ iche maka inyocha ihe gburu nwa ya

Gọọmentị Legọs steeti ehiwela ikpe pụrụ iche iji nyochaa ihe gburu nwa onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie nke ga-amalite n'abalị 14 nke ọnwa Eprel afọ 2026.
Ikpe nnyocha ahụ nke a ga-eme n'ụlọikpe Majie nke Yaba(Yaba Magistrate Court) na-abịa ka ọ gachara izuụka asaa nwa Adichie bụ Nkanu Nnamdi Esege dị ọnwa 21 nwụrụ n'ụlọọgwụ Euracare Hospital dị na Legọs ka ha lọtara Naijirịa ịgba Ekeresimesi.
Adichie na-ebo ụlọọgwụ Euracare ebubo nleghara anya, dịka o kwuru na ọ bụ amaghịeme ha kpatara ọnwụ ya nwoke bụ Nkanu nnamdi, mana ndị ụlọọgwụ ahụ gọpụrụ onwe ha.
Dịka a malitere ikpe ahụ ụbọchi Wenezde, ọkaikpe maji nọ n'isi ikpe ahụ bụ Atinuke Adetunji nyere ndị nile ikpe ahụ metụtara ka ha weta akwụkwọ ihe ndị akaebe ha kwuru tupu innyocha ahụ amalite.
Chimamanda Adichie enyela ụlọọgwụ Euracare ụbọchị asaa iji wepụta ozi niile gbasara nwa ya nwoke

Ebe foto si, Chimamanda Adichie/Instagram
Odee akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie enyela ụlọọgwụ Euracare mkpụrụ ụbọchị asaa iji wepụta ozi niile gbasara nwa ya nwoke nwụrụ n'ụlọọgwụ ahụ izuụka gara aga.
Adichie na-ebo ụlọọgwụ Euracare ebubo nleghara anya, dịka o kwuru na ọ bụ amaghịeme ha kpatara ọnwụ ya nwoke bụ Nkanu nnamdi, mana ndị ụlọọgwụ ahụ gọpụrụ onwe ha.
Ọnọdụ a na-abịa n'ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole Chimamanda Adichie kwupụtara gbasara nwa ya nwụrụ n'ụbọchị 7 Jenụwarị, 2026 n'ụlọọgwụ ahụ.
Akwụkwọ ahụ e mere ka o rute BBC aka kwupụtara ọtụtụ iwe Chimamanda na onye otu ya bụ Esege, ma gwa ụlọọgwụ ahụ ka ha mara ihe ha mere ngwangwa ha nwetara akwụkwọ ahụ.
Akwụkwọ ikpe ahụ nke ụlọiwu na-ekwuchitere ezinaụlọ Adichie bụ Kemi Pinheiro binyere aka boro ebubo na na ụlọọgwụ ahụ, onye dọkịta na-agba ọgwụ ụra na ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ arụghị ọrụ ezi nlekọta dịịrị ha n'ebe nwa ha nwụrụ anwụ nọ.
Ha bokwara ebubo na ụlọọgwụ ahụ eletaghị nwa ha anya nke ọma dịkwa ka ha na-abasoghị usoro kwesịrị ekwesị n'ụzọ ha siri leta nwa ahụ.
Gọọmenti Legọs Steeti amalitela ime nnyocha maka ọnwụ nwa Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Sanwo-Olu, BBC
Gọọmenti Legọs Steeti amalitela ime nnyocha gbasara ebubo ezinaụlọ nwaafọ Naịjirịa na-ede akwụkwọ bụ Chimamanda Adichie boro sị na ọ bụ amaghịeme ndị ọrụ ahụike kpatara ọnwụ nwa ya nwoke.
Onye ndụmọdụ Gọvanọ Legọs Steeti n'okwu ahụike bụ Dọkịta Kemi Ogunyemi kwuru na mịnịstrị ahụike steeti ahụ na-eme nnyocha iji mara ihe kpatara ọnwụ Nkanu Nnamdi.
Dọkịta Ogunyemi kwuru na onye maọbụ ndị ọbụla a chọpụtara na ha emeghị ihe ha kwesịrị ime maọbụ ghara iso usoro iwu kwadoro, nke butere ọnwụ nwatakịrị ahụ, ga-enweta ntaramahụhụ dịka iwu si kwuo.
Ọ gwara ọhanaeze ka ha ghara ifesa ozi ụgha maọbụ gee ntị n'akụkọ ụfọdụ banyere ọnwụ Nkanu Nnamdị dịka nnyocha na-aga n'ihu.
Ihe ndị ezinaụlọ Chimamanda Adichie kwuru gbasara ọnwụ nwa ha nwoke

Ebe foto si, Anthea Esege Nwandu/LinkedIn
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ezinaụlọ nwaafọ Naịjirịa na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Chiamamanda Ngozi Adichie ebola ebubo na ọ bụ amaghịeme ụlọọgwụ kpatara ọnwụ nwa ya nwoke dị naanị ọnwa iri abụọ na otu.
Ozi ezinaụlọ Chimamanda wepụtara kwuru na otu n'ime ụmụ ejima Chimamanda mụrụ n'afọ 2024 aha ya bụ Nkanu Nnamdi nwụrụ dịka ọ rịara ntakịrị ọrịa site na ndahie na amaghịeme ndị ụlọọgwụ Euracare Hospital dị na Legọs steeti.
Ozi ahụ mere ka o doo anya na ụlọọgwụ ahụ enyeghị nwatakịrị ahụ ihe e ji eku ume bụ 'oxygen' ma nyefee ya ọgwụ ụra Bekee kpọrọ 'sedation drug' oke nke mere ka Nkanu nwee nkụchi obi bụ 'heart attack' na Bekee.
Chimamanda Adichie gbara afọ 48, mụrụ nwa mbụ ya bụ nwa nwaanyị n'afọ 2016.
Nkanu Nnamdi bụ otu n'ime ụmụ ejima abụọ Chimamanda Adichie na di ya bụ Dọkịta Ivara Esege mụtara n'afọ 2024, nke nwaanyị ọzọ buru afọ ime ha bụ 'surrogate' n'asụsụ Bekee.
Otu onye ezinaụlọ Adichie bụ Dọkịta Anthea Nwandu boro ụlọọgwụ ahụ ebubo dị iche iche oge ụlọọrụ mgbasaozi Arise Tv gbara ya ajụjụọnụ n'ụbọchị Satọde 10 Jenụwarị, 2026.
N'okwu ya 'Onyeisi ụlọọgwụ Euracare gwara Chimamanda na e nyere nwa ya "oke ọgwụ ụra", nke mere ka obi ya kpọchie.
Dọkịta Nwandu boro ebubo na ndị ọrụ ụlọọgwụ ahụ hapụrụ nwatakịrị ahụ, ghara ileta ya ma bụgharịa ya "n'ụzọ na-ekwesịghị ekwesị".
O kwuru na Nkanu merụrụ ahụ n'ụbụrụ maka na e nyeghị ya oxygen e ji eku ume.
Ozi banyere ebubo etu e si leta Nkanu fesara n'ịntanetị mana a maghị onye wepụtara ya.
Ọnụ na-ekwuru Chimamanda bụ Omawumi Ogbe gwara BBC na ozi ahụ bụ naanị ezinaụlọ Adichie na ndị enyi ha ma maka ya, ma kwuo na ọ bụghị maka ọhanaeze.
Ogbe kwuru na ọ dị mwute na ozi fesara n'ịntanetị ma kwuo na ọ dị mkpa ka e leba anya n'ihe kpatara oke ọdachi a dakwasịrị ezinaụlọ Adichie dịka ha na-atụanya ịchọpụta nke bụ eziokwu.

Ebe foto si, Lagos State Ministry of Health
Ụlọọgwụ Euracare zigaara ezinaụlọ Adichie ozi iti aka n'obi ma kwuo na ha rụrụ ọrụ ha banyere ahụike nwatakịrị ahụ n'usoro iwu mbaụwa kwadoro. Ụlọọgwụ mere ka o doo anya na ụfọdụ akụkọ na-efegharị n'ịntanetị banyere etu ha si kpaa agwa na nleta Nkanu Nnamdi abụghị eziokwu.
Ha kwuru na e si n'ụlọọgwụ ụmụaka abụọ ndị ọzọ e bugara Nkanu bute ya n'ụlọọgwụ ha n'oke ọrịa. Ha kwuru na ha malitere inye ya nleta site n'usoro iwu nleta ụlọọgwụ ọbụla si kwuo ma kọwaa na ha ji usoro e ji enye ọgwụ ụra nye Nkanu ọgwụ.
Ha gara n'ihu kwuo na ha na ndị Dọkịta mba ofesi ezinaụlọ ahụ rụkọrọ ọrụ iji hụ e letara nwatakịrị ahụ anya nke ọma.
Ka ọ dị ugbua, ụlọọgwụ Euracare kwuru na a malitela ime nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọnwụ nwatakịrị Nkanu Nnamdi ma kwuo na ha kwụ chịm inye nkwado ọbụla na nnyocha ahụ.
Onyeisiala Tinubu etiela Chimamanda Adichie aka n'obi maka ọnwụ nwa ya nwoke

Ebe foto si, Chimamanda Adichie
Onyeisiala Naijiria bụ Bola Ahmed Tinubu ezigarala ezinaụlo onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Chimamanda Adichie ozi iti aka n'obi maka ọnwụ nwa ya nwoke.
Otu n'ime ụmụejima Adichie nwụrụ n'ụbọchị Wenezde ka ọ rịachara ahụ nwa oge, dika akwụkwọ ozi ezinaụlọ ahụ wepụtara ụbọchị Tọzde siri kwuo.
Ozi ahụ kwuru na nwata ahụ bụ Nkanu Nnamdi dị ọnwa 21 nwụrụ ka ọ rịachara ahụ nwa oge.
Onyeisiala Tinubu kwuru n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga binyere aka ma wepụta sị, " Ọ bụ n'nnukwu obi iru ụjụ ka m ji akasi Ms Chimamanda Ngozi Adichie, di ya bụ Dr Ivara Esege, na ndịezinaụlọ ha nile obi n'ihi ọnwụ nwa ha nwoke bụ Nkanu Nnamdi."
Tinubu onye kwuru na o nweghị ihe na-afụ ụfụ ka nwa ịnwụnarị ndị mụrụ ya, gara n'ihu kpee ekpere nkasiobi.
Chimamanda Adichie, gbara afọ 48, onye e jiri akwụkwọ, 'Half of a Yellow Sun' mara, mụrụ nwa ya mbụ n'afọ 2018.
O mechara mụta ụmụejima n'afọ 2024 site na-enye maka onye ọzọ buru ya afọ ime.






























