Chimamanda Adichie: Ihụnanya na omiiko kọrọ ụkọ n'ụka na Naịjirịa

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Chimamanda Adichie/Instagram

Naịjirịa bụ ebe ihe gbasara ụka na-echu ọtụtụ ndị mmadụ ụra, mana ịhụnanya tọrọ atọ nakwa obi ọmiko dịka ọ kọrọ ụkọ.

Nke a bụ ọkpụrụkpụ nghọta si n'akwụkwọ ozi ode akwụkwọ Chimamanda Adichie dere gbasara akwụkwọ ozi nke si n'aka onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Pope Francis.

N'ime akwụkwọ ozi a ọ kpọrọ 'Encyclical Fratelli Tutti ', Pope Francis oku ka ndị otu Kraịst jikọọ ọnụ "dịka otu ezinụlọ ebe mmadụ niile bụ nwanne".

N'itule akwụkwọ a Pope Francis dere, Chimamanda Adichie rụtụrụ aka n'ihe ụfọdụ na-emegasị n'ụka Katọlik na Naịjirịa, ọ kachasị site n'aka ụfọdụ ndị ụkọchukwu.

Nwaada Adichie kwuru na a mụrụ ya n'ụka Katọlik, ọ bụrụkwa onye ji Katọlik etu ọnụ, mana oge o tolitere, ọ malitere ịlaghachi azụ n'okwukwe n'ihi ụfọdụ ihe.

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda maka Biafra na Ipob

Lee ụfọdụ ihe ndị o metụrụ aka mere okwukwe ya ji mawa jijiji:

  • Ịkwụsị di na nwunye ịnata oriri nsọ maka na nwa ha lụrụ onye ụka Anglịkan
  • Ịjụ ili mmadụ n'ihi na o ji ụka ụgwọ nke onweghị ike ịkwụ tupu ọ nwụọ
  • Ịmanye ụmụnwaanyị ka ha were akwa kpuchie aka ha na ubu ha n'ụlọụka "ka ha ghara itinye ụmụnwoke n'ọnwụnwa"
  • Ịkatọ ụmụnwaanyị oge niile dịka a ga-asị na mmadụ ịbụ nwaanyị bụ ihe ọjọọ n'onwe ya
Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Chimamanda Adichie/Instagram

Nkọwa foto, Nne Chimamanda Adichie lara mmụọ n'ime ọnwa itoolu nna ya jiri nwụọ

Chimamanda Adichie kọwakwara etu ụkọchukwu obodo ya si kpaso ezinụlọ ya agwa n'oge akwamozu nne na nna ha.

"Ọtụtụ ihe ka a gaara iji obi ọmịiko mee, mana emeghị ya. Ọtụtụ ohere pụtara iji gosi nkwanye ugwu, mana ejigh ohere ndị a mee ihe," Adichie dere.

Nwaada Adichie gara n'ihu kọwaa etu ụkọchukwu si malite ịkatọ ya maka ihe o dere n'oge gara aga gbasara ụka na Naịjirịa.

Nke a bụ n'agbanyeghị na ha ka na-eru uju nne ha bụ onye ha liri naanị nwa oge nta ka ha lichara nna ha.

Adichie kwuru sị: "Anaghị m akpọ onwe m onye ụka Katọlik, kama abụ m onye na-enweta nkasịobi n'usoro ofufe ndị ụka Katọlik."

"Ana m atụ anya ụka ebe ihụnanya ka mkpa karịa iti iwu nakwa idebe iwu."

"Ana m atụ anya ụka ebe a na-asọpụrụ ndị ụkọchukwu ọbụghị ịtụ ha egwu."

"Ana m atụ anya ụka ebe ndị nchekwa agaghị na-agbarụ ihu mgbe ọbụla na-akụ aka n'oche ndị mmadụ."

"Ụka ebe a na-elekọta ụmụaka nke ọma, ebe ụkọchukwu anaghị eti ndị na-agba odibo na 'altar' ihe." Dgz.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ihe Chimamanda dere

Dịka akwụkwọ ozi a Chimamanda Adichie dere pụtara na soshal midia, ọtụtụ malitere itinye ya ọnụ, tinyere ụfọdụ ụkọchukwu Katọlik.

Chidiebere Benneth, onye ụkọchukwu, kwuru sị: "Nke a bụ eziokwu ma bụrụkwa ihe anyị kwesịrị ịgba mbọ maka ya."

Omokugbo Ojeifo, onye ụkọchukwu ọzọ, kwukwara sị: "Ọrụ dịịrị anyị buru ibu. Olileanya m bụ na anyị ga-agba mbọ etu o kwesịrị."

Mana Fada Agbo, bụkwa onye ụkọchukwu, dere sị, "Ọ dịghị mma ka e were agwa ọjọọ ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-akpa na-atụnyere ụka katọlik niile."

"Enwere ọtụtụ ụkọchukwu nakwa ọtụtụ ụlọụka ebe ihe ndị a Nwaada Adichie kwuru anaghị eme."