Chimamanda Adichie: Mmegide dị na Naịjirịa mana ekweghim na nwereonwe bụ ụzọ nzọpụta

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Bounce Radio screen grab/Youtube

Na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Bounce Redio nwere ode akwụkwọ Chimamanda Ngozi Adichie kọwaara etu o siri ahụ okwu banyere ikewa Naịjirịa nakwa atụmatụ inwete Biafra.

Dị ka ọ na-aza ajụjụ banyere Biafra, Adichie sị na onweghi ihe dị ka Biafra ugbua.

Ọ sị, "Onweghi ihe dị ka Biafra ugbua. Mana ihe m na-ajụkarị bụ, ebe ka okeala Biafra ga-adị?

Adichie sị na ihe na-akwalite otu dị iche iche na-achọ Biafra bụ uche na mmegide dị na Naịjirịa, bụ ihe ya kwenyere na ọ bụ ihe mere eme, mana o kwenyeghi na okwu bụ nwereonwe ga-egbo nsogbu a.

Ọ sị na ihe mere ya jiri eche etu a bụ makana o nwebeghi onye ọbụla kọwarala ya etu ọ ga-esi ghọta na atụmatụ ahụ bụ ihe ziri ezi.

Ọzokwa, dịka o siri kwuo, bu na ya "ahụla ajọ ọchịchị dị n'Ọwụwa Anyanwu".

Dịka o siri kwuo, "Ndi Igbo enweghị ike inwe nkwekọrịta n'onwe ha ma a sị ka ewepụta onye ga-abụ onyeisiala Naịjirịa si ala Igbo. Ha agaghị enwe nkwekọrịta. Ma anyị a na-ekwu makwa Biafra?"

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ enweghi ezigbote ndị ọchịchi bụ nsogbu ndị Igbo nke kpatara na ọrụ dịrị ndi Igbo banyere ndọrọndọrọ ọchịchị.

"Anyị kwesiri ịtụgharị uche banyere etu anyi si eche maka ndọrọndọrọ ọchịchị tupu anyi ekwuwe maka Biafra.

Etu m siri nwete aha Chimamanda

Aha onyonyo, Okwu Chimamanda kwuru maka ụgwọ isi

Dịka ọ gwara Ebuka Obi-Uchendu bụ onye na-agba ya ajụjụọnụ, Chimamanda sị na ọ bụghị 'Chimamanda' ka nne na nna ya kpọrọ ya n'oge ha mụrụ ya.

Ọ sị: "Ọ bụ Ngozi na Grace ka nne na nna m gụrụ m na nwata."

Ọ sị na ọ bụ dịka o mechara baptizim n'ụlọụka Katọlịk ka ọ gbanwere aha ya wee zawa Amanda.

Adichie sị: "Ụkọchuwku ekweghi na a ga m aza Amanda maka ọ sị na ọ bụghị aha onye nsọ, mana o mechara kwere ka m zaa aha a."

Dịka o si kwuo, ọ bụ n'oge ọ gara mahadum na mba ofesi ka Chimamanda bịara chọwa etu ọ ga-eji gbanwee aha ya ọzọkwa.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ dịka akwụkwọ mbụ ya bu Purple Hirbiscus na-achọ ịpụta ka ọ chọwara aha Igbo ọ ga-aza.

"Ngozi bụ aha nne na nna m gụrụ m mana ọ bụghị aha m chọrọ. Ọ bụ ka m tụgharịchara uche etu m ga-esi gbanwee Amanda ka ọ bụrụ aha Igbo mere m ji tinye ya 'Chim'.

Nke ahụ meziri o ji bụrụ 'Chimamanda' dịka ndị mmadụ ji maara m ugbua."

Aha onyonyo, Irite 'Women Prize for Fiction' mepere m ụzọ - Chimamanda Adichie

Adichie gara n'ihu kwuo na kemgbe o mechara nke a, na ọtụtụ mmadu na-agụzi ụmụ ha Chimamanda.

Ọ sị; "Ọkara ụmụaka n'ala Igbo na-azazi Chimamanda."

Adichie gara n'ihu kwuo na otu ihe na-amasị ya ugbua bụ na etu o ji gbanwee aha ya gosiri na omenala nwereike ịgbanwe.

N'ikpeazụ ọ sị na nne na nna ya nabatara aha ọ gbanwere maka ha na-akpọkwa ya Chimamanda.