'Ọtụtụ ndị na-eyi ndụ egwu nwụrụ oge Amerịka tụrụ ogbunigwe na Sokoto'

Ndị oyi ndụ egwu ole nwụrụ oge Amerịka tụrụ ogbunigwe na Sokoto?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị isi okpuru ọchịchị Tangaza dị na Sokoto Steeti agwala BBC na a tụrụ ogbunigwe na mpaghara ahụ.

Oge ha na-agwa ndị ntaakụkọ BBC okwu, ha kọwara na ọ bụ n'ogige "ndịagha nnupuisi Lakurawa" dị iche iche ka ogbunigwe ndị ahụ dara.

Onyeisi okpuru ọchịchị Tangaza bụ Salihu Bashir kwuru na ogbunigwe ndị ahụ tụtara "ụfọdụ ogige ndị otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu".

Dịka Bashir siri kọwaa, ọtụtụ n'ime ndị otu Lakurawa nwụrụ site n'ogbunigwe ahụ, mana o nweghị ike kwupụta mmadụ ole ha dị.

Bashir gara n'ihu gwa BBC na ndị uweojii Naịjirịa na ndịagha enwebeghị ike banye n'ogige ndị ahụ a tụrụ ogbunigwe, n'ihi nnukwu ọkụ ọgbụgba sochiri ogbunigwe ahụ.

Sokoto Steeti na mba Niger Republic nwere okeala. Bashir kwuru na ndị nchekwa okeala Niger sị na ha hụrụ mgbe ndị otu Lakurawa na-agbapụ oge ogbunigwe dara n'ogige ha.

Lakurawa bụ ndịagha nnupụisi Alakụba malitere oge na-adịbeghị anya, dịka ha na-eme mwakpo n'ụfọdụ akụkụ Sokoto na Kebbi Steeti, tinyekwara mba Niger Republic.

Ndịagha Amerịka kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n'ogige ndị otu ahụ dị na Sokoto Steeti, n'akụkụ okeala Naịjirịa na mba Niger Republic.

Na mgbakwunye, ndịagha Amerịka sịrị na nnyocha ndị ha buru ụzọ mee gosiri na ọtụtụ ndị otu ahụ nwụrụ.

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kọwara ogbunigwe ahụ a tụrụ n'ụbọchị Ekeresimesi dịka nke dị ezigbo njọ nakwa nke siri ike.

Trump kọwara otu ahụ dịka "ndị iberibe na-eyi ndụ egwu" ma boo ebubo na akaọrụ na ebumnobi ha agwụla igbu ndị nke Kraịst aka ha dị ọcha".

Ka o sina dị, Minista Naịjirịa na-ahụ maka mba ofesi bụ Yusuf Maitama Tuggar gwara BBC na agha ahụ bụ nke e jikọtara aka buo" ma kwuo na e nweghị etu o siri metụta okpukperechi ọbụla.

Kedụ ebe ndịagha Amerịka mere mwakpo na Naịjirịa?

Maapụ ebe ndị ogbunigwe Amerịka dara
Nkọwa foto, Maapụ ebe ndị ogbunigwe Amerịka dara

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwuru na ha "atụọla ogbunigwe ọjọọ" megide ndị otu Islamic State na Naịjirịa.

N'ozi o bipụtara n'akara ọbaozi Truth Social, Trump sịrị: "site na ntụziaka m dịka Ọchịagha Kachasị, mba Amerịka atụọla ogbunigwe ọjọọ megide ndị ISIS iberibe na-eyi ndụ egwu na mpaghara ugwu Naịjirịa".

"Ndị anyị lekwasịrị anya bụ ndị ahụ akaọrụ ha bụ igbu ndị nke Kraịst n'ogogo nke a na-ahụbeghị kemgbe ọtụtụ afọ."

Map

Ka ọ dị, ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midịa kwuru na ọ bụ na mpaghara Jabo dị na Sokoto Steeti ka ogbunigwe ahụ dara.

Mana ụfọdụ mmadụ ewepụtala onyonyoo na foto dị iche iche na soshal midịa ma kwuo na ogbunigwe ndịagha mba Amerịka dakwara n'obodo Offa dị na Kwara Steeti.

BBC enwebeghị ike chọpụta ma akụkọ ndị a ha bụ eziokwu, kama ihe doro anya bụ na ndịagha Amerịka tụrụ ogbunigwe na Sokoto Steeti megide otu ndị na-eyi ndụ egwu.

N'otu aka ahụkwa, ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Naịjirịa bụ Bayo Onanuga, ewepụtala ozi n'akara ọbaozi X ya kwuo na ndịagha Amerịka tụkwara ogbunigwe na Zamfara Steeti.

Kedụ ebe ndịagha Amerịka mere mwakpo na Naịjirịa?

Ebe foto si, Screenshot

Ọnọdụ a na-abịa dịka Trump bochara ebubo na a na-ekpochapụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa, bụ nke mere o jiri kwupụta Naịjirịa dịka mba e kwesịrị ilebara anya.

N'ozi ahụ o wepụtara maka mwakpo ha mere na Naịjirịa, Trump sịrị "adọọla m ndị a na-eyi ndụ egwu aka na ntị na ọ bụrụ ma ha akwụsịghị ogbugbu ha na-egbu ndị nke Kraịst, na ha ga-ahụ ihe ọkụ ji ntị oke eme, ma ha ahụla ya n'abalị a".

"Ngalaba na-ahụ maka agha tụrụ ọtụtụ ogbunigwe nke ọma dịka naanị mba Amerịka si eme ya. N'oge a m bụ onyeisiala, mba anyị agaghị ekwe ka ọ dịrị ndị oyi ọha egwu Alakụba na mma," ka ozi ahụ kwuru.

Ụfọdụ ihe ndị anyị ma gbasara mwakpo a

Ozi onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump wepụtara n'akara Truth Social

Ebe foto si, Donald Trump

Odeakwụkwọ agha mba Amerịka bụ Pete Hegseth kwuru na ọ bụ eziokwu na Amerịka mere mwakpo na Sokoto, site n'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi X ya.

Mana, Hegseth gbakwunyere na ha mere mwakpo ahụ site na nkwado Gọọmenti Naịjirịa.

Ka o sina dị, ụlọọrụ US Africa Command (Africom) wepụtakwara ozi n'akara ọbaozi X ha ma kwuo na agha ha buru na Sokoto bụ site na nkwado ndị ọchịchị Naịjirịa.

"Site na ntụziaka Onyeisiala Amerịka na Odeakwụkwọ Agha, tinyekwara mgbakọaka ndị ọchịchị Naịjirịa, ụlọọrụ US Africa Command tụrụ ogbunigwe megide ndị oyi ndụ egwu ISIS na Naịjirịa n'ụbọchị 25 Disemba, 2025, na Sokoto Steeti," ka ozi ahụ kwuru.

Gọọmenti Naịjirịa ekwuola na Amerịka mere mwakpo na Sokoto

Ozi mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mba ofesi wepụtara

Ebe foto si, @NigeriaGov/X

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mba ofesi kwuru na ha na mba Amerịka jikọtara aka mee mwakpo na Sokoto Steeti.

N'ozi ha bipụtara n'akara ọbaozi X ha, mịnịstrị ahụ kwuru na Naịjirịa gbakọọrọ ndị otu ha na mbaụwa aka, nke gụnyere mba Amerịka, iji zute nsogbu iyi ndụ egwu na oke tigbuo zọgbuo a na-ahụta na Naịjirịa.

Ha kwuru na site na mgbakọaka ahụ, "a tụrụ ogbunigwe ndị a haziri ahazi na mpaghara ugwu Naịjirịa site n'elu.

"Site n'usoro e wepụtara na mbaụwa nakwa nghọta mba na mba, mgbakọaka a gụnyere ịgbanwerịta ozi, atụmatụ ndị a haziri ahazi na ụdị nkwado ndị ọzọ gbasoro iwu mbaụwa, nkwanyeugwu maka nkwụrụnankeonwe nakwa njikere anyị dị nye nchekwa mpaghara anyị, na mbaụwa," ka ozi ahụ gbakwunyere.

Ozi ahu gakwara n'ihu kwuo na agha ha na-ebu megide iyi ndụ egwu bụ nke gbakwasara ụkwụ "n'ichekwa ndụ ụmụ mmadụ, ikpuchite idinotu mba anyị nakwa ịkwalite ikike na ugwu nke ụmụafọ anyị niile, n'agbanyeghị okpukperechi maọbụ agbụrụ ha."

Na nso nso a ka obi ọchịchị White House belatara aka gbasara etu ha si enye ndị Naịjirịa akwụkwọ njem visa, ma kwuo na "otu ndị na-eyi ndụ egwu dịka Boko Haram na Islamic State na-akpa ike n'ụfọdụ akụkụ Naịjirịa na-eme ka nnyocha raa ahụ."

Ka o sina dị, mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mba ofesi kwuru na ha ga-azaghachi mmachi njem a site na mkparịtaụka.