Aga m ezigara Donald Trump ihe niile m chọpụtara na Naịjirịa – Riley Moore

Aga m ezigara Donald Trump ihe niile m chọpụtara na Naịjirịa – Riley Moore

Ebe foto si, Riley Moore/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Omeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ekwuola na njem nchọcha ọ gara na Naịjirịa abịala na njedebe.

N'ozi onye omeiwu ahụ bipụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Tọzde 11 Disemba 2025, ọ sịrị na ya alaghachila Amerịka dịka nchọcha ya kụụrụ ọnụ.

Riley Moore bụ onye nnọchiteanya mba Amerịka e zigara Naịjirịa iji chọpụta ma ọ bụ eziokwu na a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na mba ahụ dịka Onyeisiala Trump siri kwuo.

N'ozi ya, Riley Moore sịrị: "Oge m nọ na mba ahụ, agara m Benue Steeti ma zute Bishọpụ Anagbe na Dugu tinyekwara Eze ndị Tiv bụ Tor Tiv".

"Anyị zutere ndị gbara ọsọ ndụ na-ahụju anya, ndị bụcha ndị na-eso ụzọ Kraịst. A manyere ha ibi n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ, nke ndị Fulani Alakụba na-akpa ike na-awakpo kwa mgbe kwa mgbe".

"Anyị nụrụ akụkọ na-agbawa obi site n'ọnụ ndị gbanarịrị atụmatụ mkpochapụ ndị na-eso ụzọ Kraịst nke ndị Fulani na-eme, tinyere otu nwaanyị ha manyere ka ọ na-ekiri ha oge ha na-egbu ụmụ ya ise".

"Ahụtụbeghị m ihe dị etu a. Ọ ga-adịgide m n'obi ruo ụbọchị ndụ m niile."

Moore kwuru na ya na-achịkọta ozi ọ ga-ezigara onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump gbasara ihe niile ọ chọpụtara.

Ọ sịrị na nke ahụ ga-ekepụta ụzọ ha na Gọọmenti Naịjirịa ga-esi gbakọta aka iji kwụsị ogbugbu a na-egbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na mpaghara Middle Belt, ma kwụsịkwa iyi ndụ egwu na-aga n'ihu na mpaghara Northeast nke Naịjirịa.

Ihe na-agbawa obi ụmụ Naịjirịa nọ na IDP kọọrọ anyị - Riley Moore, Omeiwu Amerịka

Riley Moore bụ onye omeiwu si mba Amerịka

Ebe foto si, Riley Moore / x

Nkọwa foto, Riley Moore

Omeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore agbaala ama na ya zutere ọtụtụ ndị Benue steeti gabigara ihe oke egwu nke mere kasi n'obodo ha gbaa ọsọ ndụ ndị kọọrọ ya ihe ụfụ ha gabigara.

N'ozi o wepụtara n'akara X soshal mịdịa ya na Disemba 10, 2025, Riley Moore kwuru , "Otu nwaanyị kwuru na ya na-ekiri ka e gburu di ya na ụmụ ya ise. Mana ya na nwa o bu n'afọ gbalahụrụ ọnwụ.".

Riley Moore bụ onye omeiwu si mba Amerịka

Ebe foto si, Riley Moore / X

Nkọwa foto, Riley Moore

"Nwaanyị ọzọ kọwara etu e si gbuo ezịnaụlọ ya, jiri mma dọpụta nwa dị n'afọ nwaanyị dị ime".

"Otu nwoke ọzọ ka a nọ n'ihu ya gbuo ezinaụlọ ya ma gbujie ya aka".

Moore gara n'ihu kwuo na mmadụ karịrị narị puku isii(600,000) nọ n'ogige ndị gbara ọsọ ndụ na steeti ahụ.

"E kwesiri inye ndị ụka Kraịst ndị a niile ohere ka ha lọghachi n'ala nna ha na-enweghị ụjọ ndị Fulani ojiegbe ".

Ndị ụlọomeiwu mba Amerịka abịara Naịjirịa ịchọpụta maka ebubo mkpagbu ndị ụka kraịst

Mgbe omeiwu Riley Moore zutere Bishọp Wilfred Anagbe nke Katọlịk dayọsis Makurdi, Benue steeti, Naịjirịa.

Ebe foto si, RepRileyMoore/x

Ndị omeiwu mba Amerịka ruru mmadụ ise abịala njem nchọpụta ihe banyere ebubo mgbukpọ ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.

Onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa bụ Nuhu Ribadu mere ka a mata nke a n'akara X soshal mịdịa ya.

Ribadu kwuru na ya nabatara ndị omeiwu ahụ ma kwuo na njem nchọpụta ihe ha bịara bụ nke na-eso ọgbakọ ya na ha nwere na mbụ na Washington D.C na mba Amerịka n'abalị ole ma ole garaaga.

Cheta na ọtụtụ ihe emeela kamgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump dọchara aka na ntị ma majaa sị na ndịagha mba Amerịka ga-abịa gbuo ndị na-eyi ọha egwu na Naịjirịa ma ọ bụrụ na gọọmenti Naịjirịa emeghị ihe ọbụla.

Kamgbe ahụ, mba Amerịka etinyela Naịjirịa n'ọnọdụ a kọwara dịka mgba ekwesiri ịgbakwasị anya nke ha kpọrọ 'country of particular concern' (CPC).

Gọọmenti mba Amerịka wepụtakwara ozi sị na ha ga-amachị ọtụtụ ndị mmadụ aka ha dị n'ogbugbu ndị ụka Kraịst ipụ na Naịjirịa.

"Ihe mụ na ha kpara" - Ribadu

Nuhu Ribadu bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa maka nchekwa.

Ebe foto si, Nuhu Ribadu / X

Nkọwa foto, Nuhu Ribadu

Nuhu Ribadu kwuru na mgbe ndị omeiwu mba Amerịka mmadụ ise ndị ahụ bịara na ya nabatara ha ma jikwara ohere ahụ kpaa ezigbo nkata.

Ọ kọwara na ihe ha kpara gbadoro ụkwụ n'ọnọdụ nchekwa, ijikọta aka ọnụ buso ndị na-eyi ọha egwu agha, atụmatụ njekwa na mmekọ n'etiti mba Naịjirịa na mba Amerịka.

Ribadu kwuru na ya nwere olileanya na nkata ha kpara nakwa njem ha bịara na Naịjirịa ga-amịta ezi mkpụrụ.

Lee ndị omeiwu mba Amerịka so bịa - Nuhu

Omeiwu mba Amerịka bụ Mario Díaz-Balart

Ebe foto si, Mario Díaz-Balart / X

Nkọwa foto, Mario Díaz-Balart

Nuhu Ribadu kwuru na ndị omeiwu mba Amerịka so bịa njem nchọpụta nke bụ eziokwu maka ebubo ogbugbu ndị ụka Kraịst gunyere:

  • Mario Díaz-Balart (Rep. @MarioDB),
  • Norma Torres (Rep. @NormaJTorres ),
  • Scott Franklin (Rep. @RepFranklin),
  • Juan Ciscomani (Rep. @RepCiscomani ), na
  • Riley Moore (Rep. @RepRileyMoore).

Onye ọzọ sonyere ndị omeiwu mba Amerịka n'oge ha na-ezuta Nuhu Ribadu bụ Onye nnọchịtaanya mba Amerịka na Naịjirịa bụ Richard Mills.

Ihe omeiwu Riley Moore Kwuru

Omeiwu Riley Moore kwụọtọ n'akụkụ Bishọp Wilfred Anagbe yi efe ndị Bishọpụ nke Katọlịk dayọsis Makurdi, Benue steeti, Naịjirịa

Ebe foto si, RepRileyMoore/X

Nkọwa foto, Mgbe omeiwu Riley Moore zutere Bishọp Wilfred Anagbe nke Katọlịk dayọsis Makurdi, Benue steeti, Naịjirịa

Riley Moore bụ otu n'ime ndị omeiwu ahụ bịara njem nchọpụta ihe banyere ebubo mgbukpọ ndị okpukpere Kraịst ji akara X soshal mịdịa ya sị "abịara m Naịjirịa n'aha Chineke nakwa n'ikike ụmụamaala mba Amerịka".

Ọ gara n'ihe kwuo na "njem ya bịara na Naịjirịa mịtara ezi mkpụrụ ma sị na ya ga-ekwu ihe ndị ọzọ mere".

Ndị Omeiwu mba Amerịka sị na ha ga-agagharị na Naịjirịa ma me nnyocha dị omimi nke si n'aka nke ha