Nicki Minaj esorola kwuo na a na-akpagbu ndị nke Kraịst na Naịjirịa

Nwaafọ Trinidad a ma ama na-eti egwu bụ Nicki Minaj akwadola ebubo onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump boro na a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa.
Minaj kwupụtara nke a n'otu emume mba Amerịka haziri n'ụbọchị Tuzde 18 Nọvemba, 2025.
Nicki Minaj sịrị: "A na-emekpa ndị na-eso ụzọ Kraịst ahụ na Naịjirịa. A gbaala ọtụtụ ụlọụka ọkụ ma tisaa ezinaụlọ dị iche iche naanị n'ihi ụzọ ha si ekpe ekpere."
Ndị nkọwa okwu sịrị na ndịagha jihad nakwa otu ndị ọzọ bu ngwaọgụ na-akpasu ọgbaaghara nke metụtara obodo niile dị na Naịjirịa n'agbanyeghị agbụrụ ha maọbụ nkwenye ha.
Naanị n'ime izuụka a ka e gburu mmadụ abụọ oge a wakporo ụlọụka dị na Kwara steeti.
A tọkwaara ụmụakwụkwọ ndị nwaanyị iri abụọ na ise, bụ ndị e kwuru na ha bụ ndị Alakụba.
Popu ekwuola na a na-akpagbu ndị nke Kraịst na Naịjirịa

Ebe foto si, @Pontifex
Onyendu ụka Katọlik n'ụwa niile bụ Popu Leo XIV ekwuola okwu gbasara ọnọdụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa.
Nke a dị n'ozi Popu bipụtara n'akara ọbaozi X ya n'ụbọchị Sọnde 16 Nọvemba, 2025.
Popu Leo kwupụtara nke a oge ọ na-akpọku mmadụ niile ka ha tinye ndị nke Kraịst a na-akpagbu na mpaghara ụwa dị iche iche n'ekpere.
Dịka Popu siri kwuo, "ndị na-ezo ụzọ Kraịst na-agabiga mkpagbu na akpamoke n'akụkụ ụwa dị iche iche".
"Echere m na nke a kachasị njọ na Bangladesh, Naịjirịa, Mozambik, Sudan na mba ndị ọzọ anyị na-anụkarị gbasara mwakpo a na-eme n'obodo ha nakwa n'ụlọ okpukperechi dị iche iche," ka Popu dere.
Ọ kpọrọ oku ka onye dum kpee ekpere ka ọgbaaghara niile kwụsị, ka ndị kwere ekwe nweeike tinye aka maka ọdịmma nke onye niile.
A naghị ekpochapụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa – Lateef Fagbemi

Ebe foto si, Lateef Fagbemi/X
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa nakwa Minista ikpe ziri ezi bụ Lateef fagbemi akụsasịala okwu ahụ sịrị na e ji nwayọ na-ekpochapụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa.
Fagbemi, onye kwuru nke a n'otu mmemme a haziri n'Erin-Ile dị n'okpuru ọchịchị Oyun na Kwara steeti n'ụbọchị Satọde 15 Nọvemba 2025, gbara isi akwara na o nweghị otu okpukperechi ọbụla a na-akpagbu na Naịjirịa.
"A naghị ekpochapụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa. O nweghị okpukperechi, otu maọbụ agbụrụ ọbụla a na-akpagbu," ka Fagbemi kwuru.
Dịka o siri kwuo, o nweghị otu maọbụ okpukperechi ọbụla a na-eme naanị ha mwakpo, kama ọ sịrị na steeti dịka Zamfara na Sokoto ndị okpukperechi Alakụba jupụtara ahụtakwala mwakpo sitere n'aka ndị ojiegbe.
Fagbemi kwetara na ọ bụ eziokwu na Naịjirịa na-agabiga ọnọdụ enweghị nchekwa, mana o siri ọnwụ kwuo na Gọọmenti Etiti "na-enweta mmeri n'agha ọ na-ebu megide iyi ndụ egwu".
O kwukwara na gọọmenti na-agbasi mbọ ike iji memilaa ibugharị egbe, igbu mmadụ nakwa ụdị mpụ dị iche iche gburugburu Naịjirịa.
Trump ekwechirila ịhụta Naịjirịa ka mba 'e kwesịrị ilekwasị anya'

Ebe foto si, Getty Images
Ebubo Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump boro Naịjịrịa na a na-egbusisi ndị okpukperechi ụka Kraịstị ka bụ okwu a kpụ n'ọnụ dịka Trump ewepụtala okwu ọhụrụ ọzọ gbasara nsogbu ahụ.
N'okwu ya n'akara soshịal midia ya na Facebook, Trump kpọpụtara Naịjirịa ka mba e kwesịrị ilekwasị anya 'country of particular concern' ma kwuo na ụka Kraịstị nọ n'ihe ize ndụ na Naịjirịa dịka a na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ.
Ọ sịrị, "Ọ bụ ndị alakụba na-eyi ọha egwu bụ ndị na-egbu ndị ụka Kraịstị."
Ọ gara n'ihu kwuo n'ihe e gburu rụrụ ọnụọgụgụ mmadụ puku atọ na otu narị ma e jiri ya tụnyere puku anọ na iri asaa na isii na mbaụwa niile a bụghị ihe mmadụ kwesịrị ileghapụ anya.
Trump nyere iwu ka ndị ọrụ gọọmentị Amerịka ọ dị n'aka nyocha ihe na-eme na Naịjịrịa ma nye ya mpụtara nnyocha ha ozugbo.
"Amerịka agaghị eguzo na-ele anya ka a na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa na mba ndị ọzọ."
"Anyị dị njikere ịzọpụta ndị bụ ndị ụka Krịast na mba ụwa niile. Igbu ndị ụka Kraịst agaghị ịme ọzọ."
Ndị oyiọhaegwu agbaala ihe karịrị ụlọ ụka Kraịstị, ụlọakwụkwọ 20,000 ọkụ ma gbuo mmaadụ karịrị 50,000 kemgbe afọ 2009 - Sịnetọ Ted Cruz

Ebe foto si, Getty Images
Otu Sịnetọ a ma ama na mba Amerịka bụ onye kpalitere okwu ogbugbu ndị ụka Kraisti n'ụlọọmeiwu mba Amerịka bụ bụ Ted Cruz ekelela Onyeisiala Trump maka ikwechiri ịhụta Naịjirịa ka mba 'e kwesịrị ilekwasị anya'
N'ozi o wepụtara n'akara soshịal midia ya na X, ọ sị n'ihe fọrọ bụ ka ndị ọrụ gọọmenti Naịjirịa zara ọnụ ha n'ihe ha ma gbasara ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịstị.
"Ugbua, anyị kwesịrị ịga n'ihu ime ihe ọzọ, nke bụ ka ndị ọrụ gọọmentị Naịjirịa zaa ajụjụ maka ihe ha ma n'ihe na-eme."
Cruz kọwara na Naịjirịa abụrụla mba a na-egbu ndị ụka Kraịstị karịa.
"Kemgbe afọ 2009, otu oyiọhaegwu a kpọrọ 'Boko Haram' nakwa ndị ụka Alakụba na-eyi ọha egwu bụ 'Islamic extremists' egbuola ihe karịrị ọnụọgụgụ 50,000 ndị ụka Kraịstị."
"Ndị otu a na-eyi ọha egwu agbaala ihe karịrị ụlọụka 20,000 nakwa ụlọakwụkwọ ọkụ."
Kemgbe Onyeisiala Donald Trump na-achị mba Amerịka kwuru na ya nwereike izite ndịagha Amerịka ka ha memilaa ndị na-eyi ọha egwu ma na-egbu ndị ka Kraịst, oke mkpọtụ ejupụtala ebe niile ọkachasị n'ịntaneti
N'onyonyo nkọwa a, anyị tulere ihe bụ "Genocide" dịka otu United Nation si kọwaa ya ma tinye anya n'ihe mere na nsonso a n'etiti Naịjirịa, mba Amerịka na ndị ụka Kraịst.
Onye ntaakụkọ anyị bụ Michael Ilediagu nyochara etu okwu a si malite na nsonso a.
Etu ụfọdụ ndị mba Naịjirịa si hụta iyi egwu Trump yiri maka ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ọkachasị ndị bi na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola uche maka okwu Onyeisiala Donald Trump banyere ogbuogbu a na-eme ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.
Oge BBC News gbara ụfọdụ mmadụ ajụjụ ọnụ, ha katọrọ ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst ọkachasị na mpaghara ugwu Naịjirịa ma kwuo na ha nabatara atụmatụ mba Amerịka izite ndịagha ha iji kwụsị ogbuogbu.
Nwaada Charity Eze kwuru na ọbụghị naanị na mpaghara ugwu Naịjirịa ka ogbugbu na-eme. Ọ kọwara na oke ogbugbu a emeela ka ụfọdụ ndị mmadụ ghara ịpụta iro.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ kwadoro ka mma ka mba Amerịka bịa nyere Naịjirịa aka lụọ ọgụ megide ogbugbu a na-eme na Naịjirịa.
N'aka nke ọzọ, ụfọdụ kwuru na atụmatụ izite ndịagha Amerịka na Naịjirịa nwereike ibute nsogbu nke nwereike imetụta nchekwa, aụmahịa nakwa ọnọdụ akụnaụba Naịjirịa. Ha gara n'ihu kpọọ oku ka Onyeisiala Trump na gọọmenti nwee mkparịtaụka iji chepụta usoro dị mma ha ga-eji zite ndịagha ha ma iji hụ na e nweghị nsogbu ga-esi na ya pụta.
Tinubu ekuola na ọ ga-ezute Trump maka ebubo igbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images na Bola Ahmed Tinubu/x
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ga-ezute maka ebubo e boro na a na-egbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.
Daniel Bwala bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Onyeisiala Naịjirịa mere ka a mata nke a n'akara ọbaozi X ma kwuo na nzukọ a ga-adị na mgbe na-adịghị anya.
Ọ kọwara na ndị isiala abụọ ahụ na-ebuso ndị na-eyi ọha egwu agha, ma kọwaa na Onyeisiala Donald Trump adịla na mbụ nye aka ka e resị mba Naịjirịa ngwaagha e jiri buso ndị na-eyi ọha egwu agha.
Bwala kọwara na nghọtahie a na-enwe banyere ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa, ọkachasị nke na-ekwu na ọ bụ ndị okpukperechi Kraịst ka a na-egbu so n'ihe a ga-akpa maka ya.

Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu / X
Ọ kwuru na Trump na Tinubu ga-enwe mkparịtaụka ahụ n'Abuja maọbụ na Washington.
Cheta na nke a na-eme dịka Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump yiri Gọọmenti Naịjirịa egwu ma kwuo na Amerịka ga-awakpo Naịjirịa ma gbuo ndị na-eyi ọha egwu.
Mmaja a bụ nke sotere ihe Donald Trump kwuru sị na ndị Alakụba na-eyi ọha egwu na-egbu ndị okpukperechi Kraịst na Naịjirịa.
Amerịka ga-awakpo Naịjirịa maka 'igbu ndị Kraịst' -Trump

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump yiri egwu izite ndịagha Amerịka na Naịjirịa ma ọ bụrụ na Gọọmenti Naịjirịa akwụsịghị ihe ọ kpọrọ ogbugbu ndị 'Alakụba' na-egbu 'Ndị Kraịst'.
Trump kwuru n'akara Truth Social na Satọde abalị mbu nke ọnwa Nọvemba na Amerịka "nwereike ịbanye na mba ahụ na-eme ihere ugbua, 'ebe na-agba ọkụ,' iji kpochapụ ndị omekome Alakụba kpamkpam bụ ndị na-eme ihe ike ndị a jọgburu onwe ha."
Ọ gara n'ihu kwuo na ya ga-enye Ngalaba Agha mba Amerịka iwu ka ha dịrị njikere maka ihe nwereike ime.
"Ọ bụrụ na anyị wakpoo, ọ ga-adị ngwa ngwa, dị njọ, ma dịkwa ụtọ, dịka ndị omekome na-eyi ọha egwu si wakpoo ndị nke Kraịst anyị hụrụ n'anya."
Ọ dọrọ Gọọmenti Naịjirịa aka na ntị ma gwakwa ha ka ha mee ngwa ngwa.
Nke a na-abịa ka ọ gachara otu ụbọchị Onyeisiala Amerịka kwupụtara Naịjirịa dịka "mba ọnọdụ ya pụrụiche" maka ogbugbu ndị na-eso ụzọ Kraịst, na-akọwa ọnọdụ ahụ dịka "igbu mmadụ n'igwe."
Cheta na Gọọmenti Naịjirịa katọrọ ebubo Onyeisiala mba Amerịka ma kwuo na ọ bughị etu ọnọdụ siri dị na Naịjirịa.
Nzaghachi Gọọmenti Naịjirịa nyere Trump
Gọọmenti Naịjirịa akatọọla ebubo Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump boro na a na-egbu ndị okpukperechi Kraịst na Naịjirịa.
Ozi nzaghachi Gọọmenti Naịjirịa wepụtara nke minista na-ahụ maka mba ofesi bụ Yusuf Tuggar binyere aka, kwuru na ebubo ahụ Onyeisiala Trump boro abughị etu ọnọdụ siri dị na Naịjirịa..
N'okwu ya, Tuggar sịrị: "Anyị dị njikere ibuso ndị otu ọbụla na-eyi ọha egwu nke na-akpata nkewapụ obodo na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka nakwa 'sahel' agha".
Ọ gara n'ihu kwuo na Gọọmenti Onyeisiala Tinubu dị njikere ma kwụsie ike ịkwalite udo nakwa ezi mmekọ n'etiti Naịjirịa na mba ndị ọzọ iji mee ka ọchịchị onye kwuo uche ya kwụrụ chịm.
Cheta n'ụbọchị Fraịde 31 Ọktoba 2025, Onyeisiala Trump kwuru na gọọmenti ya agaghị ewepụ anya maọbụ gba nkịtị ka a na-egbu ndị okpukpere Kraịst na Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ.
A na-egbu ndị okpukperechi Kraịst na Naịjirịa - Trump
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kwuru na a na-egbu ndị okpukperechi Kraịst na Naịjirịa.
Trump kwuru na igwe mmadụ si na puku kwụrụ puku ka ndị alakụba na-eyi ọha egwu gburu ma kwuo na ya ga-etinye mba Naịjirịa dịka "mba e kwesịrị ilekwasị anya".
N'okwu ya "mgbe ọbụla e gburu ndị ụka Kraịst maọbụ otu yiri ha dịka e si egbu ha na Naịjirịa, anyị ga-emerịrị ihe".
"Ana m agwa Omeiwu Riley Moore, Onyeisioche Tom Cole na ndị ọzọ ka ha tinye anya chọpụta ihe na-eme ma gwa m ihe ha chọpụtara ngwangwa".
"Mba Amerịka agaghị agba nkịtị ihe dị etua a na-eme na Naịjirịa maọbụ n'ebe ndị ọzọ n'ụwa".
Anyị dị njikere ichekwa ndị na-ekpere Kraịst n'ụwa niile".
N'oge ahụ ka Trump kwuru na ọ dị njọ na e gbuola mmadụ 4,476 ndị na-ekpere Kraịst n'ụwa dum, mana mmadụ ruru 3,100 n'ime ndị ahụ bụ na Naịjirịa ka e gburu ha.
Gịnị bụ 'genocide'?
Kamgbe Onyeisiala Donald Trump nke mba Amerịka kwuru na a na-egburu ndị ụka Kraịstị na Naịjirịa nke a kpọrọ 'Christian Genocide' ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ sị gịnị ka okwu ahụ pụtara?.
'Genocide' na nkọwa otu jịkọrọ mba ụwa bụ United Nations n'afọ 1946 hụtara ya dịka ihe megidere iwu mba ụwa.
Bido n'oge ahụ ruo n'afọ 2022 mba ruru 153 nabatara iwu ahụ.
Ọzọ bụ na ụlọikpe mba ụwa bụ 'International Court of Justice (ICJ)' kwuru na 'Genocide' bụ iwu dịara mba niile ma ha ekwetere ma ha ekwetaghị.
Ọgbakọ United Nation mere n'afọ 1948 maka "Genocide" kọwara ihe niile banyere ya.
Raphael Lemkin bu ọkaiwu onye mba Polandi, ọ bụ ya kewapụtara okwu a 'genocide', ọ kọwara ya dịka ogbugbu maọbụ mkpochapụ ndị si otu agbụrụ maọbụ okpukperechi, obodo maọbụ mba dịka ihe a ma ụma eme n'ụdị nwereike ịmerụha ahụ maọbụ itinye ndị ahụ n'ihe izendụ maọbụ ga-ememina ha.
Gịnị ka e ji ama ebe e nwere 'genocide'?
Nkọwa United Nation (UN) nyere banyere 'Genocide' gunyere ọtụtụ ihe.
N'ime ya bụ ị maụma chọọ igbukpọ maọbụ igbu ọtụtụ ndị mmadụ si otu agbụrụ, otu obodo, maọbụ otu okpuperechi.
Ndị ọzọ bụ:
- Igbu ndị nọ n'otu otu.
- Ime ka ha nwe mmeru ahụ nke anụ ahụ maọbụ nke ụbụrụ.
- Ime ihe ga-emebi ndụ ha n'ibe n'ibe maọbụ ime ya n'otu mgbe.
- I tinye ọnọdụ ga-akwụsị ha ịmụ ụmụaka.
- I jị ike mee ka ụmụ ha si n'agbụrụ ha gbanwe ma banye n'agbụrụ ọzọ.









