Ụlọikpe akwadola ikpe ọnwụ a mara Maryam Sanda

Maryam Sanda yi uwe mmemme ma fụrụ ịchafụ mmemme, ma nyara ihe olu ọlaedo.

Ebe foto si, Onanuga/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 10

Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa akwadola ikpe ọnwụ a mara Maryam Sanda maka igbu di ya bụ Bilyamin Bello n'Abuja na 2017.

Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Bola Tinubu kwuputara na ọ gbagharala ọtụtụ mmadụ gụnyere Maryam Sanda a mara ikpe dị iche iche ma tụọ mkpọrọ na nso nso a.

Mana mgbaghara ahụ Onyeisiala Tinubu nye buru Sanda na ndi ọzọ ahụ, wetara ọgbaaghara nke ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ.

Nke a mere ka gọọmeti Onyeisiala Tinubu mee nnyocha ma kagbuo mgbaaghara ahụ o nyere ụfọdụ ndị ahụ.

Mana Ọkaikpe Moore Adumein nke ụlọikpe kachasị dị n'Abuja, kwadoro ikpe ọnwụ ahụ a mara Sanda ma kwuo na Onyeisiala Tinubu ekwesighị inye onye a mara ikpe ọnwụ maka igbu mmadụ mgbaaghara ọkachasị dịka ikpe ahụ ka nọ n'ụlọikpe mkpegharị.

Cheta na ụlọikpe ukwu dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Mọnde 27 Jenụwarị, 2020 maa Maryam Sanda ikpe ọnwụ.

Tinubu akagbuola mgbaghara o nyere Maryam Sanda na ụfọdụ ndi ọzọ a tụburu mkpọrọ

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu yi uwe n'acha anụnụ anụnụ ma nọọrọ na ọche nwere akwa uhie uhie nakwa aja aja. Ọkọlọtọ Naịjirịa nọ ya n'ihu dịka ọ na amụrị ọnụ ọchi. O yi okpu n'acha anụnụ anụnụ ma yirikwa igobe anya.

Ebe foto si, @officialBAT

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu agbaghaala mgbaghara o nyere Maryam Sanda, onye atụnyere na mkpọrọ maka igbu di ya, Bilayaminu Bello n'Abuja.

N'akwụkwọ ozi gọọmentị nke onye ndụmọdụ pụrụiche nke onyeisiala n'ihe gbasara ozi na atụmatụ, Bayo Onanuga, wepụtara na Wenezdee, a belatara ikpe ya site na ọnwụ gaa na mkpọrọ nke afọ iri na abụọ.

Cheta na mgbaghara Tinubu nye buru Sanda na ndi ọzọ bụ nke wetara ọgbaghara nke ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ ommume Tinubu mana gọọmenti kwuru na a ga-enyocha aha ndị enyere mgbaghara.

Ka ọ dị ugbua, Onanuga kọwara na iwepụ aha Sanda site na ọnwụ gaa na mkpọrọ afọ iri na abụọ bụ maka obi ọmịiko

Chetakwa na Sanda anọla afọ isii na ọnwa asatọ n'ụlọmkpọrọ nọ na Suleja.

Lee mmadụ iri na atọ Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ọhụrụ

foto Herbert Macaulay, ọchịagha Mamman Vatsa, Ken Saro-Wiwa na Farouk Lawan

Ebe foto si, Nigeria Presidency/Noo Saro-Wiwa

Nkọwa foto, Herbert Macaulay, General Mamman Vatsa, Ken Saro-Wiwa na Farouk Lawan so na ọtụtụ ndị Onyeisala Tinubu nyere mgbahara ma ọbụ wetuo oge mkpọrọ ha

N'aka nke ọzọ, akwụkwọ ozi Onanuga wepụtara gosiri aha ndị ọzọ Tinubu gbaghara.

Ọnụọgụgụ ndị agbaghara nke mbu gọọmenti wepụtara ruru otu narị, iri asaa na ise mana ugbua aha ndị ahụ agbadaala dịka ewpụrụ ụfọdụ aha.

Ndị enyere mgbahara ugbua gunyere:

1. Mrs Anastasia Daniel Nwaobia

2. Bar. Hussaini Alhaji Umar

3. Ayinla Saadu Alanamu

4. Hon. Farouk M. Lawan

5. Herbert Macaulay

6. Major General Mamman Jiya Vatsa

7. Ken Saro Wiwa

8. Saturday Dobee

9. Nordu Eawo

10. Daniel Gbooko

11. Paul Levera

12. Felix Nuale

13. Baribor Bera

14. Barinem Kiobel

15. John Kpuine

Lee aha ndị ewepụrụ n'ikpe ọnwụ gaa na mkpọrọ ndụ

1. Emmanuel Baba

2. Abubakar Usman

3. Khalifa Umar

4. Mohammed Umar

Lee aha ndị enyere ebere

1. Oroka Michael Chibueze

2. Adesanya Olufemi Paul

3. Daniel Bodunwa

4. Hamza Abubakar

5. Buhari Sani

6. Mohammed Musa

7. Muharazu Abubakar

8. Ibrahim Yusuf

9. Saad Ahmed Madaki

10. Ex-Corporal Michael Bawa

11. Richard Ayuba

12. Adam Abubakar

13. Emmanuel Yusuf

14. Chinedu Stanley

15. Johnny Ntheru Udor

Aha ndị ebelatara oge mkpọrọ ha

  • Yusuf Owolabi - mkpọrọ ndụ gaa na mkpọrọ afọ iri na ise
  • Ifeanyi Eze - mkpọrọ ndụ gaa na mkpọrọ afọ iri na ise
  • Malam Ibrahim Sulaiman - mkpọrọ ndụ gaa na mkpọrọ afọ iri na ise
  • Patrick Mensah - mkpọrọ afọ iri na asaa gaa afọ iri na atọ
  • Obi Edwin Chukwu - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Tunde Balogun - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Lima Pereira Erick Diego - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Uchegbu Emeka Michael - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Salawu Adebayo Samsudeen - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Napolo Osariemen - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Odeyemi Omolara - mkpọrọ afọ iri abụọ na ise gaa afọ iri na asatọ
  • Dias Santos Marela Christian- mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri na abụọ
  • Alhaji Ibrahim Hameed- mkpọrọ afọ asaa gaa afọ ise
  • Isaac Joshua - mkpọrọ afọ iri gaa afọ asaa
  • Aishat Kehinde - mkpọrọ afọ ise gaa afọ anọ
  • Helen Solomon- mkpọrọ afọ ise gaa afọ atọ
  • Okoye Tochukwu - mkpọrọ afọ isii gaa afọ atọ
  • Ugwueze Paul - mkpọrọ afọ isii gaa afọ atọ
  • Mustapha Ahmed - mkpọrọ afọ asaa gaa afọ ise
  • Abubakar Mamman - mkpọrọ afọ iri gaa afọ asaa
  • Muhammed Bello Musa - mkpọrọ afọ iri gaa afọ asaa
  • Nnamdi Anene- mkpọrọ ndụ gaa mkpọrọ afọ iri na abụọ
  • Alhaji Abubakar Tanko- mkpọrọ afọ iri na atọ gaa afọ iri na abụọ
  • Innocent Brown Idiong- mkpọrọ afọ iri gaa afọ isii
  • Iniobong Imaeyen Nuikidem - mkpọrọ afọ asaa gaa afọ ise
  • Ada Audu - mkpọrọ afọ asaa gaa afọ anọ
  • Buka Adamu - mkpọrọ afọ iri na abụọ gaa afọ itolu
  • Chukwukelu Sunday Calistus- mkpọrọ ndụ gaa afọ iri abụọ
  • Markus Yusuf - mkpọrọ afọ iri na atọ gaa afọ asatọ
  • Samson Ajayi - mkpọrọ afọ iri na ise gaa afọ iri
  • Rakiya Beida - mkpọrọ afọ asaa gaa afọ ise
  • Umanah Ekaette Umanah - mkpọrọ afọ iri gaa afọ asaa
  • Utom Obong Thompson Udoaka - mkpọrọ afọ asaa gaa afọ isii
  • Jude Saka Ebaragha - mkpọrọ iri na abụọ gaa afọ iri asatọ
  • Frank InsortAbaka - mkpọrọ afọ iri na abụọ gaa afọ asatọ
  • Sluna Alolo- mkpọrọ afọ iri na abụọ gaa afọ asatọ
  • David Akinseye mkpọrọ afọ iri na abụọ gaa afọ asatọ
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Baya Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha

Ebe foto si, Bayo Onanuga

Nkọwa foto, Aha ndị Onyeisiala Tinubu nyere mgbaghara ma belata oge mkpọrọ ha
Maryam Sanda a mara ikpe ọnwụ maka igbu di ya so na ndị Onyeisiala Tinubu gbaghaara
Maryam Sanda yi uwe mmemme ma fụrụ ịchafụ mmemme, ma nyara ihe olu ọlaedo.

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Nkọwa foto, Maryam Sanda yi uwe mmemme ma fụrụ ịchafụ mmemme, ma nyara ihe olu ọlaedo.

Ụlọọrụ Onyeisiala Bola Tinubu ewepụtala aha mmadụ niile ọ gbaghara mpụ na nrụrụaka dị iche iche ha mere.

Nke a dị n'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga wepụtara na mgbede Satọde 11 Ọktoba, 2025.

Otu n'ime aha ndị Onyeisiala Tinubu gbaghaara bụ Maryam Sanda, nwaanyị a mara ikpe ọnwụ n'afọ 2020 maka igbu di ya bụ Bilyaminu Bello.

Bayo Onanuga kwuru na ihe mere e jiri gbaghara nwada a bụ maka na ụmụnne ya rịọrọ arịrịọ ka a gbaghara ya "maka na ọ na-elekọtara ụmụ ya abụọ anya ọfụma ma gosikwa mwute na ezi agwa n'ime ụlọmkpọrọ."

Ụlọikpe ikpe tụrụ ya nga n'ụlọmkpọrọ Suleja ebe ọ nọrọla afọ isii na ọnwa asatọ dịka akwụkwọ ozi ahụ si kwuo.

N'afọ 2017,esemokwu dapụtara n'etiti Maryam na di ya bụ Bilyaminu, bụ nke butere ọnwụ ya, n'ihi nke a Ọkaikpe Yusuf Halilu nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja mara ikpe ọnwụ site n'ịkwụ ụdọ n'ọnwa Jenụwarị 27, afọ 2020 dịka a chọpụtara na aka ya dị n'ọnwụ di ya.

Lee aha mmadụ niile a gbaghaara

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ihe Onyeisiala Tinubu ji gbaghara Herbert Macaulay, Mamman Vatsa, Farouk Lawan na ndị ọzọ?

foto Herbert Macaulay, ọchịagha Mamman Vatsa, Ken Saro-Wiwa na Farouk Lawan

Ebe foto si, Nigeria Presidency/Noo Saro-Wiwa

Nkọwa foto, Herbert Macaulay, General Mamman Vatsa, Ken Saro-Wiwa na Farouk Lawan so na ọtụtụ ndị Onyeisala Tinubu nyere mgbahara ma ọbụ wetuo oge mkpọrọ ha

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu nyere ọtụtụ ndị amaala mere ihe ọjọọ maọbụ mpụ n'oge gara aga mgbaghara n'ụbọchị Tọzde.

Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị nwụrụ anwụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ katọrọ omume a Tinubu mere karịsịa ndị ntoroọbịa.

Ụfọdụ na-ajụ ihe mere Herbert Macaulay bụ otụ n'ime ndị hiwere Naịjirịa ji nweta mgbaghara n'agbanyeghị na ọ nwụrụ ọtụtụ afọ gara aga.

Ndị ọzọ na-ajụ kwa sị kedụ ihe mere Farouk Lawan onye ụlọikpe tinyere n'ụlọmkpọrọ maka ịnara ngarị si nweta mgbaghara?

Ha kwuru na nke a bụ ugwo maka omume ọjọọ.

Onye ọzọ bụ Nweke Francis Chibueze, onye a tụrụ mkpọrọ ọka maka ibu ọgwụike.

Nwogu Peters sokwa n'ọnụọgụgụ. Ọ nọọla n'ụlọmkpọrọ afọ iri abụọ n'ime afọ iri asaa e nyere ya maka igwu chandum.

Akụkọ kwuru na Bola Tinubu nyere ha mgbaghara maka na "ha gosiri nchegharị zuruoke".

Mana ndị mmadụ na-ajụ si kedụ omume ọjọọ ụfọdụ ndị a ma ama aha ha nọ na ndekọ ahụ mere?

Herbert Macaulay

Herbert Macaulay

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Aha ya bụ Olayinka Herbert Samuel Heelas Badmus Macaulay. A mụrụ ya n'ọnwa Nọvemba, afọ 1864.

O so na ndị nyere Gọọmenti Briten nsogbu ka Naịjịrịa nwere onwe ya.

Ọ bụ ihu ya ka e gosiri n'ego otu naịra.

Mana ekwere m, agaghị m ekwe ha na gọọmenti ndị Briten bụ ihe tinyere ya na nsogbu ọtụtụ oge nke mere ha ji tinye ya na mkpọrọ.

N'afọ 1913, ha boro ya ebubo na o riri ego ụlọ ndị mmadụ ọ na-elekọta mgbe ahụ.

A kpụpụrụ ya ụlọikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ ise.

Herbert Macaulay nwụrụ n'ọnwa Mee, afọ 1946 ka ọ gbachara afọ iri asatọ na otu.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Mamman Vatsa

Mamman Vatsa yi efe ndịagha

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Nkọwa foto, Mamman Vatsa

Mamman Jiya Vatsa bụ ọchịagha ndịagha. Ọ rụrụ ọrụ dịka Minista isi obodo Naịjirịa.

N'ọnwa Disemba, afọ 1985 Gọọmentị Naịjịrịa boro ya na ndịagha itoolu ọzọ ebubo na ha chọrọ iweghara gọọmentị n'ike.

A kpụpụrụ ha n'ụlọikpe ndịagha ma chọpụta na aka ha dị n'ebubo e boro ha.

N'ọnwa Maachị, afọ 1986, a gbagburu ya.

Vatsa so na ndịagha Naịjirịa lụrụ agha Naịjirịa na Bịafra.

Ọ bụkwa onye ọdeakwụkwọ nke mere ka a kpọọ ọtu ebe n'Abuja ndị odeakwụkwọ na agbakọ "Mamman Vatsa Writers Village".

Farouk Lawan

Farouk Lawan

Ebe foto si, Farouk Lawan Mohammed/Facebook

Nkọwa foto, Farouk Lawan

Farouk Lawan Mohammed bụ onye omeiwu n'ụlọ nnọchiteanya Naịjirịa ugboro anọ site n'afọ 1999 ruo 2015.

Ọ nọchitere ndị Bagwai/Shanono na Kano steeti.

Ụlọikpe tụnyere ya n'ụlọmkpọrọ afọ asaa maka iri ngarị na afọ 2021.

Ikpe ya malitere n'afọ 2012 mgbe ọ bụ onyeisioche kọmitii nyochara mpụ ego enyemaka mmanụ a kpọrọ "fuel subsidy scandal".

Ụlọikpe kwuru na Lawan nakọtara $500,000 dịka ngarị n'aka Femi Otedola maka na Otedola achọghị ka ọ kpọọ aha ụlọọrụ ya dịka ndị so rie ego gọọmenti nyere maka mbelata ọnụahịa mmanụ.

Ihe oyoonyo gosiri ebe Otedola nyere ya ego ahụ dịka o tinyere ụfọdụ ego ahụ n'okpu ya.

A kpụpụrụ ya n'ụlọmkpọrọ n'ọnwa Ọktọba 2024 dịka ọ gachara mkpọrọ afọ ole e nyere ya.

Lawan wepụtara ozi n'ụbọchị Fraịde 10 Ọktoba 2025 iji keele Onyeisiala Tinubu maka mgbahara o nyere ya.

Ndị 'Ogoni Nine'

Ken Saro-Wiwa nọ ọdụ na ụgbọmmiri ma kpụrụ osisi ọkụ na ọnụ ya.

Ebe foto si, Noo Saro-Wiwa

Nkọwa foto, Ken Saro-Wiwa bụ onye ndụ ndị 'Ogoni Nine' nke Gọọmenti Naịjịra gburu site na nkwụgbu n'afọ 1995

Ogoni Nine bụ mmadụ itoolu na-ahụ maka ọdịmma gburugburu ebe obibi si na mpaghara Ogoni na Riva steeti ndị gbara ụlọọrụ Royal Dutch Shell Oil Corporation dị na mpaghara Niger Delta ụkwụ maka mmebi ha na-emebi ebe obibi ndị bi na Niger Delta.

Aha ha bụ

  • Ken Saro-Wiwa - onye ndụ otu Movement for the Survival of the Ogoni People (MOSOP),
  • Saturday Dobee
  • Nordu Eawo
  • Daniel Gbooko
  • Paul Levera
  • Felix Nuate
  • Baribor Bera
  • Barinem Kiobel
  • John Kpuine

Gọọmenti Naịjirịa boro ha ebubo na aka ha dị n'ogbugbu e gburu mmadụ anọ ndị amaala Ogoni.

N'ụbọchị Nọvemba 10, 1995 gọọmenti gburu ha site na nkwụgbu n'ụlọmkpọrọ dị na Pọtakọt.

Gịnị ka mgbaghara a pụtara?

Mpaghara 175 nke iwu Naịjirịa nyere Onyeisiala ikike ịgbaghara ndị mmadụ maka ihe ọjọọ ọbụla onye ahụ mere.

Ikike onyeisiala nwere n'iwu a bụ:

  • Inye onye ọbụla ụlọikpe kpere ikpe mgbaghara n'ihe ọbụla onye ahụ mere.
  • Inye onye ọbụla ezumike na ntaramaahụhụ onye ahụ kwesịrị ịta maka ihe ọjọọ o mere.
  • Inye ntaramaahụhụ dị mfe maka ihe ọjọọ onye ahụ mere.

Ya bụrụ na ụlọikpe maa mmadụ ikpe maka mpụ, onye ahụ agaghị enwe ụfọdụ ikike dịka iwere ọrụ na ụlọọrụ ọha oge ole na ole ihe ruru afọ iri mana onye ọbụla onyeisiala nyere mgbaghara, onye ahụ ga-enweta ikike ya niile.

Nke a pụtara na Farouk Lawan na ndị ọzọ e nyere mgbaghara nwere ike ịzọ ọkwa ọchịchị.

Otu onye na-akpọ oku maka ezi ọchịchị bụ Omoyele Sowore na ọtụtụ ndị ọzọ katọrọ omume a Tinubu mere.