Onyeisiala Tinubu eduola Joash Amupitan n'iyi ọrụ dịka Onyeisi ọhụrụ nke ụlọọrụ INEC

Ọkammụta Amupitan yi uwe ndị ọkammụta na okpu ha.

Ebe foto si, Joseph Ayo Babalola University

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Onyeisiala Bola Tinubu eduola Ọkammụta Joash Amupitan n'iyi ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC.

Nke a na-abịa n'ime otu izuụka ndị ụlọomeiwu Sịnetị kwadoro nhọpụta ya dịka ha nyochara ma gbaa ya ajụjụ ọnụ na 16 Ọktoba, 2025.

N'emume idu ya n'iyi ọrụ e mere n'obi ọchịchị Aso Rock dị n'Abuja, Onyeisiala Tinubu gwara ya ka o chekwaa ukwu dịịrị ntuliaka na usoro e ji eme ya.

"Dịka a họpụtara gị n'ọrụ ilekọta usoro ntuliaka, e nwere m ntụkwasị obi na ị ga-echekwa ugwu ntuliaka na Naịjirịa.

"Ọchịchị onye kwuo uche anyị anọteela anya. N'ime afọ iri abụọ na ise anyị ewusiela ngalaba ntuliaka anyị ike site na nwogharịa. Ihe anyị ga-eme ugbua bụ ịga n'ihu na-ewulite ma na-emezi ụfọdụ ihe ndị na-adịchaghị mma."

Mgbe ndị omeiwu Sịnetị kwadoro nhọpụta Joash Amupitan

Akpabio onyeisi ụlọomeiwu nọ n'oche yiri uwe anụnụ anụnụ, ọzọ bụ Ọkammụta Amupitan yi uwe ndị ọkammụta na okpu ha.

Ebe foto si, Nigeria Senate/Joseph Ayo Babalola University

Ndị omeiwu Sịnetị nke Naịjirịa ekwetela ka Ọkammụta Joash Amupitan bụrụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC).

Ha tinyere aka ma kwadoo Amupitan bụ ọkammụta na ngalaba iwu dịka ha gbachara ya ajụjụọnụ n'ụlọomeiwu n'ụbọchị Tọzde 16 Ọktoba, 2025.

Nke a na-abịa dịka ha gbachara ya ajụjụọnụ n'oge ruru awa abụọ banyere etu ọ ga-esi wulite usoro ntuliaka na Naịjirịa ma tinye mgbanwe dị mma n'ụlọọrụ INEC.

Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara Amupitan ebe ndịisi ọchịchị na Naịjirịa kwadoro nhọpụta ya tupu e ziga aha ya n'ụlọomeiwu.

Amupitan ga-abụ onyeisi ụlọọrụ INEC nke ugboro isii dịka ọ ga-anọchi anya Mahmood Yakubu bụ onye oge ya n'ọkwa ahụ gwụrụla.

Amupitan kwuru tụrụ arọ ka a gbanwee usoro iwu ntuliaka ma kwuo na na Naịjirịa kwesịrị ka ọ bụrụ ebe onye e meriri na ntuliaka ga-anabata mmeri ahụ ma kelee onye meriri ya.

O kwuru na ọ ga-eleba anya n'iwu na-achị ntuliaka ma mee ka ntuliaka na Naịjirịa bụrụ nke ga-akwụwa aka ọtọ.

O kwuru na oge ọ na-ewe iji mee ntuliaka na Naịjirịa ma kpọpụta mpụtara ya ga-abụ ihe a ga-emezi ọfụma.

Onyeisiala Tinubu zigara aha Amupitan n'ụlọọmeiwu

Tinubu ezigaala aha Amupitan n'ụlọọmeiwu ka ha kwado ya dịka Onyeisioche INEC

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu edegarala ụlọọmeiwu akwụkwọ ka ha kwado Ọkankụzi Joash Amupitan dịka Onyeisioche ụlọọrụ INEC ọhụrụ.

Onye ndụ ụlọomeiwu sịnetị bụ Godswill Akpabio kwupụtara nke a mgbe ha na-enwe nzukọ n'ụbọchị Tuzde 14 Ọktoba 2025.

Akpabio nyere iwu ka kọmitii ga-eme nnyocha leba ya anya.

Cheta na Onyeisiala Tinubu họpụtara Amupitan n'ụbọchị Tọzde 9 Ọktoba 2025 ka ọ nọchie anya Mahmood Yakubu.

Nke a bụ maka na oge Mahmood Yakubu kụụrụ ọnụ dịka Onyeisioche INEC.

Mgbe ndịisi ọchịchị Naịjirịa họpụtara Joash Amupitan

Joash Ojo Amupitan

Ebe foto si, Bayo Onanuga, INEC

Otu kansụl na-achị Naịjirịa anabatala nhọpụta Ọkankụzi Joash Ojo Amupitan dịka onyeisioche ọhụrụ nke ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC).

Nke a dị n'ozi onye ndụmọdụ pụrụiche na mgbasaozi nye Onyeisiala Naịjirịa bụ Bayo Onanuga wepụtara.

Onyeisiala Tinubu wepụtara aha Amupitan dịka onye ọ chọrọ iji dochie anya Ọkankụzi Mahmood Yakubu, bụ onye oge ọrụ ya kụụrụ ọnụ.

Cheta na Mahmood Yakubu rụrụ ọrụ dịka Onyeisioche INEC malite n'afọ 2015 ruo n'afọ 2025.

Tinubu gwara otu kansụl na-achị Naịjirịa na Amupitan bụ nwaafọ Kogi steeti mbụ a na-ahọpụta n'ọkwa dịka Onyeisioche INEC, ma kwuo na nke ahụ abụghị ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ndị otu kansụl ahụ ji otu olu kwado nhọpụta Amupitan, dịka gọvanọ Kogi steeti bụ Ahmed Ododo kọwara Amupitan dịka nwoke kwesịrị ntụkwasịobi.

N'ịgbaso iwu Naịjirịa, Onyeisiala Tinubu ga-ezigara ụlọomeiwu aha Amupitan maka ime ya nnyocha.

Onye bụ Joash Ojo Amupitan a họpụtara dịka Onyeisioche INEC?

Joash Ojo Amupitan a họpụtara dịka Onyeisioche INEC

Ebe foto si, Bayo Onanuga

  • A mụrụ Ọkankụzi Joash Ojo Amupitan n'ụbọchị 25 Eprel, 1967.
  • Ọ bụ nwaafọ Ayetoro Gbede dị n'okpuru ọchịchị Ijumu na Kogi steeti.
  • Oge Amupitan gụchara akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị, ọ banyere n'ụlọakwụkwọ nkanụzụ Kwara State Polytechnic malite n'afọ 1982 ruo 1984.
  • Ọ gakwara mahadum University of Jos malite n'afọ 1984 ruo 1987, dịka a nabatara ya n'oche ndị Ọkaiwu n'afọ 1988.
  • Amupitan fere ala nna ya site n'afọ 1988 ruo 1989 n'ụlọọrụ mgbasaozi Bauchi State Publishing Corporation.
  • O nwetara nzere Masters n'ọmụmụ okwu iwu bụ LLM n'afọ 1993 ma nwetakwa nzere Ọkammụta n'okwu iwu bụ PhD n'afọ 2007 site na mahadum University of Jos.
  • Ọkankụzi Amupitan nwetara ọrụ na mahadum University of Jos, ma mechaa bụrụ Ọkankụzi na ngalaba iwu na mahadum ahụ.
  • Mpaghara iwu ndị ọ na-elebara anya gụnyere Company Law, Law of Evidence, Corporate Governance nakwa Privatisation Law.
  • Amupitan ruru n'ogogo Nnukwu Ọkaiwu Naịjirịa bụ Senior Advocate of Nigeria (SAN) n'ọnwa Septemba, afọ 2014.
  • Ugbua, ọ na-arụ ọrụ dịka Osote Vice Chancellor na-ahụ maka usoro ọrụ na mahadum University of Jos.
  • Joash Ojo Amupitan alụọla nwunye ma mụtakwa ụmụ anọ.